JENESIS 9

9
1Chineke we gọzie Noa na umu-ya ndikom, si ha, Muanu ọmùmù, banu uba, juputa uwa. 2Egwù-unu na ujọ-unu gādikwasi n'anu nile ọ bula nke uwa nke di ndu, na n'anu-ufe nile ọ bula nke elu-igwe; tiyere ihe nile ọ bula nke ala nēnuputa, tiye-kwa-ra azù nile nke oké osimiri, n'aka-unu ka enyeworo ha. 3Ihe nile ọ bula nke nākpu akpu, nke di ndu, gāburu unu ihe-oriri; dika akwukwọ ihe-ọkukú ka M'nyeworo unu ha nile. 4Nání anu-aru nke ndu-ya, bú ọbara-ya, di nime ya ka unu nāgaghi-eri. 5N'ezie ọbara-unu, bú nke diri ndu-unu, ka M'gajuta kwa; n'aka anu nile ọ bula di ndu ka M'gājuta ya: ọ bu kwa n'aka madu, n'aka nwa-nne madu ọ bula, ka M'gājuta ndu madu. 6Onye nāwusi ọbara madu, site n'aka madu ka agāwusi ọbara-ya: n'ihi na ọ bu n'onyinyo Chineke ka O mere madu. 7Unu onwe-unu kwa, muanu ọmùmù, banu uba; nuputanu umu n'uwa, ba uba nime ya.
8Chineke we gwa Noa, gwa kwa umu-ya ndikom tiyere ya, okwu, si, 9Mu onwem kwa, le, M'ganēme ka ọb͕ub͕a-ndum guzosi ike n'ebe unu nọ, na n'ebe nkpuru-unu nọ, bú ndi gānọchi unu; 10na n'ebe anu nile ọ bula nke nwere nkpuru-obi di ndu di nke dinyere unu, nime anu-ufe, na nime anu-ulo, na nime anu-ọhia nile ọ bula nke uwa nke dinyere unu; bú nke sitere n'ihe nile nēsi n'ub͕ọ ahu puta, bú anu-ọhia nile ọ bula nke uwa. 11M'gēme kwa ka ọb͕ub͕a-ndum guzosi ike n'ebe unu nọ: agaghi-ebipu kwa anu-aru nile ọzọ site na miri nke iju-miri ahu; iju-miri agaghi-adi kwa ọzọ ibibi uwa. 12Chineke we si, Nka bu ihe-iriba-ama nke ọb͕ub͕a-ndu ahu nke Mu onwem nāb͕a n'etiti Mu na unu na anu nile ọ bula nwere nkpuru-obi di ndu nke diyere unu, rue ọb͕ọ nile ebighi-ebi: 13eke na ogwurugwu m ka tinyeworo n'igwe-oji, ọ gāghọ kwa ihe-iriba-ama nke ọb͕ub͕a-ndu di n'etiti Mu na uwa. 14Ọ gēru kwa, mb͕e M'nēme ka igwe-oji puta n'elu uwa, na agāhu eke-na-ogwurugwu ahu n'igwe-oji ahu, 15M'we cheta ọb͕ub͕a-ndum, nke di n'etiti mu na unu na anu nile ọ bula nwere nkpuru-obi di ndu nime anu-aru nile; miri agaghi-aghọ kwa iju-miri ọzọ ibibi anu-aru nile. 16Eke-na-ogwurugwu ahu gādi kwa n'igwe-oji; M'gāhu kwa ya anya, icheta ọb͕ub͕a-ndu ebighi-ebi di n'etiti Chineke na anu nile ọ bula nwere nkpuru-obi di ndu nime anu-aru nile nke di n'elu uwa. 17Chineke we si Noa, Nka bu ihe-iriba-ama nke ọbub͕a-ndu ahu nke M'meworo ka o guzosie ike n'etiti Mu na anu-aru nile nke di n'elu uwa.
18Umu-ndikom Noa, ndi siri n'ub͕ọ ahu pua, bu Shem, na Ham, na Jefet: ma Ham bu nna Kenean. 19Ndia atọ bu umu-ndikom Noa: ọ bu kwa site na ndia ka uwa nile b͕asara.
20Noa, bú onye-ọlu-ubi, we malite iku ubi-vine: 21ọ we ṅua ufọdu nime manya-vine-ya, ṅubiga ókè, b͕aba onwe-ya ọtọ n'etiti ulo-ikwū-ya. 22Ham, bú nna Kenean, we hu ọtọ nna-ya, gosi umu-nne-ya ndikom abua n'èzí. 23Shem na Jefet we chiri uwe-nb͕okwasi, tukwasi n'ubu ha abua, were azu-ha je, kpuchie ọtọ nna-ha; ma iru-ha di n'azu, ha ahughi kwa ọtọ nna-ha. 24Noa we teta n'ura manya-vine-ya, mara ihe nwa-ya nwoke nke-ntà mere ya. 25Ọ we si,
Onye anābu ọnu ka Kenean bu;
Orù nke ndi-orù ka ọ gāburu umu-nne-ya ndikom.
26Ọ si kwa,
Onye agọziri agọzi ka Jehova, bú Chineke nke Shem, bu;
Ka Kenean ghọkwara ha orù.
27Ka Chineke me ka Jefet setia,
Ya biri kwa n'ulo-ikwū nile nke Shem;
Ka Kenean ghọ-kwa-ra ha orù.
28Noa we di ndu, mb͕e iju-miri ahu gasiri, ọgu arọ iri-na-asa na arọ iri. 29Ubọchi nile nke Noa we buru nnù arọ abua na ọgu asa na iri: o we nwua.

ទើបបានជ្រើសរើសហើយ៖

JENESIS 9: IGBOB

គំនូស​ចំណាំ

ចែក​រំលែក

ចម្លង

None

ចង់ឱ្យគំនូសពណ៌ដែលបានរក្សាទុករបស់អ្នក មាននៅលើគ្រប់ឧបករណ៍ទាំងអស់មែនទេ? ចុះឈ្មោះប្រើ ឬចុះឈ្មោះចូល