Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ebube Nke Dị UkwuuIhe Atụ

Ebube Nke Dị Ukwuu

ỤBỌCHỊ 5 NKE 5

Ichegharị Ihe Gbasara Ọganihu

N'Aịzaya 60:4, Aịzaya kwuru banyere nnọkọ ndị Chineke gbasasịrị agbasasị. Ugbu a, amaokwu nke 5 ọ na-ekpughe ọtụtụ ihe na-esonyere nnọkọ a.

Ugbu a, ekwela ka uche gị gbaa ọsọ ọsọ na-eche maka, "ihe onwunwe" naanị.

Ọganihu a abụghị nanị akụ na ụba ihe onwunwe; Ọ na-agụnye akụkụ ọ bụla nke ndụ anyị. Ihe bara ụba nke Chineke na-eweta ọṅụ, udo, na mmezu, na-agbasawanye obi anyị iji nwetakwuo ịdị mma Ya.

Ọganihu a na-ekwu okwu banyere nnukwu owuwe ihe ubi nke mkpụrụ obi gbasasịrị nke a ga-achịkọta. Ọ na-ekwu okwu banyere ọnụ ọgụgụ dị ukwuu nke ndị na-atụgharịkwuru Onyenwe anyị.

Ka anyị na-enweta mmiri nke ọganihu Chineke, ka anyị cheta na akụ na ụba anyị kachasị elu dị n'ime Kraịst. Obi anyị na-atọ anyị ụtọ ma gbasaa n'ọṅụ, ebe anyị maara na anyị bụ ndị nketa nke akụ na ụba Chineke na-enweghị njedebe.

Ekpere:

Ezigbo Nna nke eluigwe, daalụ maka nnukwu owuwe ihe ubi nke mkpụrụ obi e kwere ná nkwa. Ana m ekele gị maka ọtụtụ ndị gbasasịrị agbasa sị n'oge gara aga. Ka ọṅụ gị jupụta n'obi m .N'aha Jizọs, anyị na-ekpe ekpere. Amen.

Okwu Chukwu

Ụbọchị 4

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Ebube Nke Dị Ukwuu

Nke a bụ nkọwa Akwụkwọ Nsọ banyere Aịzaya 60: 1-5, na-akọwa ebube Zayọn n'ọdịnihu, ebe ìhè Chineke na-enwu gbaa, na-adọta mba dị iche iche ma na-achịkọta ndị ya gbasasịrị agbasasị, na-eweta ọganihu, owuwe ihe ubi nke mkpụrụ obi.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Annie Fortunate maka ịnye atụmatụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://www.facebook.com/profile.php?id=100079911486748&mibextid=LQQJ4d