Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Abụ Ọma 150

150
Abụ Ọma 150
Ka ihe niile too Onyenwe anyị
1Toonu Onyenwe anyị.
Toonu Chineke nʼime ụlọnsọ ya.
Toonu ya, na mbara igwe nke ike ya.
2Toonu ya, nʼihi ọrụ niile ọ rụrụ site nʼike ya.
Toonu ya, nʼihi ịdị ukwuu ya nke kachasị ịdị ukwuu niile.
3Werenụ opi ike too ya,
werekwanụ ụbọ akwara na une too ya,
4jirinụ ihe iti egwu na ite egwu too ya,
jirikwanụ ụbọ akwara dị iche iche na ọja too ya,
5werenụ ogene too ya,
werekwanụ ogene na-ada oke ụda too ya.
6Ka ihe niile na-eku ume too Onyenwe anyị.
Toonu Onyenwe anyị.#150:6 Mgbe mmadụ na-eti, Toonu Onyenwe anyị, ya na onye na-eti Haleluya, na-ekwu otu ihe ahụ.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

Abụ Ọma 150: BIU

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye