Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ABÙ ỌMA 78:1-39

ABÙ ỌMA 78:1-39 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Ndị m, nụrụnụ ihe m na-ezi; geenụ ntị nʼokwu ọnụ m. Aga m eji ilu malite okwu m, aga m ekwu ọtụtụ ihe omimi, ihe ndị sitere na mgbe ochie; ihe ndị anyị nụrụla, marakwa, ihe ndị nna nna anyị ha gwara anyị. Anyị agaghị ezonarị ụmụ anyị ihe ndị a, kama anyị ga-akọrọ ọgbọ nke na-abịa nʼihu akụkọ ịdị ike ONYENWE ANYị, na ọrụ ebube ya, na ihe ịtụnanya niile o mere. O nyere Jekọb iwu banyere ụkpụrụ ya, mekwaa ka iwu ahụ guzosie ike nʼIzrel, bụ nke ọ dọrọ nna nna anyị ha aka na ntị, ka ha kuziere ụmụ ha, ka ọgbọ na-eso ha nwee ike mụta ya, ọ bụladị ọgbọ nke a ka amụbeghị, ndị nke ga-agwakwa ha ụmụ ha. Mgbe ahụ, ha ga-atụkwasị Chineke obi ha, ma ghara ichefu ọrụ ya niile dị iche iche. Ha ga-edebekwa iwu ya niile. Ha agakwaghị adị ka ndị nna nna ha, ọgbọ ndị nnupu isi na ndị isiike; ndị obi ha na-adịghị nʼebe Chineke nọ, ndị mmụọ ha na-ekwesighị ntụkwasị obi nye ya. Ndị ikom Ifrem, nʼagbanyeghị na ha kwere ụta ha, chigharịrị azụ, gbaa ọsọ nʼụbọchị agha. Ha edebeghị ọgbụgba ndụ Chineke. Ha jụkwara ibi ndụ dịka iwu ya si dị. Ha chefuru ihe o mere, ọrụ ịtụnanya o gosiri ha. Chineke rụrụ ọrụ ebube ndị a nʼihu nna nna ha nʼala Ijipt na nʼọhịa Zoan. O kewara oke osimiri, site nʼetiti ya dufee ha. O mere ka mmiri ahụ guzo ọtọ dịka mgbidi. O ji igwe ojii duo ha nʼije nʼehihie, jirikwa ìhè sitere nʼọkụ ahụ, duo ha ogologo abalị niile. Ọ gbawara oke nkume dị nʼọzara, si otu a nye ha mmiri hiri nne, dịka a ga-asị na ọ bụ mmiri si nʼọtụtụ oke osimiri. O mere ka mmiri iyi site na nkume gbapụta, mee ka mmiri rudata dịka osimiri. Ha nọgidere na-emehie megide ya. Ha nupuru isi nʼọzara megide Onye kachasị ihe niile elu. Ha kpachara anya nwaa Chineke ọnwụnwa, mgbe ha rịọrọ ya nri nke obi ha chọrọ. Ha kwuhiere Chineke; jụọ ya ọnụ sị, “Chineke ọ pụrụ inye anyị ezi nri na mmiri ọṅụṅụ nʼọzara a? Ọ bụ ezie na o tiri nkume ahụ ihe, mee ka mmiri sọpụta, mmiri iyi sọpụtara nʼebe o hiri nne, ma ọ pụrụ inye anyị nri? Ọ pụrụ inye ndị ya anụ?” Mgbe ONYENWE ANYị nụrụ ihe ha kwuru, iwe were ya; ọkụ ya repịara Jekọb, iwe ọkụ ya biliri megide Izrel. Nʼihi na ha ekwenyeghị na Chineke, maọbụ tụkwasị obi na nzọpụta ya. Nʼagbanyeghị ihe ndị a, o nyere mbara eluigwe iwu meghekwa ọnụ ụzọ niile nke eluigwe. O mere ka mánà zokwasị ndị mmadụ a dịka mmiri, ka ha rie. O nyere ha mkpụrụ ọka nke si nʼeluigwe. Ndị mmadụ tara achịcha ndị mmụọ ozi. O zitere ha nri niile ha nwere