Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ABÙ ỌMA 45:10-17

ABÙ ỌMA 45:10-17 IGBOB

Nuru, ada, le kwa, tọ kwa nti-gi n'ala; Chezọ kwa ndi-gi, na ulo nna-gi; Eze gēsi otú a chọsie ima-nma-gi ike: N'ihi na ya onwe-ya bu onye-nwe-gi; gi kpọ kwa isi ala nye ya. Ada Taia gēwere kwa onyinye-inata-iru-ọma bia; Ndi-ọgaranya nke ndi-gi gēme ka iru-gi dajua. Ada eze nke nọ nime ulo dichasi nsọpuru: Ihe akpagwara ọla-edo ka uwe-ya bu. N'uwe akpara nke-ọma ka agēduru ya jekuru eze: Umu-ab͕ọghọ, nāmaghi nwoke ndi nēso ya n'azu, bú ndi-ibe-ya, Anēme ha ka ha biakute gi. Eji ọṅù na otite-egwú-ọǹù duru ha: Ha gābà n'ulo uku eze. Umu-gi gānọchi anya nna-gi-hà, I gēdo ha ndi-isi n'uwa nile. M'gēme ka echeta aha-gi n'ọb͕ọ nile: N'ihi nka ndi nile di iche iche gēkele gi rue mb͕e nile ebighi-ebi.