Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Nzukọ Nkuzi N'Elu UgwuIhe Atụ

Nzukọ Nkuzi N'Elu Ugwu

ỤBỌCHỊ 4 NKE 5

Obi Dị Ọcha

Chineke agaghị agwa gị ka i mee ihe ị na-apụghị ime. Jizọs dụrụ anyị ọdụ ka anyị nwee obi dị ọcha, nke pụtara na ọ ga-ekwe omume inwe obi dị ọcha.

Inwe obi dị ọcha abụghị maka izu okè, ọ pụtara ịbụ onye dị mma n'ezigbo, bụrụkwa onye bụ onye eziokwu nye onwe ya. Ọ pụtara na adịghịzi omume izo ezo ma ọ bụ nghọgbu. Naanị gị, ịbụ onye dị adị n'eziokwu n'ebe Chineke na ndị ọzọ nọ.

Mgbe anyị nwere obi dị ọcha, anyị ga-ahụ Chineke n'ụzọ dị ọhụrụ. Anyị na-ahụ ịhụnanya ya, obiọma ya, na ọnụnọ ya na ndụ anyị. Anyị na-amalitekwa ịhụ ndị ọzọ s'ite n'anya ìhè ọhụrụ a, anyị na-amalite ịhụ ndị ọzọ s'ite na ọmịiko, mmetụta ya, na nghọta.

Ya mere, olee otu esi enweta obi dị ọcha? S'ite n'ịkwụwa aka ọtọ n'ebe Chineke nọ nakwa n'ebe onwe anyị nọ. Ma sitekwa n'ịrịọ Chineke ka ọ gbanwee anyị s'ite n'ime.

Ọ bụghị ihe banyere ịbụ onye zuru okè; Ọ bụ ihe banyere ịbụ ị dị adị n'eziokwu. Mgbe anyị dị adị n'ezie, anyị ga-enweta ọnụnọ Chineke na ịhụnanya n'ụzọ dị ịtụnanya.

Ekpere:

Daalụ Nna maka ịmepụta obi dị ọcha n'ime m. Nyere m aka iji obiọma na ọmịiko hụ ndị ọzọ. Amen.

Okwu Chukwu

Ụbọchị 3Ụbọchị 5

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Nzukọ Nkuzi N'Elu Ugwu

Matiu 5:5-9 na-ekuzi mkpa ọ dị ibi ndụ nke ịdị umeala n'obi, ezi omume, ọmịiko, ịdị ọcha, na udo, nakwa nkwa na ndị na-eme otú ahụ ga-enweta ngọzi na ihu ọma Chineke.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Annie Fortunate maka ịnye atụmatụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://www.facebook.com/profile.php?id=100079911486748&mibextid=LQQJ4d