Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ABÙ ỌMA 78

78
Maschil Esaf.
1Ndim, ǹanu nti n'iwum:
Tọnu nti n'ala inu okwu nile nke ọnum.
2M'gāsaghe ọnum n'itu ilu:
M'gēkwuwa okwu-omimi di iche iche n'uba, bú nke sitere na mb͕e ochie:
3Nke ayi nuworo mara kwa,
Nke nna-ayi-hà kọwo-kwa-ra ayi.
4Ayi agaghi-ezonari ha na nti umu-ha,
Nākọrọ ọb͕ọ nke gādi n'iru akukọ otuto nile nke Jehova,
Na ike-Ya, na oké ọlu-Ya nile nke Ọ luworo.
5O we me ka otù ihe-àmà guzosie ike nime Jekob,
O do-kwa-ra iwu n'Israel,
Nke O nyere nna-ayi-hà n'iwu,
Ime ka umu-ha mara ha:
6Ka ọb͕ọ nke gādi n'iru we mara, bú umu agāmu;
Ha gēbili, we kọro umu-ha akukọ ahu:
7Ka ha we tukwasi obi-ha na Chineke,
Ghara ichezọ omume nile nke Chineke,
Ma debe ihe nile O nyere n'iwu:
8Ghara kwa idi ka ndi bu nna-ha,
Ndi bu ọb͕ọ nēwezuga onwe-ha nke nānupu kwa isi;
Ọb͕ọ ndi nēdozighi obi-ha,
Ndi mọ-ha nēkwesighi ntukwasi-obi n'ebe Chineke nọ.
9Umu Efraim, ọ bu ezie na ha nāchi ihe-agha nēbuli kwa uta,
Ma ha chighariri n'ubọchi agha.
10Ha edebeghi ọb͕ub͕a-ndu Chineke,
Ma ha juru ijeghari n'iwu-Ya;
11Ha we chezọ omume-Ya nile,
Na oké ọlu-Ya nile nke O mere ka ha hu.
12N'iru ndi bu nna-ha ka Ọ luru oké ọlu,
N'ala Ijipt, n'ọhia Zoan.
13O kewara oké osimiri, we me ka ha gabiga;
O me-kwa-ra ka miri guzo ọtọ dika obo-ihe.
14O ji-kwa-ra igwe-oji edu ha n'ehihie,
Ji kwa ìhè ọku edu ha ogologo abali nile.
15Ọ nākpọwa oké nkume di iche iche n'ọzara,
We me ka ha ṅua miri ri nne dika o si nime ob͕u-miri puta.
16O me-kwa-ra ka miri nke nērù erù si na nkume di elu puta,
O we me ka miri nērùda dika ọtutu osimiri.
17Ma ha nọ nēmehie kwa ọzọ imegide Ya,
Inupu isi n'okpuru Onye kachasi ihe nile elu n'ala kpọro nku.
18Ha we nwa Chineke n'obi-ha
N'iriọ ihe-oriri nye ọchichọ-nkpuru-obi-ha.
19Ha we kwue okwu megide Chineke;
Ha siri, Chineke, Ọ̀ puru ido table n'usoro n'ọzara?
20Le, O tiri oké nkume ihe, miri we nērù erù,
Isi-iyi di iche iche nērubiga kwa ókè;
Ọ̀ di kwa achicha Ọ puru inye?
Ọ̀ gēdoziri ndi-Ya anu?
21N'ihi nke Jehova nuru, O we webiga iwe ókè:
Ewe kponwue ọku megide Jekob,
Ọzọ kwa, iwe kwugoro elu dika anwuru-ọku imegide Israel;
22N'ihi na ha ekweghi na Chineke,
Ha atukwasighi kwa obi-ha na nzọputa-Ya.
23O we nye mbara-ígwé nile n'elu iwu,
Meghe kwa ọnu-uzọ nile nke elu-igwe;
24O we me ka manna zokwasi ha dika miri, ka ha rie,
Ọ bu kwa ọka nke elu-igwe ka O nyere ha.
