1
Ọnụọgụgụ 20:12
Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a
Ma ONYENWE ANYị gwara Mosis na Erọn okwu sị, “Ebe ọ bụ na unu jụrụ ikwenye nʼokwu m, jụkwa ido m nsọ nʼihu ndị Izrel niile, unu agaghị edubata ọgbakọ ndị a nʼala ahụ m na-aga inye ha.”
Lee anya n'etiti ihe abụọ
Nyochaa Ọnụọgụgụ 20:12
2
Ọnụọgụgụ 20:8
“Were mkpara ahụ, gị na nwanne gị Erọn kpọkọta nzukọ Izrel niile. Gwa nkume ahụ okwu nʼihu ha, ọ ga-asọpụta mmiri ya. Unu ga-eme ka mmiri si na nkume ahụ sọpụta nye ọgbakọ ahụ, ka ha na igwe anụ ụlọ ha, ṅụọ mmiri.”
Nyochaa Ọnụọgụgụ 20:8
3
Ọnụọgụgụ 20:11
Mgbe ahụ Mosis weliri aka ya elu jiri mkpara ahụ tie nkume ahụ ugboro abụọ. Mmiri sitere na ya sọpụta. Ọgbakọ Izrel niile na igwe anụ ụlọ ha ṅụkwara mmiri.
Nyochaa Ọnụọgụgụ 20:11
4
Ọnụọgụgụ 20:10
Emesịa, Mosis na Erọn kpọkọtara ụmụ Izrel niile nʼihu nkume ahụ. Mgbe ha bịaruru nso, Mosis gwara ha okwu sị ha, “Geenụ ntị unu ndị nnupu isi! Ọ bụ site na nkume a ka anyị ga-enye unu mmiri?”
Nyochaa Ọnụọgụgụ 20:10
Ulo
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ
Vidiyo