Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ibido Mmekọrịta Gina JizọsIhe Atụ

Beginning A Relationship With Jesus

ỤBỌCHỊ 1 NKE 7

"Iwu na. Mmekọrịta"

Ọ bụrụ n’inyocha ngwa ngwa iji kọwaa nkọwa nke Iso zọ Kraịst, ị nwere ike ị ga-achọta ihe gbasara “ịgbaso nkuzi nke Jizọs.” Nke ahụ bụkwa eziokwu — Iso zọ Kraịst bụ ịgbaso nkuzi Jizọs. Nsogbu a bụ na ọtụtụ ndị mmadụ na - atụgharị '' ịgbaso Jizọs '' banye ' ịgbaso iwu ' - mana nke ahụ abụghị isi okwu.

Akụkọ nke Akwụkwọ Nsọ mere ka o doo anya na isi ihe ịmara Jizọs bụ maka mmekọrịta, ọ bụghị iwu. Ka ị na-amalite ịchọpụta ihe Chineke na-agwa anyị gbasara onwe ya site na Akwụkwọ Nsọ, ị ga-achọpụta na ịnọ na mmekọrịta ịhụnanya, na mmekọrịta nke gị na Ya bụ isi ihe.

Ikwu na isi okwu banyere Iso zọ Kraịst bụ ịgbaso isi nkuzi dịka ịsị na isi okwu gbasara ịlụ di na nwunye bụ ịkwụ ụgwọ ụlọ gị. Ọbụghị kpọmkwem ihe anyị tụrụ anya ya na nnukwu akụkọ ịhụnanya!

Echiche a nke iwu na mmekọrịta dị n'etiti bụ oke nkewa na-ekewa Iso zọ Kraịst na okpukpe ndị ọzọ. N'ebe ọtụtụ okpukpe na-akụzi na ụzọ 'ịdị mma' bụ site n'omume ndị a chọrọ na nkwenye siri ike, Iso zọ Kraịst na-esi ebe dị iche.

N'oge ochie, a maghị ụmụazụ Jizọs maka ịgbaso iwu ma ọ bụ “ịdị mma.” Ihe rapuworo — ihe ekwesiri ka ekwuputa - bu n'ezie ihe ha mere na ha na Jisos “diri (Olu 4:13). Ọ bụghị na ha kwenyere Jizọs, ọ bụghị na ha gbasoro usoro omume Jizọs, kama na ha “nọnyeere” Ya.

ị nọnyere Jizọs bụ ihe gbanwere ndị a site n'ihe Akwukwo Nso kpọrọ 'ndị agụghị akwụkwọ, ndị nkịtị' ka ha bụrụ ndị ndu nwere obi ike. Nke ahụ bụkwa otu eziokwu ahụ a na-enye anyị mgbe Jizọs kpọrọ anyị ka anyị baa n'ime mmekọrịta: ka anyị "nọnyere Ya."

Ụbọchị 2

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Beginning A Relationship With Jesus

Ikana ebido okwukwe ohuru n'ime Jizọs Kraịst? Ina acho imatakwu nhe gbasara ofufe Kraịst ma imahi otu na obu nhe iga aju? Mgwa bido ebe a. Mweta n'akwukwo "bido ebe a" nke David Dwight na Nicole Unice dere.

More

Anyi ga acho ikele David Dwight,Nicole Unice na David C Cook maka iweputa nhazia. Maka nhe ndi ozi bara uru, biko hu:http://www.dccpromo.com/start_here/