Enwere M Ike Ịmeri Mmehie na Ọnwụnwa N'Ezie?Ihe Atụ
Ọ̀ Dị N'Ezie Ihe Ekere Eke Aha Ya Bụ Ekwensu?
Iji kparịta maka mmehie, anyị aghaghị ikwurịta banyere Ekwensu. Ọ gaghị ekwe omume ileghara ọrụ ya anya: obi gbawara agbawa na ezinụlọ ụlọ mebiri emebi, mmegbu, ọrịa, na omume rụrụ arụ. Ndepụta oru ọjọọ ya dị ogologo dịkwa mwute.
Ekwensu di adi n'ezie ma burukwa onye emeriri emeri. Ọ chọrọ ka ị kwenye na ihe ndi abụọ a abụghị eziokwu, mana nhọrọ bụ nke gị. A na m ekpe ekpere ka ihe ofufe a kpugheere gị eziokwu nke Chineke.
Ekwensu Di Adi
Ekwensu nwere ọtụtụ aha na Akwụkwọ Nsọ. Abụọ anyị maara nke ọma bụ “Setan” na “Devul.” Nke mbụ pụtara “onye ebubo” a na-ahụkwa ya ugboro iri atọ na anọ n’Akwụkwọ Nsọ—onye na-ebo anyị ebubo ma na-emegbu anyị. Devul ka ana achọta ugboro iri atọ na isii n’Agba Ọhụrụ nke pụtara n’ụzọ nkowa nkịtị “onye nkwutọ.”
A na-akpọkwa Ekwensu “agwọ ochie,” “dragọn,” na “ajọ onye.” Nkọwa nke Jizọs banyere ọrụ Ekwensu na Jọn 8:42–47 bụ nkọwa na-atụ egwu n’ezie.
Nke mbụ, Ekwensu na-ekwu na ọ bụ ya nwe mkpụrụ obi ọ bụla a na-azọpụtabeghị.
Na Jọn 8, Onye-nwe-anyị kwuru maka ndị iro Ya na ha dị ka ụmụ nke Ekwensu bụ “nna” ha (v. 44). Ọ bụ “chi nke oge a” (2 Ndị Kọrint 4:4), “onyeisi nke ụwa a” (Jọn 12:31) onye na-achịkwa ọgbọ a dara ada (1 Jọn 5:19). Ndị Kraịst bi n’ụwa Ekwensu na-achị. Anyị bụ ndị agha eguzobere n'ala ndị iro, bi n'ime obodo eji eji.
Nke abụọ, ekwensu na-ekpuchi uche anyị ka anyị ghara ịhụ eziokwu.
Ọ bụ “onye ụgha na nna ụgha” (Jọn 8:44). Nke a bụ ihe mere onye ahu nke na anatabeghi Mmụọ Nsọ apughi ighota ihe nke Chineke (1 Ndi Korint 2:14). Ekwensu chọrọ ịnapụ mkpụrụ nke okwu n’obi ndị ọ kacha di mkpa (cf. Matiu 13:1–9).
Nke atọ, Ekwensu na-agha ụgha banyere okwu Chineke.
Site na Jenesis 3 ruo ugbu a, ọ na-emegharị eziokwu nke Akwụkwọ Nsọ iji duhie anyị. Onye ahụ nke kwuru ihe di n'Akwukwo Nso mgbe ọ na-anwa Jizọs (Matiu 4:1–11) ga-ejikwa okwu Chineke n'ụzọ n'adighị nma iji duhiekwa anyị. Ọ bụghị ihe niile anyị nụrụ a na-akụzi ka eziokwu nke Chineke bụ eziokwu. Onye iro anyị nwere ike na-ekwuputa ihe ndi edere n'Akwụkwọ Nsọ karịa ka anyị nwere ike, mana nke a bụ iji mejupụta ihe ọjọọ mgbe niile.
Nke anọ, ekwensu bụ “onye ogbu mmadụ site na mmalite” (Jọn 8:44).
Ekwensu bụ ọdụm na-eme mkpọtụ, na-achọ onye ọ ga-eripịa (1 Pita 5:8). Ndị na-ejere ya ozi na-alụso ibe anyị na ndị ọzọ ọgụ n'ụzọ anụ ahụ́, nke mmetụta uche, na nke mmekọahụ di ezigbo mwute. Nna ha ukwu achọghi ihe ọbula na-abughi mbibi nke agbụrụ mmadụ niile na karịsịa ndị nke Chineke.
Nke ise, Ekwensu na-achị ndị mmụọ ọjọọ.
Ha na-ejere ya ozi dị ka ndi na aruru ya oru na ndị agha ya ndi n'azo ụkwụ n'ala n’agha ya na-aga n’ihu nke mmegide Onye-nwe-anyị na ụmụ Ya.
N’eziokwu banyere ihe ndi anyi n'ekwu, Ekwensu na-emegide Chineke.
Na Jọn 8, ọ bu ya kpaliri ndị ndú okpukpe ka ha chọọ ọnwụ Jizọs. Ọ mechara duo ha ka ha kpọgide Onye-nwe-anyị n’obe.
Ekwensu bụ ihe mmegide nye Chineke n’ụzọ niile:
- Onye-nwe-anyị bu ìhè; Ekwensu bụ ọchịchịrị.
- Chineke bu ọku nsọ, na-ēripia eripia; ekwensu di mmehie, di mmejụsi oyi, di nrịa ọrịa.
- Chineke bụ Mmụọ; Ekwensu bụ anụ ahụ na-adịghị nsọ.
- Chineke hụrụ gị n'anya; Ekwensu kpọrọ gị asị.
- Chineke nyere Ọkpara Ya n'ihi gị; Ekwensu ga-anara gị mkpụrụ obi gị.
- Chineke bụ Nna gị; ekwensu bu onye iro gi.
Ekwensu dị adị, ma echefukwala: ọ bụkwa onye emeriri emeri.
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Ị jụtụla onwe gị sị, “Gịnị mere m ka ji na-agba mgba megide mmehie ahụ?” Ọbụna Pọl onyeozi kwuru nnọọ ná Ndị Rom 7:15, sị: “Anaghị m eme ihe m chọrọ, kama ana m eme kpọmkwem ihe m kpọrọ asị.” Olee otú anyị ga-esi kwụsị mmehie ka ọ hara ịkwụsị ndụ ime mmụọ anyị? Ọ ga-ekwekwadi omume? Ka anyị tụlee mmehie, ọnwụnwa, Ekwensu, na n'ime obi ekele, ịhụnanya Chineke.
More