JENESIS 8:21-22

JENESIS 8:21-22 IGBOB

Jehova we nu ísì utọ ya; Jehova we gwa obi-Ya okwu, si, M'gaghi-akọcha ala ọzọ ma-ọli n'ihi madu, n'ihi na ncheputa nke obi madu di njọ site na nwata; M'gaghi-etib͕u kwa ihe nile ọ bula di ndu ọzọ ma-ọli, dika M'meworo. Rue ubọchi nile nke uwa, ọghigha-nkpuru na owuwe-ihe-ubi, na oyi na okpom-ọku, na udumiri na ọkọchi, na ehihie na abali, agaghi-ebì.