Ọhụrụ n’OkwukweIhe Atụ
Nnọọ n’Ezinaụlọ A!
Ị bụ onye ọhụrụ n’okwukwe? Nnọọ na ezinụlọ a!
Ọ dị mkpa ka ị ghọta ihe mere na ndụ gị.
Ekère mmadụ n’onyinyo na oyiyi nke Chineke mana ọ tara ahụhụ nkewa na nkwusị nke mkpakọrịta mgbe Adam mbụ mehiere megide Chineke. Chineke hụrụ anyị n’anya nke ukwuu ịhapụ anyị na mbibi ebighị ebi. O nwere atụmatụ maka mgbapụta anyị, atụmatụ sitere n’ịhụnanya nke na-enweghị atụ, atụmatụ nzọpụta; onyinye nke nzọpụta. Ọ mere ya site n’izite Ọkpara ọ mụrụ naanị ya ka ọ nwụọ maka anyị. Jizọs bịara n’oyiyi mmadụ ma bie ndụ n’enweghị mmehie. Ọ nọchite anya anyị, buru nmehie anyi n’agbanyeghị na O nweghị njọ, ma kwụghachi ụgwọ nke nmehie anyị nke bụ ọnwụ site n’ịnwụ n’obe.
Naanị ihe anyị ga-eme bụ ikwere na kwupụta mmehie anyị yana ikwupụta Jizọs dịka Onyenwe anyị, na-ahapụ mmehie anyị, ebe anyị nwere onyinye nke ndụ ebighị ebi. Ọ bụrụ na i mewo nke a, a ga-eweghachikwa gị oyiyi ahụ.
Onyinye nke nzọpụta eweterala gị mgbaghara. Chineke emeela ka mmehie gị dị anya n’ebe ị nọ, hichapụkwa mmebi iwu gị ka a ga-asị na I meghị ihe ọbụla. Ọ bụ mmụgharị. Ugbu a amụọla gị ọzọ! Ejikọkwaala gị na Chineke ka gị na Ya na-akpakọrịta ọzọ.
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Jizọs Kraịst bịara ịnwụ maka mmehie anyị ka anyị wee nwee ndụ ebighị ebi. Ọ bụ mmụgharị ya n’ime ndụ ọhụrụ. Ya mere, ọ dị mkpa na a ga-agwa onye kwenyere ọhụrụ uru na ọghọm, ihe o nwe na omenala nke ndụ ọhụrụ a.
More
Ọ ga-amasị anyị ikele Mount Zion Faith Ministry maka ịnye atụmatụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://mountzionfilm.org/