Ministrị Nke Èmém Na Àdím Mma N'ogo Kasị OgoIhe Nhụchatụ

Ịdị Ogo Kasinụ N'èmém Ihe Niile
Otu n'ime nkọwa kacha amasị m banyere Jizọs siterè na Mak 7: 37 ebe o na-ekwu, "O jurù ndị mmadụ anya. ‘Ya [Jizọs] emewo ihe nile nke ọma.'" Dị ka ndị na-eso ụzọ Kraịst, akụkọ Akwụkwọ Nsọ a kwesịrị ime ka anyị kwụsịtụ ma chee ezigbo echiche. Dị ka ndị na-achọ inomi Jizọs n’ụzọ ọbụla a pụrụ̀ ichè, ànyị pụrụ̀ ikwu na anyị na-eme ihe nile nke ọma? Ànyị è nwerè ike isi na anyị na-eme ihe niile nke ọma n’ebe ọrụ-aka anyị dị̀ mà ọ bụ n'ezinụlọ anyị?
Nke bụ́ eziokwu bụ na anyị nile nwerè akụkụ nke ndụ anyị ebe anyị na-adà n'igosipụta omume-ihe n'ụzọ kachasị mma dị ka Jizọs. Nke a bụ eziokwu taa karịa mgbe ọ bụla. N'ihi gịnị? N'ihi na ugbu a karịa mgbe ọ bụla, anyị kwenyerè na-asi jụrụ ụwa a, na anyị gà-eme ihe niile dị adị, bụrụ ihe niile akpịrị obi anyị chọrọ, ma nwee ihe niile anya anyị dakwasịrị na ya. Anyị nà-emebiga ihe ókè, na-echegbu onwe anyị, nke na-akpata obere ọganihu n'ime ọtụtụ ihe anyị n'eme n'ihi na anyị adịghị aghọta ihe dị mkpa site na ihe ndị na-adịghị mkpa n'ọrụ anyị ma n'ezinụlọ anyị. Nke a bụ ụzọ nsogbụ, ọ bụghị nke ọdị̀ mma, mà ngà asi n'ọbụ ọrịa na-efe efè na Ụka Kraịst nke taa.
Gịnị merè nke a kwesịrị iji gbasa anyị? Ọ bụ n'ihi na ihe ọ bụla n'erughị ogo ịdị mma nke kwesịrị ịdị ná ndụ ndị Kraịst bụ̀ nnukwu ọdịda. Pọl na 1 Kọrịnt 10:31, sị: “Ya merè, ma unu nà-eri ihe ma unu nà-aṅụ ihe ọṅụṅụ ma ọ bụ ihe ọ bụla unu nà-eme, na-emenụ ha niile ka e wee nye Chineke otuto." Nnukwu Pastọ nwụrụ anwụ Dr. James Kennedy nyerè ndị ụka ya nkọwa site n'akụkụ Akwụkwọ Nsọ a, na-akwali ha ka ha bie ndụ “ika mma n'ihe niile na iji ihe niile nye Chineke otuto.” Nke ahụ bụ ogo na ọkwá a n'akpọ anyị òkù ka anyị rigoro na bie ndụ.
E nwerè ọtụtụ ezi ihe mere anyị gà-eji na-achụso ịdị mma kasị elu n'ihe niile, ọkachasị n'ọrụ anyị họọrọ. Ịdị mma n'ụzọ kasị elu n'ọrụ anyị na-eme ka ọrụ anyị na-aga n'ihu, na-eme ka anyị nwee mmeri n'ụwa, na-enye anyị nnabata n'obi na n'anya ndị mmadụ nke nwere ike iduga n'ohere ikesa Oziọma nke Kraịst. Mana ihe ndị a niile dị́ mma ekwesịghị ịbụ mkpali-mbụ nke obi anyị iji wee rụọ ọrụ anyị ma ọ bu ihe ọbụla Chineke kpọrọ anyị ka anyị n'arụ na ndụ anyị. Anyị na-achụso ịdị mma n'ọrụ n'ogo kasinụ maka nnukwu ebumnuche a karịa— n'ihi na ịdị mma n'ọrụ n'ogo kasịnụ bụ otú anyị pụrụ isi egosipụta àgwà nke Kraịst na ịhụnanya na ijere ndị agbata obi anyị ozi dịka onwe anyị. N'ikwu ya n'ụzọ ọzọ, ịdị mma n'ihe ọbụla n'ogo kasinụ bụ ụdị ministrị anyị n'eme kacha mkpa kwa ụbọchị. Dị ka anyị gà-ahụ n'ime ụbọchị abụọ na-abịa, ọ bụ site na ministrị nke ịdị mma n'ihe ọbụla n'ogo kasinụ ka anyị na-enye Chineke otuto ma hụ ndị ọzọ n'anya nke ọma site n'ọrụ anyị.
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

E nwerè ọtụtụ ezi ihe dị na anyị ịchụso ịdị mma n'ogo kasị ogo n'ọrụ anyị: Imé ihe ọbụla otú a nà-akwalite àgám-ihu ọrụ anyị họọrọ ịrụ na ndụ, ọ na-enye anyị ụba nke ọmụma mara mma na dị ogo n'ebe ndị mmadụ nọ, ma nwee ike iduga n'ohere gasị iji kesaa Oziọma. Ma dị ka atụmatụ ihe ọgụgụ a dị ụbọchị atọ gà-egosi, anyị kwesịrị ịchụso ịdị mma n'ogo kasị ogo maka ihe dị mkpa karịa—n'ihi na ịdị mma n'ogo kasị ogo bụ̀ ụzọ kachasịnu anyị si egosipụta àgwà nke Chineke na ịhụnanya na ilekọta ndị agbata obi anyị dịka onwe anyị site n'ọrụ anyị họọrọ.
More