Otu Okwu Ga-agbanwe Ndụ GịIhe Atụ
Ike Nke Otu Okwu
Njikere
Mkpebi Afọ Ọhụrụ anaghị arụ ọrụ!
50% nke ndị na-eme mkpebi afọ ọhụrụ na-ada n'mkpebi ha n'ọgwụgwụ Jenụwarị ma 9 n'ime 10 kwụsịrị kpamkpam ka Machị bịara! Yabụ kama ịme mkpebi, nweta Otu Okwu maka afọ… mana kpachara anya! Ọ nwere ike ịgbanwe gị.
Ọ bụrụ na ị nwere uche “mee-ya-kpamkpam” dị ka anyị nwere, i meela oke ebumnuche gị nhazi-ọma na mmalite nke Afọ Ohụrụ ọ bụla. Otú ọ dị, ka oge na-aga, anyị nwere oke iwe n'ime obi anyị ka atụmatụ anyị nke inwe óké oganihu adabaghị ka anyị siri hazie ha. Anyị gbalịrị ime ọtụtụ ihe ma n'ihi ya, anyị emeghị ihe ọ bụla nke ọma.
Na 1999, anyị malitere usoro ozuzu ndụ dị mfe nke ịmepụta Otu Okwu ga-abụ naanị isiokwu nke afọ na-abịa. Inụgheghị nti—Otu Okwu. Ọ bụghị nkebiokwu ma ọ bụ nkwupụta, naanị otu mkpụrụokwu. Site n'ilekwasị anya naanị n'Otu Okwu anyị enwetala mgbanwe ndụ dị egwu site n'afọ ruo n'afọ. Mgbe ị chọputara Otu Okwu gị maka afọ, ọ na-enyekwu gị ndom anya, oke mmasị na nzube maka ndụ.
Mmega ahụ nke Otu Okwu na-eweta idi mfe na nlekwasị anya. Ọ na-egbuwa gafee ihe ndọpụ uche ma na-eme ka anyị lekwasị anya n'ihe dị mkpa n'ezie. Ọ gbatịala anyị n'akụkụ niile: n'ụzọ ime mmụọ, n'anụ ahụ, n'uche, mmetụta uche, mmekọrịta na ihe ego. Chineke agbanweela anyị site na mmega ahụ a; Ngbanwe ndụ na-atọ Chineke ụtọ.
Enwere ihe kpatara anyị ji sị, "Nweta Otu Okwu maka afọ… mana kpachara anya.” Ozugbo ị chọpụtara otu okwu gị, agha gị ga-amalite. Ọ ga-ebido usoro nkuzi, mmepe, nnụcha na mkpụzi. Chineke ga-eji otu okwu gị mee ihe dị ka ìhè na enyo – na-agbara gị ọkụ n'ụzọ gị na n'ekpughe ihe ndị kwesịrị ka a gbanwe ha. Ọ na-akwado nnukwu njem jupụtara na ịdị elu na ịdị ala nke emebeere ka ị bụrụ onye e kere gị ka ị bụrụ.
Ọ bụrụla ahụmahụ anyị na Chineke na-ekpughe ngwa ngwa atụmatụ Ya maka Otu Okwu gị. Otu Okwu ahụ (ma ọ bụ ihe ozuzu, mkpụrụ nke mmụọ nsọ, ihe si n'àgwà, ma ọ bụ njiri mara nke Chineke) ga-akpọ gị aha maka afọ ahụ! Ya mere chọpụta Otu Okwu gị maka afọ wee kesaa ya ndị ọzọ! Ọ nwere ike gbanwee ndụ gị!
Gaa N'Ihu
1. Gịnị ka Chineke na-agwa gị n’afọ a gara aga?
2. Olee ebe Chineke chọrọ ijide n'aka na ndụ gị ma were mee ihe maka otuto Ya?
3. Kedu ka Chineke siri chọọ idobe gị n'afọ na-abịa?
Rụọ Ka Ọrụ
Abụ Ọma 27:1-14; Luk 18:22; Mak 10:21
Rụfee Ka Ọrụ
"Ezigbo Onye-nwe-anyị, a na m arịọ Gị ka Ị mee ka ọ bụrụ afọ na-agbanwe ndụ, kpugheere m onwe Gị ka Ị na-egosi m Otu Okwu ga-abụ isiokwu m. Jupụta m na Mmụọ Nsọ Gị. Aghọtara m na ọ bụ njem nke mmụta ọ bụghị ọrụ e nyere m imezu, Gbaa mụ ume ka m na-ebipụta Otu Okwu m kwa ụbọchị. N'aha Jizọs, amen."
Ị chọrọ ịnweta Atụmatụ Omume Nke Otu Okwu? Budata ya n'akwughị ugwo na GetOneWord.com
Igodo: ụbọchị_otu ụbọchị_otuOkwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
OTU OKWU na-enyere gị aka ime ka ndụ gị dị mfe site n'ilekwasị anya nanị n'OTU OKWU n'ime afọ dum. Ịdị mfe nke ịchọpụta okwu Chineke nwere maka gị na-eme ka ọ bụrụ ihe na-akpalite mgbanwe ndụ. Ngwongwo na ihe tara akpụ na-eduba na emeghị ihe ọbụla na ahụ mkpọnwụ, ebe ịdị mfe na ilekwasị anya na-eduba na ịga nke ọma na idoanya. Ihe ofufe a nke ụbọchị ano ga-egosi gị otu ị ga-esi wabanye ruo n'isi nke ebumnuche gị iji nweta otu okwu ọhụụ maka afọ. Igodo: gbasara gbasara https://my. bible. com/reading-plans/809one-word-that-will-change-your-life https://my. bible. com/reading-plans/809-one-word-that-will-change-your-life/day/1 Otu Okwu ga-agbanwe ndụ gị. png.
More