1
Ọnụọgụgụ 21:8
Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a
Mgbe ahụ, ONYENWE ANYị gwara Mosis okwu sị ya, “Kpụọ otu agwọ yiri agwọ ndị a. Kwụba ya nʼọnụ ogologo osisi nke ị ga-amanye nʼala ebe mmadụ niile ga-ahụ ya anya. Onye ọbụla agwọ ọjọọ a tara ga-adị ndụ ma ọ bụrụ na ọ ga-ewelite anya ya elu lekwasị agwọ ahụ ị kwụbara nʼelu osisi ahụ.”
Lee anya n'etiti ihe abụọ
Nyochaa Ọnụọgụgụ 21:8
2
Ọnụọgụgụ 21:9
Ya mere, Mosis ji bronz kpụta agwọ yiri otu nʼime agwọ ndị ahụ, tinye ya nʼọnụ osisi dị ogologo. Onye ọbụla kwa agwọ ahụ tara nke welitere anya ya elu lee agwọ bronz ahụ anya, dịkwara ndụ.
Nyochaa Ọnụọgụgụ 21:9
3
Ọnụọgụgụ 21:5
Ha kwuru okwu megide Chineke na Mosis sị, “Gịnị mere i ji site nʼala Ijipt kpọpụta anyị ka anyị nwụsịa nʼọzara a? Lee na nri ọbụla adịghị nʼebe a, mmiri ọṅụṅụ adịghịkwa, ike iri mánà a na-enweghị isi agwụkwala anyị.”
Nyochaa Ọnụọgụgụ 21:5
4
Ọnụọgụgụ 21:6
Ya mere, ONYENWE ANYị zitere agwọ ọjọọ na-ata ata nʼetiti ha. Agwọ ndị a tagbukwara ọtụtụ nʼime ụmụ Izrel.
Nyochaa Ọnụọgụgụ 21:6
5
Ọnụọgụgụ 21:7
Mgbe ahụ, ndị Izrel bịakwutere Mosis sị ya, “Anyị emehiela, nʼihi na anyị ekwuluola ONYENWE ANYị, kwulukwaa gị onwe gị. Biko rịọrọ anyị ONYENWE ANYị ka o wezugara anyị agwọ ọjọọ ndị a.” Mosis rịọrọ arịrịọ nʼihi ha.
Nyochaa Ọnụọgụgụ 21:7
Ulo
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ
Vidiyo