Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Akụ Gị Kacha Mma!Ihe Atụ

Akụ Gị Kacha Mma!

ỤBỌCHỊ 3 NKE 5

“Gụọ Akwụkwọ Nsọ Oge Nile”

Ọtụtụ n’ime anyị ga-ekweta na Akwụkwọ Nsọ na-enye ọtụtụ akwụkwọ ndị ejị agụ ya – ndị ụfọdụ n’ime ha pụrụ iyi ihe karịrị akarị ma bụrụ ndị n’edoghị anya mgbe ụfọdụ. Nke a bụ eziokwu ole na ole gbasara Akwụkwọ Nsọ ga-enyere gị aka n'oge ịgụ akwụkwọ gị site n'inweta ntụziaka na nghọta ka mma.

Nke mbụ, ị ga-ahụ na e kewara Akwụkwọ Nsọ ụzọ abụọ:

Agba Ochie bụ nchịkọta nke ihe odide nke n’malite na okike nke ụwa, akụkọ ihe mere eme nke ndị Israel – gụnyere mmeri ha dị ka mba, ndọrọ n’agha sitere n’aka ndị iro ha, n’ikpeazụ, nlọghachi ha iweghachi Jerusalem ọzọ narị afọ ole na ole tupu a mụọ Kraịst. Agba Ochie bụkwa iwu Chineke nyere ndị Israel.

Agba Ọhụụ bụ nchịkọta nke ihe odide n’malite, obere oge tupu ọmụmụ Jizọs, na-aga n'ihu na ndụ ya na ije ozi ya, ọnwụ ya na mbilite n'ọnwụ ya dị ka Onye Nzọpụta anyị, na n'ikpeazụ nguzobe na mmuba nke Nzukọ-nsọ Ya n'ụwa nile. Ozi nke nnwere onwe n’ime Kraịst site n’amara dị ka ekpughere ya na Agba Ọhụrụ na-emezu ma dochie mkpa nke emume nke Agba Ochie.

Nke abụọ, na n'ikwu okwu n'ozuzu, e nwere ụdị edemede atọ ị ga-ahụ na Agba Ochie na Agba Ọhụụ n'ime Akwụkwọ Nsọ:

Akaụntụ Akụkọ ihe Mere Eme – ihe odide nke na-akọ akụkọ eziokwu na-enye echiche dị mkpa akụkọ ihe mere eme nke ndị mmadụ na ihe omume dị mkpa.

Edemede Nkuzi – akwụkwọ na amaokwu nke na-enye nkuzi n'ọtụtụ akụkụ nke ndụ Ndị Kraịst, nhazi nke ụka na ihe gbasara onwe na ezinụlọ na-enyeghị nkọwa ụfọdụ akụkọ ihe mere eme nke ọma.

Edemede Mkpali – uri, edemede nka emebere iji gbaa ume, bulie na igosipụta mmetụta sitere n'aka onye ode akwụkwọ nye onye na-agụ ya.

Ihe odide Agba Ọhụụ nke na-enye Akụkọ Ihe Mere Eme na ndụ na ije-ozị Jizọs bụ Matiu, Mak, Luk na Jọn. A na-akpọkwa akwụkwọ anọ ndị a Oziọma. Akwụkwọ nke Ọrụ Ndị-Ozi bụ akwụkwọ akụkọ ihe mere eme ọzọ na agba ọhụụ nke na-akọwa nguzobe na mgbasawanye nke ụka Ndị Kraịst mgbe ọnwụ na mbilite n'ọnwụ Jizọs gasịrị.

Akwụkwọ Agba Ọhụụ nke na-anọchite anya Edemede Nkuzi bụ Ndị Rom site na Jud. Ndị a bụ akwụkwọ ozi sitere n'aka ndị isi ụka na-enye ndụmọdụ na ntụzịaka nye Ndị Kraịst ndị ọzọ na ụka dị n'ụwa.

Akwụkwọ Abụ Ọma nke Agba Ochie bụ ezigbo ihe atụ nke edemede mkpali. N’okpuru bụ mkpali sitere n’Abụ Ọma nke na-emesi anyị obi ike maka ngọzi nile nke Chineke na-enye ndị na-etinye Okwu Chineke n’ime ndụ ha mgbe nile.

“Kama n'iwu Jehova ka ihe-utọ-ya di; Ọ bu kwa n'iwu-Ya ka ọ nātughari uche ehihie na abali. Ọ gādi kwa ka osisi akuworo n'akuku iyi juputara na miri, Nke nāmi nkpuru-ya na mb͕e-ya, Ọzọ, akwukwọ-ya adighi-akpọnwu; Ihe ọ bula kwa nke ọ nēme, ọ nēme ka ọ ga nke-ọma.” Abu Ọma 1:2-3

Iji kụọ mkpụrụ nke Okwu Chineke ná ndụ anyị, ọ dị anyị mkpa ime ka ịgụ Akwụkwọ Nsọ bụrụ akụkụ nke omume anyị na-eme kwa ụbọchị. Dika mkpụrụ nke Okwu Chineke na-ami nkpụrụ na ndụ gị, ngọzi ya ga-apụta ìhè karịa. Ị ga-enweta ume site n'Okwu Ya iji kwado gị, ọbụna n'oge ụkọ mmiri ozuzo na ihe isi ike.

Okwu Chukwu

Ụbọchị 2Ụbọchị 4

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Akụ Gị Kacha Mma!

Inweta nloghachi gọziri agọzi na ụbara na-amalite site n'itinye ezigbo ego. Ọ bụrụ na ị bụ Onye Kraịst ọhụrụ, ọ dịghị ego ka ukwuu ị pụrụ itinye n’okwukwe gị karịa ịnara Okwu Chineke mgbe nile. Bido ebe a iji nyere gị aka ịgụ, ghọta na itinye ya nke ọma kwa ụbọchị. Ewepụtara site n'akwụkwọ a, “Site n’ụwa a; Akwụkwọ ntuziaka Ndị Kraịst maka Uto na Nzube” nke David J. Swandt dere.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Twenty20 Faith, Inc. maka ịnye atụmatụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://www.twenty20faith.org/devotion1?lang=ig
 

YouVersion na-eji kuki gasị iji hazie ahụmịhe gị. Site na iji webụsaịtị anyị eme ihe, ị na-anabata ojiji kuki anyị gasị dịka akọwara na Iwu Anyị Mebere Banyere Ihe Ndị Ahụ Gbasara Ndụ Ndị Mmadụ Nke Ha Na-Achọghị Ka Ọha Mara