Otu Okwu Ga-agbanwe Ndụ GịIhe Atụ
Usoro Otu Okwu
Dị Njikere
N'agbanyeghị mkpọtụ niile a na-eme, anyị ka hụrụ eziokwu ahụ n'anya bụ na Afọ Ọhụrụ nwere ike ịbụ ohere iji kpochapụ ihe ndị ahụ anyị kwakọrọ site n'afọ gara aga wee malite ọzọ. Anyị dị nwere onwe iwepụ ibu ahụ di n'ahụ anyị di 10 pounds, ịme ihe ofufe kwa ụbọchị, imerikwu n'egwuregwu, zukwuo ahu anyị ozuzu, kpekwuo ekpere ka anyị kwesịrị, anyị na ezinụlọ anyị anọkokwuo, kwụchapu ụgwọ niile anyị ji, bulikwuo akara ule anyị ma ọ bụ kerịtara ndị otu egwuregwu anyị na ndị enyi anyị Jizọs Kraịst. Mana nke bụ eziokwu bụ na ogologo ndepụta mkpebi ndị ahụ anaghị abụkari ihe e mechara wee mee.
Otu ihe ngwọta bụ ikpochapu ha niile ma mee ya ka ọ bụrụ otu mkpụrụ okwu bụ isi maka afọ na-abịa, mee ya ka ọ bụrụ ihe n'adịghị agbagwoju anya na ihe di mfe.
Ya mere, ka anyị ruo n’akụkụ nke ịme ihe nke Otu Okwu ga-abụ isiokwu. Nke a bụ usoro iji nyere gị aka ịchọpụta Otu Okwu gị ga-abụ isiokwu. Buru n'uche na usoro a na-ewe oge, mana ọ bara uru. Ma ị bụ onye na-eme ihe mmega ahụ, onye nchịkwa, nne ma ọ bụ nna ma ọ bụ onye isi azụmahịa, usoro a nwere ike ịkwadoro gị ọganihu n'akụkụ ọ bụla nke ndụ gị.
Usoro Otu Okwu nwere usoro atọ dị mfe – Leba Anya, Lelie Anya Elu, na Lepụta Anya.
Nzọụkwụ 1 – Kwadebe obi gị (Leba Anya) - Nke a bụ ebe ị na-eme ihe iji wepụ onwe gị n'ịme ihe ọsọ ọsọ, mkpọtụ na ngwongwo nke ndụ. Ịchọta nnọrọ onwe na ịdị jụụ nwere ike ịbụ ọrụ siri ike, mana ịnụ n'ọnụ Chineke dị mkpa. Ka anyị na-ekwe ka Chineke nyochaa obi anyị, Ọ ga-enye anyị ndom anya.
Nzọụkwụ 2 - Chọpụta Okwu Gị (Lelie Anya Elu) - Nzọụkwụ a na-enyere anyị aka ịkwunye ma gee Chineke ntị. Iwepụta oge maka ekpere—mkparịta ụka ahụ dị mfe anyị na Chineke n'enwe—bụ ebe a ga-amalite. Jụọ Ya ajụjụ a: Gịnị ka Ị chọrọ ime n'ime m na site na m n'afọ a? Ajụjụ a ga-enyere gị aka ịchọpụta okwu e zubere maka gị. Atụtụla okwu di nma; nata okwu bụ nke Chineke.
Nzọụkwụ 3 – Bie Okwu Gị (Lepụta Anya) – Ozugbo ị chọpụtara okwu ahụ e zubere maka gị, oge abịala ka ịbipụta ya. Okwu gị ga-enwe mmetụta n'akụkụ niile nke ndụ gị: anụ ahụ gị, echiche gị, mmụọ gị, mmetụta uche gị, mmekọrịta gị na ego gị. Debe otu okwu gị n'ihu na n'etiti. Gwa ndị n'enyere gị aka ichikwa ndụ gị na ndị ezinụlọ gị okwu gị maka afọ. Dee ya n'akwụkwọ akụkọ gị. Mapawa ya na friji gị. Gị na ezinụlọ gị kwurịta maka ya na tebụl oge unu n'eri nri abalị. Mee ihe ọ bụla ọ ga-ewe iji mee ka ọ bụrụ ihe ị na-elekwasị anya na mee ka ọ na-adị ọhụrụ.
Anyị na-ekpe ekpere ka afọ a bụrụ afọ nke mmeri gị ka Onye-nwe-anyị na-ebuga gị n’ọkwa nke ka na were Otu Okwu gị wetara Onwe Ya otuto!
Gaa N'Ihụ
1. Gịnị ka Chineke na-agwa gị ugbu a banyere Otu Okwu ga-abụ isiokwu gị?
2. Wepụta oge dị ukwuu ịkpee ekpere na ịrịọ Chineke ka Ọ gwa gị okwu.
3. Gagharịa na nzọụkwụ atọ e wepụtara gị ma kwee ka Chineke kpugheere gị okwu ahụ e zubere maka gị.
Rụọ Ka Ọrụ
Abụ Ọma 27:4, Abụ Ọma 84, Abụ Ọma 139
Rụfee Ka Ọrụ
"Onye-nwe-anyị, a na m ekpe ekpere ka afọ a buru afọ ọganihụ. Were Otu Okwu a ga-abụ isiokwu m wetara Onwe Gị otuto. Gbatịa m n'usoro a. Kpugheere m eziokwu na mkpughe. Biko mee ya n'ụzọ ga-adi m mfe ighọta. Kwuo okwu, Onye-nwe-anyị, ohu Gị na-ege ntị. N’aha Jizọs, amen.”
Igodo: ụbọchị_ato ụbọchị_ato
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
OTU OKWU na-enyere gị aka ime ka ndụ gị dị mfe site n'ilekwasị anya nanị n'OTU OKWU n'ime afọ dum. Ịdị mfe nke ịchọpụta okwu Chineke nwere maka gị na-eme ka ọ bụrụ ihe na-akpalite mgbanwe ndụ. Ngwongwo na ihe tara akpụ na-eduba na emeghị ihe ọbụla na ahụ mkpọnwụ, ebe ịdị mfe na ilekwasị anya na-eduba na ịga nke ọma na idoanya. Ihe ofufe a nke ụbọchị ano ga-egosi gị otu ị ga-esi wabanye ruo n'isi nke ebumnuche gị iji nweta otu okwu ọhụụ maka afọ. Igodo: gbasara gbasara https://my. bible. com/reading-plans/809one-word-that-will-change-your-life https://my. bible. com/reading-plans/809-one-word-that-will-change-your-life/day/1 Otu Okwu ga-agbanwe ndụ gị. png.
More