25Nri nke ndi di ike ka madu riri:
O zitere ha ihe ha gēriju afọ.
26O nēme ka ifufe Iru-anyanwu bulie ije n'elu-igwe:
O ji-kwa-ra ike-Ya duru ifufe Ndida.
27O we me ka anu zokwasi ha dika ájá,
Ọbuná dika ájá oké osimiri, bú anu-ufe nwere nkù:
28O we me ka ọ da n'etiti ọmuma-ulo-ikwū-ha,
Buruburu ebe-obibi-ha nile.
29Ha we rie, afọ we ju ha nke-uku;
Ọ bu kwa ihe ha nāchọsi ike ka Ọ nēme ka ọ biarue ha aru.
30Ha abughi ndi ala ọzọ n'ebe ihe ha nāchọsi ike di,
Ihe-oriri-ha nādi ha n'ọnu,
31Mb͕e iwe Chineke kwugoro elu dika anwuru-ọku imegide ha,
We b͕ue ufọdu n'etiti ndi-ha nke mara abuba,
Ọ bu kwa umu-okorọbia nke Israel ka o mere ka ha ruru ala.
32N'ihe a nile ha mehie-kwa-ara ọzọ,
Ha ekweghi kwa n'oké ọlu-Ya nile.
33O we me ka ubọchi nile ha gwusia n'otù nku-ume,
O me-kwa-ra ka arọ nile ha gwusia n'obi-ọlulọ-miri.
34Ọ buru na O b͕uru ha, ha we chọ Ya:
Laghachi kwa, chọsie Chineke ike.
35Ha we cheta na Chineke bu oké nkume-ha,
Cheta kwa na Chineke Nke kachasi ihe nile elu bu Onye-nb͕aputa-ha.
36Ha we ji ọnu-ha nārà Ya,
Ji kwa ire-ha nāgwa Ya okwu-ugha.
37Obi-ha eguzosighi kwa ike n'ebe Ọ nọ,
Ha ekwesighi kwa ntukwasi-obi n'ọb͕ub͕a-ndu-Ya.
38Ma Ya onwe-ya, ebe O nwere obi-ebere, Ọ nēkpuchi ajọ omume-ha, Ọ dighi-ebibi kwa ha:
E, ọtutu mb͕e ka O mere iwe-Ya ka ọ laghachi azu,
Ọ dighi-akpọte kwa ọnuma-Ya nile.
39O we cheta na anu-aru ka ha bu;
Ifufe nke nālafe alafe, we ghara ilaghachi.
40Ùb͕ò ole ka ha nānupu isi n'okpuru Ya n'ọzara?
Ùb͕ò ole ka ha nēme ka o wuta Ya n'ala tọb͕ọrọ n'efu?
41Ha we chigharia, we nwa Chineke,
Ọ bu kwa Onye nsọ nke Israel ka ha kpasuru iwe.
42Ha echetaghi aka-Ya,
Ubọchi mb͕e Ọ b͕aputara ha n'aka onye-nkpab͕u.
43Otú O tiyere ihe-iriba-ama-Ya nile n'Ijipt,
Tiye kwa ihe-ebube-Ya nile n'ọhia Zoan;
44O we b͕anwe osimiri Nail nile ha ka ha ghọ ọbara,
Ha adighi-aṅu kwa miri-ha nērù erù.
45Ọ nēzite odudu n'etiti ha, nke nātab͕u ha;
Ọ nēzite kwa awo, nke nēbibi ha.
46Ọ nye-kwa-ra ọbubu ihe-omume-ha,
Nye kwa igurube ihe ha dọb͕uru onwe-ha n'ọlu inweta.
47O nēji ákú-miri-ígwé b͕u osisi vine nile ha,
Ji kwa frost b͕u osisi sycomore nile ha.
48O mechibido-kwa-ra anumanu-ha nye ákú-miri-ígwé,
Mechibido kwa anu-ulo nile ha nye àmùmà di ọku.
