JENESIS 8

8
1Ma Chineke chetara Noa, na anu nile di ndu, na anu-ulo nile nke ya na ha nọ n'ub͕ọ; Chineke we me ka ifufe gabiga n'elu uwa, miri we taba; 2e mechikwara isi-iyi nile nke ob͕u-miri na window nile nke elu-igwe, eb͕ochi-kwa-ra oké miri-ozuzo nēsite n'elu-igwe; 3miri we si n'elu uwa nālaghachi mb͕e nile: miri ahu we bilata mb͕e ọgu ubọchi asa na iri gwusiri. 4Ub͕ọ ahu we tọb͕ọrọ n'elu ugwu nke Ararat n'ọnwa nke-asa, n'ubọchi nke-iri-na-asa nke ọnwa ahu. 5Miri we nēbilata mb͕e nile rue ọnwa nke-iri: n'ọnwa nke-iri ahu, n'ubọchi mbu nke ọnwa, ka ahuru elu ugwu. 6O rue, mb͕e ọgu ubọchi abua gwusiri, na Noa meghere window nke ub͕ọ o mere: 7o zipu ugolo ọma, nke púru nāpù nālata, rue mb͕e miri tasiri n'elu uwa. 8Ọ we si n'ebe ọ nọ zipu nduru, ile ma miri esiwo n'elu ala taba; 9ma nduru ahu ahughi ebe-izu-ike nye ọbu-ukwu-ya, ọ we laghachikute ya rue n'ub͕ọ, n'ihi na miri ahu di n'elu uwa nile: ọ we setipu aka-ya, were ya, me ka ọ bakute ya nime ub͕ọ. 10Ọ we che kwa ubọchi asa ọzọ; ọ we si n'ub͕ọ zipu nduru ahu ọzọ; 11nduru ahu we bakute ya na mb͕e anyasi; ma, le, akwukwọ osisi olive akubitere ọhu di n'ọnu-ya: Noa we mara na miri esiwo n'elu uwa taba. 12Ọ we che kwa ubọchi asa ọzọ, zipu nduru ahu; ma ọ laghachikuteghi ya ọzọ ma-ọli. 13O rue, n'arọ nke-nnù na ọgu iri na otù, n'ọnwa mbu, n'ubọchi mbu nke ọnwa ahu, na miri siri n'elu uwa tasia: Noa we wezuga ihe-nkpuchi nke ub͕ọ ahu, hu, ma, le, iru ala kpọrọ nku. 14Ọ bu n'ọnwa nke-abua, n'ubọchi nke-orú-na-asa, ka ala kọsiri.
15Chineke we gwa Noa okwu, si, 16Si n'ub͕ọ pua, gi onwe-gi, na nwunye-gi, na umu-gi ndikom, na nwunye nile nke umu-gi ndikom tiyere onwe-gi. 17Anu nile ọ bula nke di ndu nke gi na ya nọ, bú nke sitere n'anu-aru nile, nime anu-ufe, na nime anu-ulo, na nime ihe nile nākpu akpu nke nākpu akpu n'uwa, gi me ka ha so gi puta; ka ha we nuputa n'uwa, mua ọmùmù, ba uba n'elu uwa. 18Noa we pua, ya na umu-ya ndikom na nwunye-ya na nwunye nile nke umu-ya ndikom: 19anu nile ọ bula nke di ndu, ihe nile ọ bula nke nākpu akpu, na anu-ufe nile ọ bula, ihe ọ bula nke nākpu akpu n'elu uwa, dika ab͕uru-ha si di, ha siri n'ub͕ọ pua. 20Noa we wuere Jehova ebe-ichu-aja, were ufọdu nime anu-ulo nile ọ bula di ọcha na nime anu-ufe nile ọ bula di ọcha, sure àjà-nsure-ọku n'ebe-ichu-aja ahu. 21Jehova we nu ísì utọ ya; Jehova we gwa obi-Ya okwu, si, M'gaghi-akọcha ala ọzọ ma-ọli n'ihi madu, n'ihi na ncheputa nke obi madu di njọ site na nwata; M'gaghi-etib͕u kwa ihe nile ọ bula di ndu ọzọ ma-ọli, dika M'meworo. 22Rue ubọchi nile nke uwa, ọghigha-nkpuru na owuwe-ihe-ubi, na oyi na okpom-ọku, na udumiri na ọkọchi, na ehihie na abali, agaghi-ebì.

ទើបបានជ្រើសរើសហើយ៖

JENESIS 8: IGBOB

គំនូស​ចំណាំ

ចែក​រំលែក

ចម្លង

None

ចង់ឱ្យគំនូសពណ៌ដែលបានរក្សាទុករបស់អ្នក មាននៅលើគ្រប់ឧបករណ៍ទាំងអស់មែនទេ? ចុះឈ្មោះប្រើ ឬចុះឈ្មោះចូល