Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Abụ Ọma 78:40-72

Abụ Ọma 78:40-72 BIU

Ọtụtụ oge ka ha nupuru isi megide ya nʼọzara; ha kpasuru ya iwe nʼala ahụ tọgbọrọ nʼefu. Mgbe mgbe, ha nwara Chineke; ha kpasuru Onye Nsọ nke Izrel iwe. Ha echetaghị ike ya, ụbọchị ahụ ọ gbapụtara ha site nʼaka ndị na-emegbu ha; nʼụbọchị o gosipụtara ihe ịrịbama niile nʼala Ijipt, ọrụ ebube ya niile nʼọhịa Zoan. O mere ka osimiri ha niile ghọọ ọbara. Ha enwekwaghị ike ịṅụ mmiri si na ha. O zigakwara igwe ijiji nʼetiti ha, nke tara ha, zitekwa awọ nʼala ha, nke bibiri ha. O zitekwara ụmụ ụkpana ndị tachapụrụ mkpụrụ a kụrụ nʼubi ha, zitekwa igurube nke ripịara ihe niile a gaara eweta dịka ihe ubi. O ji oke mkpụrụ mmiri mebie osisi vaịnị ha, jirikwa igirigi jụrụ oke oyi bibie osisi sikamọ ha niile. O weere ehi ha niile nyefee mkpụrụ mmiri, werekwa anụ ụlọ ha nyefee amụma egbe eluigwe. O zipụrụ iwe ọkụ ya nʼetiti ha, oke iwe ya, na iwe ya, na mmeso nke iwe ya, ndị mmụọ ozi na-ebibi ihe na-eleghị anya nʼazụ. O doziri ụzọ nke iwe ya ga-eso; o gbochighị ka ha ghara ịnwụ; kama o nyefere ndụ ha nʼaka ọrịa na-efe efe. O tigburu nwa ọbụla e bụ ụzọ mụọ nʼala Ijipt, mkpụrụ mbụ nke ndị ikom nʼime ụlọ ikwu Ham. Ma o dupụtara ndị nke ya dịka igwe atụrụ; o duuru ha dịka atụrụ gafee ọzara. O duuru ha nʼudo, ụjọ atụkwaghị ha, ma osimiri kpuchigidere ndị iro ha. Otu a ka o si duru ha bịaruo nʼoke ala nsọ ya, ala ugwu ugwu ahụ nke aka nri ya nwetara. Ọ chụpụrụ mba niile nʼihu ha, tụọ ala ha kesara ha dịka ihe nketa; o mere ka ebo niile nke Izrel biri nʼụlọ nke aka ha. Ma ha nwara Chineke ọnwụnwa, nupu isi megide Onye kachasị ihe niile elu; ha edebeghị ụkpụrụ ya. Dịka nna nna ha, ha bụ ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi, na ndị aghụghọ, ha dịka ụta a na-ekweghị nke ọma. Nʼihi ebe nchụaja ha wuru, ha mere ka iwe wee ya; sitekwa nʼarụsị ha pịrị apị, ha kpaliri ekworo ya. Mgbe Chineke nụrụ ha, iwe were ya nke ukwuu. Ọ jụrụ ndị Izrel kpamkpam. Ọ gbakụtara ụlọ nzute ya nke dị na Shaịlo azụ, ụlọ ikwu ahụ ọ mara nʼetiti ndị mmadụ. O nyefere igbe ọgbụgba ndụ ike ya ka a dọta ya nʼagha, o nyefekwara onye iro ahụ ebube ya nʼaka. O kwere ka e gbuo ndị ya nʼagha; iwe ya dị ọkụ megide ihe nketa ya. Ọkụ repịara ụmụ okorobịa ha, ọ dịkwaghị onye a gụụrụ egwu ọlụlụ di na nwunye, nʼetiti ụmụ agbọghọ ha; E gburu ndị nchụaja ha nʼagha; ndị inyom ha ndị di ha nwụrụ enwekwaghị ike iru ụjụ. Mgbe ahụ, onyenwe anyị tetara dịka onye si nʼụra teta, dịka dike si nʼụra mmanya teta. Ọ chụghachiri ndị iro ya azụ, mee ha ihe ihere nke ga-adịgide ruo ebighị ebi. Ọ jụrụ ụlọ ikwu Josef, ọ họpụtaghị ebo Ifrem; ma ọ họọrọ ebo Juda, na ugwu Zayọn, nke ọ hụrụ nʼanya. O wuru ụlọnsọ ya ka ọ dị ka ebe dị elu, dịka ụwa nke o mere ka o guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi. Ọ họpụtara Devid, ohu ya, kpọrọ ya site nʼọgba igwe atụrụ; o si nʼebe ọ nọ na-azụ atụrụ kpọrọ ya, ka ọ bịa bụrụ onye na-azụ ndị ya Jekọb, na Izrel, ihe nketa ya dịka atụrụ. Devid ji izuoke nke obi ya zụọ ha, aka nke maara ihe ọ na-eme ka o ji duo ha.