Atụmatụ Ihe Ọgụgụ Gasị Dị N’efu na Ihe Ofufe Gasị metụtara I. JỌN 4:19

Ịchọta Ụzọ Gị Laghachikwuté Chineke
Ụbọchị 5
Ị̀ n'achọ inwetekwú ihe na ndụ? Inwekwú ọchịchọ ihe, n'ezie, bụ̀ agụụ ilọghachikwutè Chineke—ná ọnọdụ ọbụla mmekọrịta gị na Chineke si wee dị ugbu a. Anyị niile n'enwe ahụmahụ nke akarà mgbaru-ọsọ gasị—mà ọ bụ̀ ntété gasị nke ime mmụọ—ka anyị na-achọta ụzọ anyị ilọghachikwutè Chineke. Mee njem site na ntété ndị a n'otu n'otu wee mechie nzọụkwụ dị n'etiti ebe ịnọ ugbu a na ebe ịchọrọ ịbịarute. Anyị chọrọ ịchọta Chineke, Ọ bụkwa agụụ nke obi Ya ka a chọta Ya.

Nkwa Ahụ
Ubọchị 6
N'ime Atụmatụ Ihe Ọgụgụ Nke Akwụkwọ Nsọ a ndị Life.Church nyerè, di na nwunye isii n'èdé maka nkwa agbamakwụkwọ isii nke ha n'ekwughị mgbe ha guzo n'ihu ebe nchụàjà. Nkwa ndị a nke nkwadebe, ihe kacha mkpa, nchụso, nrụkọ-ọrụ, ịdị ọcha na ikpe ekpere bụ̀ nkwa n'eme ka alụmdi na nwunye rụọ ọrụ ogologo oge gafere ụbọchị agbamakwụkwọ. Ma ị lụrụ̀ di ma ọ bụ nwunye ma ọ bụ ịna eche maka ya, oge eruola ime nkwa ahụ.

Obi isi ike
Otu Izu
Mụta ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru gbasara atụghi ụjọ na obi isi ike. Atụmatụ ọgụgụ “obi isi ike” na-agba ndị kwere ekwe ume site n'ichetara ha ndị ha bụ n'ime Kraịst ma n'ime alaeze Chineke. Mgbe anyị bụ nke Chineke, anyị di nwere onwe ịbịakwute Ya n'enweghị ogbachi ọbụla. Gụgharịa--ma ọ bụ ikekwe nke mbụ--mmesi obi ike na ọnọdụ gị n'ime ezi na ụlọ Chineke di nchebe.