YouVersion Logo
Search Icon

ABÙ ỌMA 101

101
Abù Ọma Devid.
1Ebere na ezi ikpé ka M'gābù n'abù:
Gi, Jehova, ka m'gabùku abù ọma.
2M'gēnwe uche n'uzọ zuru okè:
Òle mb͕e I gābiakutem?
M'gējeghari n'etiti ulom n'izu-okè nke obim.
3M'gaghi-edo ihe jọb͕uru onwe-ya n'irum:
Akpọwom ọlu nke ndi nējehie asì;
Ọ gaghi-arapra n'arum.
4Obi b͕agọro ab͕agọ gēsi n'ebe m'nọ wezuga onwe-ya:
Ọ dighi onye ọjọ m'gāmara.
5Onye nēkpè madu-ibe-ya ikpè na nzuzo, onye ahu ka m'gēkpochapu:
Onye nwere anya npako na obi di nganga, onye ahu ka m'nāpughi inagide.
6Anyam abua di n'aru ndi kwesiri ntukwasi-obi n'ala, ka mu na ha we biri:
Onye nēje ije n'uzọ zuru okè, onye ahu gējerem ozi.
7Onye nālu ọlu aghughọ agaghi-ebi n'etiti ulom:
Onye nēkwu okwu-ugha agaghi-eguzosi ike n'iru anyam.
8Kwa-ututu ka m'gēkpochapu ndi nile nēmebi iwu n'ala;
Isi n'obodo Jehova kpochapu ndi nile nālu ajọ ihe.

Currently Selected:

ABÙ ỌMA 101: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in