49Ọ nēzite ọnuma nke iwe-Ya n'etiti ha,
Nrubiga-ókè-iwe, na iwe, na nkpab͕u,
Bú ozìzì nke ndi-mọ-ozi nke ihe ọjọ.
50Ọ nēme ka uzọ di lari bayere iwe-Ya;
O b͕ochighi nkpuru-obi-ha n'inwu ọnwu,
Kama O mechibidoro ndu-ha nye ajọ ọria nēfe efe;
51O we tib͕ue nwa ọ bula eburu uzọ mu n'Ijipt,
Bú nkpuru mbu nke ume-ha n'ulo-ikwū nile nke Ham:
52O we me ka ndi-Ya bulie ije dika ìgwè ewu na aturu,
Ọ nēdu kwa ha n'ozara dika ìgwè aturu.
53O we nēdu ha n'ikwesi-ntukwasi-obi, ha atughi kwa oké egwu:
Ma ndi-iro-ha, oké osimiri kpuchiri ha.
54O we me ka ha biarue ókè-ala nsọ Ya,
Rue ugwu a nke aka-nri-Ya nwetara.
55Ọ chupu-kwa-ra mba nile n'iru ha,
We me ka ala ha barue ndi ya aka n'ala nketa e ji údò tua,
O we me ka ebo nile nke Israel biri n'ulo-ikwū-ha.
56Ma ha nwara Chineke Nke kachasi ihe nile elu, ha we nupu isi n'okpuru Ya,
Ha edebeghi kwa ihe-àmà-Ya nile;
57Kama ha laghachiri azu, we ghọb͕ue nghọb͕u dika ndi bu nna-ha:
Ha riri mpe dika uta nāghọ aghughọ.
58Ha we were ebe nile ha di elu kpasue Ya iwe,
Were kwa arusi nile ha apiri api me ka O kwo ekworo.
59Chineke nuru nka, O we webiga iwe ókè,
Jusie Israel ike:
60O we rapu ebe-obibi nke Shailo,
Bú ulo-ikwū nke O mere ka o biri n'etiti madu;
61O we were ike-Ya nye ka adọta ya n'agha,
Were kwa ima-nma-Ya nye n'aka onye-nkpab͕u.
62O mechibido-kwa-ra ndi-Ya nye n'aka mma-agha;
Ọ bu kwa ihe-nketa-Ya ka O webigara iwe-ókè megide.
63Ọku ripiara umu-okorọbia-ha;
Etoghi kwa umu-ab͕ọghọ-ha nāmaghi nwoke n'abù ọlulu-di.
64Ndi-nchu-àjà-ha dara site na mma-agha;
Ndinyom-ha di ha nwuru adighi-akwa kwa ákwá.
65Onye-nwe-ayi we teta dika onye nāraru ura,
Dika dike nke nēti nkpu nke-uku site na manya-vine.
66O we tib͕ue ndi-nkpab͕u-Ya n'azu:
Ita-uta ebighi-ebi ka O nyere ha.
67Ọzọ, Ọ juru ulo-ikwū nke Josef,
Ọ bughi kwa ebo Efraim ka Ọ rọputara;
68Kama Ọ rọputara ebo Juda,
Rọputa ugwu Zaion, nke Ọ huru n'anya.
69O we wue ebe nsọ Ya dika ebe di elu,
Dika uwa nke Ọ tọrọ ntọ-ala-ya rue mb͕e ebighi-ebi.
70Ọ rọputa-kwa-ara Devid, bú orù-Ya,
O we si n'ogige ìgwè ewu na aturu kuru ya:
71O mere ka o si n'iso nne-aturu nke nēnye umu-ha ara bia,
Izù Jekob, bú ndi-Ya, na Israel, bú ihe-nketa-Ya, dika aturu.
72O we nāzù ha dika izu-okè nke obi-ya si di;
Were kwa ihe-nghọta nile nke ọbu-aka-ya abua nēdu ha.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

ABÙ ỌMA 78: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye