Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ikike nke ntụzi akaIhe Atụ

Ikike nke ntụzi aka

ỤBỌCHỊ 1 NKE 5

Ka ha nwee mmeri

E kere mmadụ n'oyiyi Chineke ya na ka ọ nwee ikike ịchị isi. Ikike i chi isi na utuzi aka bụ akọ na uche Chineke jiri abawanye akụkụ obodo dị kpachara nso oké ala obodo ọzọ na nke ala eze ya. N'akwụkwọ abụọma 115:16 kwuru sị Eluigwe bụ eluigwe Chineke nwere mana ụwa ka o nyeworo ụmụ mmadụ.

Nkowa ikike ịchị isi: Ikike ịchị isi pụtara ịchị isi n'ihe niile nke na-anọchite eluigwe na ụwa. Ebumnobi Chineke ebe mmadụ nọ bụ ka mmadụ chịba ụwa ya na ka omejupụta ebumnuche ya n'elu ụwa. Ihe niile Chineke kere ma ewepu mmadụ bụ etu o siri masị ya mana Chineke kere mmadụ n'ụdịdị ya.

Inwe ikike ịchi isi: ọ bụrụ na ị chọrọ inwe mmeri na ndụ, ọ bụla dị imeri onye iro gị bụ Ekwensu, ya mere ị ga-ebi ndụ dịka onye ekere n'oyiyi na ụdịdị nke Chineke. Adam tụfuru ikike ịchị isi na ntụziaka mgbe orubeghị isi na ntụziaka Chineke nyere ya si ya arakwala mkpụrụ osisi nke sitere n'osisi nghọta ihe ọma na ihe ọjọọ.

I dobe iwu nke Chineke ga - enyere mmadụ aka ka o nwee mmeri n'ihe ọbụla ọ na-eme na ndụ. Abụ ọma 16:11 kọwara nke ọma njedebe mmadụ nwere na nchụkụ nke ndụ. Onye Abụ ọma hutara Chineke na ọ bụ ya ga-egosi ya ụzọ njem nke ndụ.

Ekwensu ka ji aghọghọ ochie ya were eduhie ma na-anapụ mmadụ ikike ịchị isi. O duhiere Eve ma too ya akpịrị ka omegide iwu Chineke, nke mere ka ọ tụfụọ ọnọdu inwe ikike ịchị isi.

Anyị ga-agba mbọ jụ ihe ito akpịrị nke ụwa a ma nọgidesie ike na idobe iwu nke Chineke nke ga-eme ka anyị nọgide n'ikike ịchị isi. Ebe ndabere anyị bụ n'ime ịchị isi. Chineke na-eri otito mgbemmadụ tinyere n'ọrụ ịnọgide n'ikike ịchị isi na ntụziaka.

Ihe ọgụgụ ndị ọzọ: Abụ Akwa 5:16, Ilu 4:13, Jeremaya 10:23.

Ekpere: Ezigbo Nna m nke bi n'eluigwe, nyere m aka ka m na-aga ije n'ikike ịchị isi. Nnye m amara nke m ga-eji na-agbanari ihe ito akpịrị niile nke sitere n'aka Ekwensu n'aha Jizọs.

Okwu Chukwu

Ụbọchị 2

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Ikike nke ntụzi aka

Nnyefe kpam kpam a na-arụtụ aka na mkpughe ikeke nke ntụzi aka enyere mmadụ na mbido okike. Ọdịda nke mmadụ butere nkewa n'ebe ikike a dị mana Kraịst bịara ka owechighaa ikeke nke ntụzi aka a.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Kingsley Onuoha maka ịnye atụmatụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://www.facebook.com/share/LYhjtr4Q4g4vVza7/?mibextid=qi2Omg