Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Abụ Ọma 149

149
Abụ Ọma 149
Abụ otuto
1Toonu Onyenwe anyị!
Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ ọhụrụ.
Bụọnụ abụ ito ya nʼetiti ndị nsọ ya.
2Ka Izrel ṅụrịa ọṅụ nʼime onye kere ha;
ka ndị bi na Zayọn nwee obi ụtọ nʼime Eze#149:2 Nkp 8:23; Zek 9:9; Mat 21:5 ha.
3Ka ha jiri ite egwu too aha ya
ka ha jiri ọyọ na ụbọ akwara kpọọrọ ya egwu.
4Nʼihi na ihe banyere ndị ya na-atọ Onyenwe anyị ụtọ.
Ọ na-eji nzọpụta#149:4 Abụ 132:16; Aịz 61:10 kpukwasị ndị dị umeala nʼobi nʼisi dịka okpueze.
5Ka ndị nsọ ṅụrịa ọṅụ nʼime nsọpụrụ a,
bụkwaa abụ nʼihi ọṅụ nʼelu ihe ndina ha.
6Ka otuto Chineke dịrị nʼọnụ ha,
ka mma agha ihu abụọ#149:6 Hib 4:12; Mkp 1:16 dịrịkwa nʼaka ha,
7iji bọọrọ mba niile ọbọ
taakwa ndị niile dị iche iche ahụhụ,
8iji mkpọrọ igwe kee ndị eze ha
na ndị ha a na-asọpụrụ agbụ igwe,
9imezu ihe ahụ e kpebiri, depụtakwa megide ha.
Nke a bụ nsọpụrụ dịrị ndị nsọ ya.
Toonu Onyenwe anyị.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

Abụ Ọma 149: BIU

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye