ABÙ ỌMA 78:40-72
ABÙ ỌMA 78:40-72 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ọtụtụ oge ka ha nupuru isi megide ya nʼọzara; ha kpasuru ya iwe nʼala ahụ tọgbọrọ nʼefu. Mgbe mgbe, ha nwara Chineke; ha kpasuru Onye Nsọ nke Izrel iwe. Ha echetaghị ike ya, ụbọchị ahụ ọ gbapụtara ha site nʼaka ndị na-emegbu ha; nʼụbọchị o gosipụtara ihe ịrịbama niile nʼala Ijipt, ọrụ ebube ya niile nʼọhịa Zoan. O mere ka osimiri ha niile ghọọ ọbara. Ha enwekwaghị ike ịṅụ mmiri si na ha. O zigakwara igwe ijiji nʼetiti ha, nke tara ha, zitekwa awọ nʼala ha, nke bibiri ha. O zitekwara ụmụ ụkpana ndị tachapụrụ mkpụrụ a kụrụ nʼubi ha, zitekwa igurube nke ripịara ihe niile a gaara eweta dịka ihe ubi. O ji oke mkpụrụ mmiri mebie osisi vaịnị ha, jirikwa igirigi jụrụ oke oyi bibie osisi sikamọ ha niile. O weere ehi ha niile nyefee mkpụrụ mmiri, werekwa anụ ụlọ ha nyefee amụma egbe eluigwe. O zipụrụ iwe ọkụ ya nʼetiti ha, oke iwe ya, na iwe ya, na mmeso nke iwe ya, ndị mmụọ ozi na-ebibi ihe na-eleghị anya nʼazụ. O doziri ụzọ nke iwe ya ga-eso; o gbochighị ka ha ghara ịnwụ; kama o nyefere ndụ ha nʼaka ọrịa na-efe efe. O tigburu nwa ọbụla e bụ ụzọ mụọ nʼala Ijipt, mkpụrụ mbụ nke ndị ikom nʼime ụlọ ikwu Ham. Ma o dupụtara ndị nke ya dịka igwe atụrụ; o duuru ha dịka atụrụ gafee ọzara. O duuru ha nʼudo, ụjọ atụkwaghị ha, ma osimiri kpuchigidere ndị iro ha. Otu a ka o si duru ha bịaruo nʼoke ala nsọ ya, ala ugwu ugwu ahụ nke aka nri ya nwetara. Ọ chụpụrụ mba niile nʼihu ha, tụọ ala ha kesara ha dịka ihe nketa; o mere ka ebo niile nke Izrel biri nʼụlọ nke aka ha. Ma ha nwara Chineke ọnwụnwa, nupu isi megide Onye kachasị ihe niile elu; ha edebeghị ụkpụrụ ya. Dịka nna nna ha, ha bụ ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi, na ndị aghụghọ, ha dịka ụta a na-ekweghị nke ọma. Nʼihi ebe nchụaja ha wuru, ha mere ka iwe wee ya; sitekwa nʼarụsị ha pịrị apị, ha kpaliri ekworo ya. Mgbe Chineke nụrụ ha, iwe were ya nke ukwuu. Ọ jụrụ ndị Izrel kpamkpam. Ọ gbakụtara ụlọ nzute ya nke dị na Shaịlo azụ, ụlọ ikwu ahụ ọ mara nʼetiti ndị mmadụ. O nyefere igbe ọgbụgba ndụ ike ya ka a dọta ya nʼagha, o nyefekwara onye iro ahụ ebube ya nʼaka. O kwere ka e gbuo ndị ya nʼagha; iwe ya dị ọkụ megide ihe nketa ya. Ọkụ repịara ụmụ okorobịa ha, ọ dịkwaghị onye a gụụrụ egwu ọlụlụ di na nwunye, nʼetiti ụmụ agbọghọ ha; E gburu ndị nchụaja ha nʼagha; ndị inyom ha ndị di ha nwụrụ enwekwaghị ike iru ụjụ. Mgbe ahụ, onyenwe anyị tetara dịka onye si nʼụra teta, dịka dike si nʼụra mmanya teta. Ọ chụghachiri ndị iro ya azụ, mee ha ihe ihere nke ga-adịgide ruo ebighị ebi. Ọ jụrụ ụlọ ikwu Josef, ọ họpụtaghị ebo Ifrem; ma ọ họọrọ ebo Juda, na ugwu Zayọn, nke ọ hụrụ nʼanya. O wuru ụlọnsọ ya ka ọ dị ka ebe dị elu, dịka ụwa nke o mere ka o guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi. Ọ họpụtara Devid, ohu ya, kpọrọ ya site nʼọgba igwe atụrụ; o si nʼebe ọ nọ na-azụ atụrụ kpọrọ ya, ka ọ bịa bụrụ onye na-azụ ndị ya Jekọb, na Izrel, ihe nketa ya dịka atụrụ. Devid ji izuoke nke obi ya zụọ ha, aka nke maara ihe ọ na-eme ka o ji duo ha.
