YouVersion Logo
Search Icon

ABÙ ỌMA 102

102
Ekpere nke onye ewedara n'ala mb͕e ike adighi ya, o we nēkwuwa okwu ntamu-ya n'iru Jehova.
1Jehova, nuru ekperem,
Ka ntikum ru kwa Gi nti.
2Ezonarilam iru-Gi n'ubọchi ahuhu m'nāhu:
Tọ nti-Gi n'ala n'ebe m'nọ;
N'ubọchi m'nākpọku Gi zam ngwa ngwa.
3N'ihi na ubọchim nile agwusiwo n'anwuru-ọku,
Erechapuwo kwa ọkpukpum nile dika ọlọkọ-ọku.
4Etib͕uwo obim dika ihe akuru n'ala, o we kpọnwua;
N'ihi na echezọwom iri nrim.
5Site n'olu ize-umem
Ọkpukpum araparawo n'anu-arum.
6Eyirim okwolo nke ọzara;
Aghọwom ihe dika okwukwu nke nkpọnkpọ ebe.
7Amuruwom anya, we ghọ
Ihe dika nnunu ntà nke nání ya nọ n'elu-ulo.
8Ogologo ubọchi nile ka ndi-irom nātam uta;
Ndi nāwi ara imegidem ejiwom ṅua iyi.
9N'ihi na eriwom ntu dika nri,
Were kwa ikwa-ákwá gwakọta ihe-ọṅuṅum.
10Site n'iwe-Gi na ọnuma-Gi:
N'ihi na I buliwom elu, we tufuem.
11Ubọchim nile di ka onyinyo nke nēsetipu onwe-ya site n'ọdida anyanwu;
Mu onwem nākpọnwu kwa dika ihe akuru n'ala.
12Ma Gi onwe-gi, Jehova, nānọdu dika eze rue mb͕e ebighi-ebi;
Ncheta-Gi nādiru kwa ọb͕ọ nile.
13Gi onwe-gi gēbili, nwe obi-ebere n'aru Zaion:
N'ihi na mb͕e eruwo imere ya amara, n'ihi na mb͕e akara àkà abiawo.
14N'ihi na nkume-ya nile nātọ ndi-orù-Gi utọ,
Ha nēme-kwa-ra ájá-ya amara.
15Mba nile gātu kwa egwu aha Jehova,
Eze nile nke uwa gātu kwa egwu ebube-Gi:
16N'ihi na Jehova ewuwo Zaion,
O mewo Onwe-ya ka ahú Ya nime ebube-ya.
17O chewo ekpere nke onye nēnweghi ihe iru,
O ledaghi kwa ekpere-ha anya.
18Agēde nka n'akwukwọ nye ọb͕ọ nēso n'azu:
Ọzọ, otù ndi nke agēkè gēto Ja.
19N'ihi na O siwo n'ebe di elu nke ebe nsọ Ya lepu anya;
Jehova esitewo n'elu-igwe legide uwa anya;
20Inu ize-ume nke onye-nkpọrọ;
Itọpu ndi nāghaghi inwu anwu;
21Ka ha we kọ akukọ aha Jehova nime Zaion,
Kọ kwa akukọ otuto-Ya nime Jerusalem;
22Mb͕e ndi nile di iche iche gāchikọta onwe-ha n'otù,
Ha na ala-eze nile, ifè Jehova òfùfè.
23O wedawo ikem n'uzọ;
O bilatawo ubọchim nile.
24Asirim, Chinekem, emela ka m'la n'elu n'etiti ubọchim nile:
N'ọb͕ọ nile ka arọ-gi nādigide.
25Na mb͕e ochie ka I tọrọ ntọ-ala nke uwa;
Ọlu aka-Gi ka elu-igwe bu kwa.
26Ha onwe-ha gāla n'iyì, ma Gi onwe-gi nēguzogide:
Ha nile gāka kwa nká dika uwe;
Dika ákwà-nb͕okwasi ka I gāb͕anwe ha, agāb͕anwe kwa ha:
27Ma Gi onwe-gi bu Onye ahu Nke nādi mb͕e nile,
Arọ-Gi nile agaghi-agwu kwa agwu
28Umu nke ndi-orù-Gi gēbigide,
Nkpuru-ha gēguzosi ike n'iru Gi.

Currently Selected:

ABÙ ỌMA 102: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in