Gini Bụ Ezi Ịhụnanya? Igodo: aha aha?Ihe Atụ
Olee Otú Anyị Ga-Esi Eje Ije N’Ezi Ihụnanya?
Gịnị na-ewepụta ịhụnanya? Kedu otu anyị ga-esi ewepụ mmehie na ịhụ onwe anyị n'anya ma na-aga n'ihu n'ezi ịhụnanya?
Anyị agaghị enwe ike ime nke a ma anyị hapụ Ya ma ọ bụ ma anyị enweghị enyemaka Ya. Ọ di mfe itụfu uche ma ọ bụ Ihapụ ihe anyi na-eme. Ịhụnanya nke Kraịst na ozi-ọma bụ nanị olileanya anyị. Jizọs bịara bịe ndụ, nwụọ, e lie Ya, ma Ya E bilie ọzọ imeri mmehie, Ekwensu na ọnwụ. Ọkpara Chineke nke hụrụ anyị n’anya nyekwara onwe Ya maka anyị. Ọ dooro anyị ụzọ n’ịhụnanya Ya. "Onye-nwe-anyị Jizọs, achọrọ m ịga ije n'ịhụnanya a, nyere m aka ka m tinye olileanya m na ntụkwasị obi m niile n'ebe Ị nọ."
Ịgụ abụ nke ndị nsọ ochie nwere ike inyere anyị aka itinye uche anyị n'ime ọgụ a anyi na-alu. Anyị na-anụ ka obi ha na-aṅụrị ọṅụ n’ime Chineke, na-efe Ya, na-ebi ndụ nke ịdị nsọ, ma jiri obi ha niile, mkpụrụ obi ha niile, uche ha niile na ike ha niile hụ Ya n’anya. Tụlee ndepụta ndị a Isaac Watts dere n'abụ ya bụ "Teta Ịnụ Ọkụ N'Obi M, Teta Ịhụnanya M." Ọ̀ na-agụsi obi gị ike ịhụ Onye-nwe-anyị n'anya otú a?
Teta, inụ ọkụ n'obi m; teta, ihụnanya m,
Ijere Onye-nzọputa m ozi n'ebe a,
N'ọrụ nke ndi nsọ zuru oke n'elu
Na ndi-mmụọ-ozi di nsọ apughị iga.
Teta, mkpụrụ obi m, inye nri
Mkpụrụ obi nke agụụ na-agụ, na-iyikwasi ndị ogbenye uwe;
N'Eluigwe ọ dịghị onye nọ na mkpa,
Obi ha juru eju ruo mgbe ebighị ebi.
Bidata agụu nke anu ahu m, Mkpụrụ obi m!
Nọgidesie ike n'ọgụ, na-achụso ọrụ Chineke,
Kwa ụbọchị mụ na-achịkwa mmehie m na-ebili,
Na mmeri a na-adị ọhụrụ mgbe niile.
Ala nke mmeri dị n'elu,
Ọ dịghị ndị iro a ga-ezute n'ebe ahụ;
Onye-nwe-anyị, aga m na-emeri ruo mgbe m ga-anwụ,
Ma mechaa agha niile dị ebube.
Ka oge awa ọ bụla na-efe efe kwupụta
Ana m ewetara ozi ọma Gi aha ọhụrụ sara mbara;
Ma mgbe ndụ m na ọrụ m kwụsịrị,
Ka m nweta okpueze ahụ e kwere ná nkwa!
Iwere Eziokwu Tinye N'Obi: Họrọ akụkụ Akwụkwọ Nsọ nke ị ga-etinye n'obi iji mee ka uche gị dị ọhụrụ ma gbanwee obi gị.
Ime Ka Ịchọ Odinma Onwe Onye Nwụọ: Kedu ụdị mmehie kpọmkwem a na-ekwu na ndụ gị site na akụkụ Akwụkwọ Nsọ ị dere? Pọl na-agwa anyị kpọmkwem ka anyị yipụ onwe anyị ahu di ochie.
Iwepụta Eziokwu Ka Ọ Di Ndụ: Yikwasị Onwe Gị Onwe Ọhụrụ--Kraịst. Olee mgbanwe kpọmkwem dị mkpa ka i mee n'echiche gị ma ọ bụ n'àgwà gị ma ọ bụ n'omume gị iji na-edo onwe gị n'okpuru Ya ma tinye eziokwu Ya n'uche na n'obi gị?
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Onye ọ bụla chọrọ ịma ihe ịhụnanya bụ n'ezie. Ma ọ bụ mmadụ ole na ole na-ele ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru gbasara ịhụnanya anya. Ịhụnanya bụ otu n'ime isi okwu nke Akwụkwọ Nsọ na omume kacha mkpa nke ndụ Ndị Kraịst. Atụmatụ a sitere na Thistlebend Ministries na-enyocha ihe ịhụnanya pụtara na Akwụkwọ Nsọ na otu a ga-esi hụ Chineke na ndị ọzọ n'anya n'ụzọ ka nma. Igodo: gbasara gbasara.
More