Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ọkpụkpọ oku Ndúzi Na-eje oziIhe Atụ

Ọkpụkpọ oku Ndúzi Na-eje ozi

ỤBỌCHỊ 4 NKE 5

Ndúzi Echekwara echekwa

Ọ dị mfe iche na onye ndu na onye ije ozi abụghị otu. Ma ọ bụrụ na anyị ga-edu ndú dị ka Jisọs, ọ ga-akacha mma ka anyị na-eje ozi otú o si jee. Onye ndú na-eje ozi buru ụzọ buru onye na-eje ozi tupu ọ bụrụ onye ndú. N’ụzọ na-akpali mmasị, n’akụkụ nke mbụ nke ozi ọma Mak, a kọwara Jisọs dị ka ohu nke chịrị achị, n’akụkụ nke ikpeazụ dị ka onye ọchịchị nke jere ozi.

Anyị enweghị ike ịnya isi maka nzọpụta anyị n’ihi na ọ bụ onyinye amara si n’aka Chineke. Otu amara ahụ kpọbatara anyị n’ime ozi ndúzi, ya mere anyị enweghị ike ịnya isi na nke ahụ. Nke a na-emegide echiche a na-enwekarị na ịbụ onye ndú bụ ọkwá e kwesịrị inweta. Tupu Jisọs amalite ije ozi ya n’ihu ọha, Nna ya gọziri ma kweta Jisọs site n’ikwu, sị, “Nke a bụ Ọkpara m, onye m hụrụ n’anya; ihe ya masịrị m.” (Matiu 3:17) Jisọs emebeghị nkwusa ma ọ bụ rụọ ọbụna otu ọrụ ebube, n’agbanyeghị nke ahụ, Chineke ji Ya kpọrọ ihe ma nakwere Ya kpam kpam. Ọ bụrụ na ị bụ nne ma ọ bụ nna, ị ga-ama na ị hụrụ ụmụ gị n’anya n’ihi na ha bụ nke gị; ị hụghị ha n’anya nanị mgbe ha na-akpa ezi àgwà. Ma eleghị anya, ọ na-adịkwa gị ka à ga-asị na ọ dị gị mkpa ime ihe n’ụkpụrụ ụfọdụ dị ka onye ndú iji nweta ihu ọma ma ọ bụ ịhụnanya Chineke. Mụta ịkọwara onwe gị na ị bụ nwa Chineke site na ọmụmụ, ọ bụghị site n’omume.

Na Luk 10, anyị na-ahụ na Mata nwetara nkwado n’ọrụ e kenyere ya, ebe Meri nwetara nkwado n’ụkwụ Jisọs. Ghọta na ọ bụ mmekọrịta mbụ, tupu ibu ọrụ. Dị ka onye ndú, ọrụ gị dị ka odibo bụ ọrụ, ọ bụghị utu aha, obughi kwa nleda anya.

Ozi Jisọs lekwasịrị anya n’inyere ndị ọzọ aka. O jere ozi ma duzie ndị mmadụ site na ibelata ahụhụ ha na ilekọta ọdịmma ha. N’ụzọ dị iche, ozi nke ọtụtụ ndị ndú Ndị Kraịst taa na-elekwasị anya n’onwe ha. Dị ka ihe atụ, e nwere mgbe Jisọs ji ogbe achịcha ole na ole na azụ̀ nye puku mmadụ ise nri. Taa, Ekwensu agbanweela ihe nlereanya ahụ, anyị nweziri ụlọụka ndị puku mmadụ ise na-enye otu onye nri: onye nkwusa ma ọ bụ onye ndú. N’ụzọ dị mwute, akụkọ ihe mere eme nke ụlọụka jupụtara n’ihe àmà na-egosi na ihe adịghị agwụcha nke ọma maka obodo ebe onye nkwusa bụ isi n’ọkwa ndị ndú. Kama nke ahụ, onye ndú bụ onye ji ikike eme ihe maka ọdịmma nke ndị nke Chineke. N’otu aka, onye ndu na-ebu mma agha nke Mmụọ nsọ iji lụso ndị iro Chineke ọgụ ma chebe ndị Ya. N’aka nke ọzọ, onye ndú na-eyi ákwà nke ịbụ ohu, dị njikere ịsa ụkwụ dị ka Jisọs mere.

Taa, chetara onwe gị onye ị bụ: ị bụ nwa Chineke. N’ihi ya, ọ nweghị ọrụ ọ bụla nwere ike ibelata ma ọ bụ welie uru gị n’ebe Ọ nọ. Ị na-ebu amara na otite mmanụ Chineke, n’ihi na e nwere agha ime mmụọ a ga-alụ maka ọdịnihu nke ndị nọ n’okpuru nlekọta gị. Ka ihe nile ị na-eme dị ka onye ndú na-eje ozi na-esite n’ebe nchebe di ukwuu n’ịhụnanya nke Nna gị nke Eluigwe, ka ihe nile i bu n’obi na-eje ozi ma na-edu ndú bụrụ maka ọdịmma nke ndị ọzọ.

Ụbọchị 3Ụbọchị 5

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Ọkpụkpọ oku Ndúzi Na-eje ozi

Akpọrọ anyị ka anyị n’edu dịka Jisọs mere. Iduzi na-amalite site na mmadụ, ọ bụghị ọkwa. Ebumnuche idu ndú bụ ịkwaga ndị Chineke n’ime nzube Ya. Ọgụgụ ndị a kwa ụbọchị ga-enyere gị aka ịtọ ntọala siri ike na ọnọdụ nduzi gị, na-echetara gị na tupu ị bụrụ onye ndu, ị bụ odibo, tupu ị bụrụ odibo, ị bụ nwa Chineke hụrụ n’anya.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Afrika Mhlophe maka ịnye atụmatụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://afrikam.co.za/