ABÙ ỌMA 45:10-17
ABÙ ỌMA 45:10-17 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Gee ntị, gị nwaagbọghọ, tulee ma nụrụkwa ihe m na-ekwu: “Chefuo ndị gị na ezinaụlọ nna gị. Nʼihi na ịma mma gị ga-eme ka eze chọsie gị ike. Sọpụrụ ya nʼihi na ọ bụ onyenwe gị.” Ada Taịa ga-eji onyinye bịa; ndị ọgaranya ga-achọkwa ka i gosi ha ihuọma. Adaeze, lee ka o si maa mma dị ukwuu nʼime ụlọ ya; ọ bụ akwa a kpanyere ọlaedo ka e ji dụọ uwe mwụda ya. Ụmụ agbọghọ ibe ya, ndị na-amaghị nwoke, na-eso ya bịakwute gị; ọ bụ uwe mwụda a kpanyere ihe ọkpụkpa ka o yi mgbe e dubatara ya nʼụlọeze. E ji ọṅụ na obi ụtọ dubata ha; ha bara nʼime ụlọeze. Ụmụ gị ndị ikom ga-anọchi anya nna nna gị; ị ga-eme ka ha bụrụ ndịisi nʼala ahụ niile. Aga m eme ka echeta ihe banyere gị ruo ọgbọ niile; nʼihi nke a, mba niile ga-eto gị ruo mgbe niile ebighị ebi.
ABÙ ỌMA 45:10-17 Bible Nso (IGBOB)
Nuru, ada, le kwa, tọ kwa nti-gi n'ala; Chezọ kwa ndi-gi, na ulo nna-gi; Eze gēsi otú a chọsie ima-nma-gi ike: N'ihi na ya onwe-ya bu onye-nwe-gi; gi kpọ kwa isi ala nye ya. Ada Taia gēwere kwa onyinye-inata-iru-ọma bia; Ndi-ọgaranya nke ndi-gi gēme ka iru-gi dajua. Ada eze nke nọ nime ulo dichasi nsọpuru: Ihe akpagwara ọla-edo ka uwe-ya bu. N'uwe akpara nke-ọma ka agēduru ya jekuru eze: Umu-ab͕ọghọ, nāmaghi nwoke ndi nēso ya n'azu, bú ndi-ibe-ya, Anēme ha ka ha biakute gi. Eji ọṅù na otite-egwú-ọǹù duru ha: Ha gābà n'ulo uku eze. Umu-gi gānọchi anya nna-gi-hà, I gēdo ha ndi-isi n'uwa nile. M'gēme ka echeta aha-gi n'ọb͕ọ nile: N'ihi nka ndi nile di iche iche gēkele gi rue mb͕e nile ebighi-ebi.