Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ABÙ ỌMA 45

45
Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù; n'elu Shoshannim; Abù Ọma nke Umu Kora. Maschil. Abù ihe-utọ.
1Obim ab͕ọputawo okwu di nma:
Mu onwem nēkwu okwu; olum diri eze:
Irem bu pen nke onye nēde akwukwọ ngwa ngwa.
2Emewo gi ka i ma nma kari umu madu;
Awukwasiwo amara n'eb͕ub͕ere-ọnu-gi abua:
N'ihi ya Chineke agọziwo gi rue mb͕e ebighi-ebi.
3Ke mma-agha-gi n'úkwù-gi, gi dike,
Ebube-gi na ima-nma-gi.
4N'ima-nma-gi nọkwasi n'elu inyinya ga nke-ọma,
N'ihi ezi-okwu na ume-ala-n'obi na ezi omume:
Aka-nri-gi gēzí kwa gi ihe di iche iche di egwu.
5Àkú-gi nile bu ihe di nkọ;
Ndi nile di iche iche nāda n'okpuru gi;
Àkú-gi di n'obi ndi-iro eze.
6Oche-eze-Gi, Chineke, nādiru mb͕e nile ebighi-ebi:
Nkpa-n'aka-eze nke izi-ezi ka nkpa-n'aka-eze nke ala-eze-Gi bu.
7I huwo ezi omume n'anya, we kpọ nmebi-iwu asì:
N'ihi nka Chineke, bú Chineke-gi, tere gi
Manu obi-utọ n'isi kari ndi-ibe-gi.
8Myrrh na aloes na cassia juputara uwe-gi nile;
Site n'ulo uku nile nke ọdu ubọ-akwara emewo ka i ṅuria ọṅu.
9Umu-ndinyom ndi-eze muru nọ n'etiti ndinyom-i di oké ọnu-ahia:
Nwunye-eze nēguzo onwe-ya n'aka-nri-gi yiri ọla-edo ọma nke Ofia.
10Nuru, ada, le kwa, tọ kwa nti-gi n'ala;
Chezọ kwa ndi-gi, na ulo nna-gi;
11Eze gēsi otú a chọsie ima-nma-gi ike:
N'ihi na ya onwe-ya bu onye-nwe-gi; gi kpọ kwa isi ala nye ya.
12Ada Taia gēwere kwa onyinye-inata-iru-ọma bia;
Ndi-ọgaranya nke ndi-gi gēme ka iru-gi dajua.
13Ada eze nke nọ nime ulo dichasi nsọpuru:
Ihe akpagwara ọla-edo ka uwe-ya bu.
14N'uwe akpara nke-ọma ka agēduru ya jekuru eze:
Umu-ab͕ọghọ, nāmaghi nwoke ndi nēso ya n'azu, bú ndi-ibe-ya,
Anēme ha ka ha biakute gi.
15Eji ọṅù na otite-egwú-ọǹù duru ha:
Ha gābà n'ulo uku eze.
16Umu-gi gānọchi anya nna-gi-hà,
I gēdo ha ndi-isi n'uwa nile.
17M'gēme ka echeta aha-gi n'ọb͕ọ nile:
N'ihi nka ndi nile di iche iche gēkele gi rue mb͕e nile ebighi-ebi.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

ABÙ ỌMA 45: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye