Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

NzubeIhe Atụ

Nzube

ỤBỌCHỊ 1 NKE 3

Nzube Chineke maka Ihe Okike

Chineke abụghị onye na-ewu ụlọ agharaaghara. Ọ na-ebu ihe n’uche wee na-arụ Ya. Amaokwu a taa na-egosi anyị na e nwere nzube maka ihe niile dị n’okpuru eluigwe. O kwughị na e nwere nzube maka ihe ụfọdụ, kama ọ na-ekwu na e nwere nzube maka ihe niile.

Ọ bụrụ na O nwere nzube maka ihe niile, ya bụ na O nwere nzube maka gị. Chineke anaghị achọ ime ka Ị dabaa n’ihe O kere, o nwere nzube O bu n’obi wee kee gị. A kpachapụrụ anya kee gị maka nzube. Ọ bụrụgodị na ezinaụlọ gị, ndị enyi gị, ndị ikwu gị na onye ọbụla na-eche na ị bụ mmejọ, n'ime atụmatụ Chineke, ị dị mkpa. Akụkụ gị niile, ma ndị na-anaghị amasị gị, nwere nzube e ji kee ha. O mepụtara gị n’udi na I ga-adaba na nzube o ji wee kee gi. Ọ bụ ya mere ọ ji dị mkpa ka ị hụ onwe gị site n’anya Chineke ji ahụ gị karịa site n’anya mmadụ. Ịhụ onwe gị dị ka mmadụ si ahụ gị ga-eme ka ịhụta onwe gị dị ka onye erughi eru, anya Chineke ga-eme ka ịhụ nkọwa onwe gị kpọnkwem.

N’akwụkwọ Jenesis, anyị nwere ike ịhụ ihe Chineke bu n’obi wee kee mmadụ. Chineke ji aka ya kee ihe niile n’onwe ya. Ma, mgbe ọ na-achọ ike mmadụ, Ọ gbara mbọ ịke mmadụ site n’ịkpọ ndị ọzọ, ya bụ, ihe kpatara ... ka “anyị”, ma e jiri ya tụnyere etú O si kee ihe ndị ọzọ n’onwe ya. Naanị nke a na-egosi etú Chineke si kpachapụ anya kee mmadụ, nke bụ “Gị”. N’ihe nke a, ọ dị mma ịsị na Chineke ekeghị mmadụ naanị n’ihi na ọ dị Ya mkpa ịkè ihe. O mere nke a maka nzube dị mkpa.

Mgbe onye iro na-abịakwute gị ịgwa gị na amaghị ụma kee gị, kụchapụ ya ma tie mkpu n’oke olu na ABỤGHỊ M ONYE AMAGHỊ ỤMA KEE, ị ga-ahụ ka a na-anapụta gị n’echiche ahụ.

Ụbọchị 2

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Nzube

Onye ọbụla rụpụtara ihe nwere nzube o ji rụpụta nkà ọbụla. Chineke kere onye ọbụla maka atụmatụ na nzube pụrụ iche. Ihe mere e ji ebi ndụ bụ ịhụ na anyị n’ikpeazu na anyi mezuru nzube ya. Ihe ọmụmụ a na-achọ ikuzi isiokwu a n’ụzọ dị omimi.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Mount Zion Faith Ministry maka ịnye atụmatụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://mountzionfilm.org/