ike iri. O sitere nʼeluigwe tọpụ ikuku nke ọwụwa anyanwụ, o jikwa ike ya duo ikuku nke ndịda. O zidatara ha anụ dị ukwuu dịka ọ bụ uzuzu, anụ ufe ọnụọgụgụ ha dịka ọnụọgụgụ aja dị nʼala ọnụ oke osimiri. O mere ka ụmụ anụ ufe ndị a daara ha nʼala nʼetiti ọmụma ụlọ ikwu ha nakwa gburugburu ụlọ ikwu ha. Ha riri ihe tutu ruo mgbe ha enwekwaghị ike iri ọzọ, nʼihi na o nyere ha ihe obi ha chọrọ. Ha erisibeghị nri ahụ obi ha chọrọ, anụ ụfọdụ dịkwa ha nʼọnụ, mgbe iwe Chineke biliri imegide ha; o tigburu ndị kachasị ike nʼetiti ha, tigbukwaa ụmụ okorobịa ndị Izrel. Ma na-eleghị ihe ndị a anya, ha gakwara nʼihu na mmehie ha, jụkwa ikwere nʼọrụ ebube niile Onyenwe anyị rụrụ. O mere ka ụbọchị ndụ ha bụrụ ihe efu. O mekwara ka afọ ha gwụsịa nʼobi ọlụlọ mmiri. Mgbe ọbụla Chineke tigburu ha, ha na-achọ ya; ha na-alaghachi azụ, chọsie ya ike. Ha na-echeta na Chineke bụ Oke nkume ha, na Chineke nke kachasị ihe niile elu bụrụ ha Onye Mgbapụta. Ma mgbe ahụ, ha ga-eji naanị okwu efu fee ya ofufe, were ire ha na-aghara ya ụgha. Obi ha ekwesịkwaghị ike nye ya. Ha ekwesighị ntụkwasị obi nye ọgbụgba ndụ ya. Ma o meere ha ebere. Ọ gbaghara ha mmehie ha. Ọ laghị ha nʼiyi. Ọtụtụ oge ka o jidere iwe ya. Ọ kpalịkwaghị oke iwe ya. Nʼihi na o chetara na ha bụ naanị anụ ahụ nke o kere eke, chetakwa na ha dịka ikuku nke na-adịghị alọghachi azụ mgbe ọ gabigasịrị.

ABÙ ỌMA 78:1-39 Bible Nso (IGBOB)

Ndim, ǹanu nti n'iwum: Tọnu nti n'ala inu okwu nile nke ọnum. M'gāsaghe ọnum n'itu ilu: M'gēkwuwa okwu-omimi di iche iche n'uba, bú nke sitere na mb͕e ochie: Nke ayi nuworo mara kwa, Nke nna-ayi-hà kọwo-kwa-ra ayi. Ayi agaghi-ezonari ha na nti umu-ha, Nākọrọ ọb͕ọ nke gādi n'iru akukọ otuto nile nke Jehova, Na ike-Ya, na oké ọlu-Ya nile nke Ọ luworo. O we me ka otù ihe-àmà guzosie ike nime Jekob, O do-kwa-ra iwu n'Israel, Nke O nyere nna-ayi-hà n'iwu, Ime ka umu-ha mara ha: Ka ọb͕ọ nke gādi n'iru we mara, bú umu agāmu; Ha gēbili, we kọro umu-ha akukọ ahu: Ka ha we tukwasi obi-ha na Chineke, Ghara ichezọ omume nile nke Chineke, Ma debe ihe nile O nyere n'iwu: Ghara kwa idi ka ndi bu nna-ha, Ndi bu ọb͕ọ nēwezuga onwe-ha nke nānupu kwa isi; Ọb͕ọ ndi nēdozighi obi-ha, Ndi mọ-ha nēkwesighi ntukwasi-obi n'ebe Chineke nọ. Umu Efraim, ọ bu ezie na ha nāchi ihe-agha nēbuli kwa uta, Ma ha chighariri n'ubọchi agha. Ha edebeghi ọb͕ub͕a-ndu Chineke, Ma ha juru ijeghari n'iwu-Ya; Ha we chezọ omume-Ya nile, Na oké ọlu-Ya nile nke O mere ka ha hu. N'iru ndi bu nna-ha ka Ọ luru oké ọlu, N'ala Ijipt, n'ọhia Zoan. O