ABÙ ỌMA 78:40-72 Bible Nso (IGBOB)
Ùb͕ò ole ka ha nānupu isi n'okpuru Ya n'ọzara? Ùb͕ò ole ka ha nēme ka o wuta Ya n'ala tọb͕ọrọ n'efu? Ha we chigharia, we nwa Chineke, Ọ bu kwa Onye nsọ nke Israel ka ha kpasuru iwe. Ha echetaghi aka-Ya, Ubọchi mb͕e Ọ b͕aputara ha n'aka onye-nkpab͕u. Otú O tiyere ihe-iriba-ama-Ya nile n'Ijipt, Tiye kwa ihe-ebube-Ya nile n'ọhia Zoan; O we b͕anwe osimiri Nail nile ha ka ha ghọ ọbara, Ha adighi-aṅu kwa miri-ha nērù erù. Ọ nēzite odudu n'etiti ha, nke nātab͕u ha; Ọ nēzite kwa awo, nke nēbibi ha. Ọ nye-kwa-ra ọbubu ihe-omume-ha, Nye kwa igurube ihe ha dọb͕uru onwe-ha n'ọlu inweta. O nēji ákú-miri-ígwé b͕u osisi vine nile ha, Ji kwa frost b͕u osisi sycomore nile ha. O mechibido-kwa-ra anumanu-ha nye ákú-miri-ígwé, Mechibido kwa anu-ulo nile ha nye àmùmà di ọku. Ọ nēzite ọnuma nke iwe-Ya n'etiti ha, Nrubiga-ókè-iwe, na iwe, na nkpab͕u, Bú ozìzì nke ndi-mọ-ozi nke ihe ọjọ. Ọ nēme ka uzọ di lari bayere iwe-Ya; O b͕ochighi nkpuru-obi-ha n'inwu ọnwu, Kama O mechibidoro ndu-ha nye ajọ ọria nēfe efe; O we tib͕ue nwa ọ bula eburu uzọ mu n'Ijipt, Bú nkpuru mbu nke ume-ha n'ulo-ikwū nile nke Ham: O we me ka ndi-Ya bulie ije dika ìgwè ewu na aturu, Ọ nēdu kwa ha n'ozara dika ìgwè aturu. O we nēdu ha n'ikwesi-ntukwasi-obi, ha atughi kwa oké egwu: Ma ndi-iro-ha, oké osimiri kpuchiri ha. O we me ka ha biarue ókè-ala nsọ Ya, Rue ugwu a nke aka-nri-Ya nwetara. Ọ chupu-kwa-ra mba nile n'iru ha, We me ka ala ha barue ndi ya aka n'ala nketa e ji údò tua, O we me ka ebo nile nke Israel biri n'ulo-ikwū-ha. Ma ha nwara Chineke Nke kachasi ihe nile elu, ha we nupu isi n'okpuru Ya, Ha edebeghi kwa ihe-àmà-Ya nile; Kama ha laghachiri azu, we ghọb͕ue nghọb͕u dika ndi bu nna-ha: Ha riri mpe dika uta nāghọ aghughọ. Ha we were ebe nile ha di elu kpasue Ya iwe, Were kwa arusi nile ha apiri api me ka O kwo ekworo. Chineke nuru nka, O we webiga iwe ókè, Jusie Israel ike: O we rapu ebe-obibi nke Shailo, Bú ulo-ikwū nke O mere ka o biri n'etiti madu; O we were ike-Ya nye ka adọta ya n'agha, Were kwa ima-nma-Ya nye n'aka onye-nkpab͕u. O mechibido-kwa-ra ndi-Ya nye n'aka mma-agha; Ọ bu kwa ihe-nketa-Ya ka O webigara iwe-ókè megide. Ọku ripiara umu-okorọbia-ha; Etoghi kwa umu-ab͕ọghọ-ha nāmaghi nwoke n'abù ọlulu-di. Ndi-nchu-àjà-ha dara site na mma-agha; Ndinyom-ha di ha nwuru adighi-akwa kwa ákwá. Onye-nwe-ayi we teta dika onye nāraru ura, Dika dike nke nēti nkpu nke-uku site na manya-vine. O we tib͕ue ndi-nkpab͕u-Ya n'azu: Ita-uta ebighi-ebi ka O nyere ha. Ọzọ, Ọ juru ulo-ikwū nke Josef, Ọ bughi kwa ebo Efraim ka Ọ rọputara; Kama Ọ rọputara ebo Juda, Rọputa ugwu Zaion, nke Ọ huru n'anya. O we wue ebe nsọ Ya dika ebe di elu, Dika uwa nke Ọ tọrọ ntọ-ala-ya rue mb͕e ebighi-ebi. Ọ rọputa-kwa-ara Devid, bú orù-Ya, O we si n'ogige ìgwè ewu na aturu kuru ya: O mere ka o si n'iso nne-aturu nke nēnye umu-ha ara bia, Izù Jekob, bú ndi-Ya, na Israel, bú ihe-nketa-Ya, dika aturu. O we nāzù ha dika izu-okè nke obi-ya si di; Were kwa ihe-nghọta nile nke ọbu-aka-ya abua nēdu ha.