Ndị m, nụrụnụ ihe m na-ezi;
geenụ ntị nʼokwu ọnụ m.
Aga m eji ilu malite okwu m,
aga m ekwu ọtụtụ ihe omimi, ihe ndị sitere na mgbe ochie;
ihe ndị anyị nụrụla, marakwa,
ihe ndị nna nna anyị ha gwara anyị.
Anyị agaghị ezonarị ụmụ anyị ihe ndị a,
kama anyị ga-akọrọ ọgbọ nke na-abịa nʼihu
akụkọ ịdị ike ONYENWE ANYị,
na ọrụ ebube ya, na ihe ịtụnanya niile o mere.
O nyere Jekọb iwu banyere ụkpụrụ ya,
mekwaa ka iwu ahụ guzosie ike nʼIzrel,
bụ nke ọ dọrọ nna nna anyị ha aka na ntị,
ka ha kuziere ụmụ ha,
ka ọgbọ na-eso ha nwee ike mụta ya,
ọ bụladị ọgbọ nke a ka amụbeghị,
ndị nke ga-agwakwa ha ụmụ ha.
Mgbe ahụ, ha ga-atụkwasị Chineke obi ha,
ma ghara ichefu ọrụ ya niile dị iche iche.
Ha ga-edebekwa iwu ya niile.
Ha agakwaghị adị ka ndị nna nna ha,
ọgbọ ndị nnupu isi na ndị isiike;
ndị obi ha na-adịghị nʼebe Chineke nọ,
ndị mmụọ ha na-ekwesighị ntụkwasị obi nye ya.
Ndị ikom Ifrem, nʼagbanyeghị na ha kwere ụta ha,
chigharịrị azụ, gbaa ọsọ nʼụbọchị agha.
Ha edebeghị ọgbụgba ndụ Chineke.
Ha jụkwara ibi ndụ dịka iwu ya si dị.
Ha chefuru ihe o mere,
ọrụ ịtụnanya o gosiri ha.
Chineke rụrụ ọrụ ebube ndị a nʼihu nna nna ha
nʼala Ijipt na nʼọhịa Zoan.
O kewara oke osimiri, site nʼetiti ya dufee ha.
O mere ka mmiri ahụ guzo ọtọ dịka mgbidi.
O ji igwe ojii duo ha nʼije nʼehihie,
jirikwa ìhè sitere nʼọkụ ahụ, duo ha ogologo abalị niile.
Ọ gbawara oke nkume dị nʼọzara,
si otu a nye ha mmiri hiri nne, dịka a ga-asị na ọ bụ mmiri si nʼọtụtụ oke osimiri.
O mere ka mmiri iyi site na nkume gbapụta,
mee ka mmiri rudata dịka osimiri.
Ha nọgidere na-emehie megide ya.
Ha nupuru isi nʼọzara megide Onye kachasị ihe niile elu.
Ha kpachara anya nwaa Chineke ọnwụnwa,
mgbe ha rịọrọ ya nri nke obi ha chọrọ.
Ha kwuhiere Chineke;
jụọ ya ọnụ sị, “Chineke ọ pụrụ inye anyị
ezi nri na mmiri ọṅụṅụ nʼọzara a?
Ọ bụ ezie na o tiri nkume ahụ ihe,
mee ka mmiri sọpụta,
mmiri iyi sọpụtara nʼebe o hiri nne,
ma ọ pụrụ inye anyị nri?
Ọ pụrụ inye ndị ya anụ?”
Mgbe ONYENWE ANYị nụrụ ihe ha kwuru, iwe were ya;
ọkụ ya repịara Jekọb,
iwe ọkụ ya biliri megide Izrel.
Nʼihi na ha ekwenyeghị na Chineke,
maọbụ tụkwasị obi na nzọpụta ya.
Nʼagbanyeghị ihe ndị a, o nyere mbara eluigwe iwu
meghekwa ọnụ ụzọ niile nke eluigwe.
O mere ka mánà zokwasị ndị mmadụ a dịka mmiri, ka ha rie.
O nyere ha mkpụrụ ọka nke si nʼeluigwe.
Ndị mmadụ tara achịcha ndị mmụọ ozi.
O zitere ha nri niile ha nwere ike iri.
O sitere nʼeluigwe tọpụ ikuku nke ọwụwa anyanwụ,
o jikwa ike ya duo ikuku nke ndịda.
O zidatara ha anụ dị ukwuu dịka ọ bụ uzuzu,
anụ ufe ọnụọgụgụ ha dịka ọnụọgụgụ aja dị nʼala ọnụ oke osimiri.
O mere ka ụmụ anụ ufe ndị a daara ha nʼala nʼetiti ọmụma ụlọ ikwu ha
nakwa gburugburu ụlọ ikwu ha.
Ha riri ihe tutu ruo mgbe ha enwekwaghị ike iri ọzọ,
nʼihi na o nyere ha ihe obi ha chọrọ.
Ha erisibeghị nri ahụ obi ha chọrọ,
anụ ụfọdụ dịkwa ha nʼọnụ,
mgbe iwe Chineke biliri imegide ha;
o tigburu ndị kachasị ike nʼetiti ha,
tigbukwaa ụmụ okorobịa ndị Izrel.
Ma na-eleghị ihe ndị a anya, ha gakwara nʼihu na mmehie ha,
jụkwa ikwere nʼọrụ ebube niile Onyenwe anyị rụrụ.
O mere ka ụbọchị ndụ ha bụrụ ihe efu.
O mekwara ka afọ ha gwụsịa nʼobi ọlụlọ mmiri.
Mgbe ọbụla Chineke tigburu ha, ha na-achọ ya;
ha na-alaghachi azụ, chọsie ya ike.
Ha na-echeta na Chineke bụ Oke nkume ha,
na Chineke nke kachasị ihe niile elu bụrụ ha Onye Mgbapụta.
Ma mgbe ahụ, ha ga-eji naanị okwu efu fee ya ofufe,
were ire ha na-aghara ya ụgha.
Obi ha ekwesịkwaghị ike nye ya.
Ha ekwesighị ntụkwasị obi nye ọgbụgba ndụ ya.
Ma o meere ha ebere.
Ọ gbaghara ha mmehie ha.
Ọ laghị ha nʼiyi.
Ọtụtụ oge ka o jidere iwe ya.
Ọ kpalịkwaghị oke iwe ya.
Nʼihi na o chetara na ha bụ naanị anụ ahụ nke o kere eke,
chetakwa na ha dịka ikuku nke na-adịghị alọghachi azụ mgbe ọ gabigasịrị.