kewara oké osimiri, we me ka ha gabiga; O me-kwa-ra ka miri guzo ọtọ dika obo-ihe. O ji-kwa-ra igwe-oji edu ha n'ehihie, Ji kwa ìhè ọku edu ha ogologo abali nile. Ọ nākpọwa oké nkume di iche iche n'ọzara, We me ka ha ṅua miri ri nne dika o si nime ob͕u-miri puta. O me-kwa-ra ka miri nke nērù erù si na nkume di elu puta, O we me ka miri nērùda dika ọtutu osimiri. Ma ha nọ nēmehie kwa ọzọ imegide Ya, Inupu isi n'okpuru Onye kachasi ihe nile elu n'ala kpọro nku. Ha we nwa Chineke n'obi-ha N'iriọ ihe-oriri nye ọchichọ-nkpuru-obi-ha. Ha we kwue okwu megide Chineke; Ha siri, Chineke, Ọ̀ puru ido table n'usoro n'ọzara? Le, O tiri oké nkume ihe, miri we nērù erù, Isi-iyi di iche iche nērubiga kwa ókè; Ọ̀ di kwa achicha Ọ puru inye? Ọ̀ gēdoziri ndi-Ya anu? N'ihi nke Jehova nuru, O we webiga iwe ókè: Ewe kponwue ọku megide Jekob, Ọzọ kwa, iwe kwugoro elu dika anwuru-ọku imegide Israel; N'ihi na ha ekweghi na Chineke, Ha atukwasighi kwa obi-ha na nzọputa-Ya. O we nye mbara-ígwé nile n'elu iwu, Meghe kwa ọnu-uzọ nile nke elu-igwe; O we me ka manna zokwasi ha dika miri, ka ha rie, Ọ bu kwa ọka nke elu-igwe ka O nyere ha. Nri nke ndi di ike ka madu riri: O zitere ha ihe ha gēriju afọ. O nēme ka ifufe Iru-anyanwu bulie ije n'elu-igwe: O ji-kwa-ra ike-Ya duru ifufe Ndida. O we me ka anu zokwasi ha dika ájá, Ọbuná dika ájá oké osimiri, bú anu-ufe nwere nkù: O we me ka ọ da n'etiti ọmuma-ulo-ikwū-ha, Buruburu ebe-obibi-ha nile. Ha we rie, afọ we ju ha nke-uku; Ọ bu kwa ihe ha nāchọsi ike ka Ọ nēme ka ọ biarue ha aru. Ha abughi ndi ala ọzọ n'ebe ihe ha nāchọsi ike di, Ihe-oriri-ha nādi ha n'ọnu, Mb͕e iwe Chineke kwugoro elu dika anwuru-ọku imegide ha, We b͕ue ufọdu n'etiti ndi-ha nke mara abuba, Ọ bu kwa umu-okorọbia nke Israel ka o mere ka ha ruru ala. N'ihe a nile ha mehie-kwa-ara ọzọ, Ha ekweghi kwa n'oké ọlu-Ya nile. O we me ka ubọchi nile ha gwusia n'otù nku-ume, O me-kwa-ra ka arọ nile ha gwusia n'obi-ọlulọ-miri. Ọ buru na O b͕uru ha, ha we chọ Ya: Laghachi kwa, chọsie Chineke ike. Ha we cheta na Chineke bu oké nkume-ha, Cheta kwa na Chineke Nke kachasi ihe nile elu bu Onye-nb͕aputa-ha. Ha we ji ọnu-ha nārà Ya, Ji kwa ire-ha nāgwa Ya okwu-ugha. Obi-ha eguzosighi kwa ike n'ebe Ọ nọ, Ha ekwesighi kwa ntukwasi-obi n'ọb͕ub͕a-ndu-Ya. Ma Ya onwe-ya, ebe O nwere obi-ebere, Ọ nēkpuchi ajọ omume-ha, Ọ dighi-ebibi kwa ha: E, ọtutu mb͕e ka O mere iwe-Ya ka ọ laghachi azu, Ọ dighi-akpọte kwa ọnuma-Ya nile. O we cheta na anu-aru ka ha bu; Ifufe nke nālafe alafe, we ghara ilaghachi.