Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ABÙ ỌMA 37:23-40

ABÙ ỌMA 37:23-40 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Ọ bụrụ na ONYENWE ANYị nwere mmasị na ndụ mmadụ, ọ ga-eme ka nzọ ụkwụ ya guzosie ike; ọ bụrụ na ọ kpọbie ụkwụ, ọ gaghị ada, nʼihi na ONYENWE ANYị na-eji aka ya ejigide ya. Abụ m nwantakịrị na mbụ, ugbu a, abụ m agadi, ma ahụbeghị m ebe e chefuru ndị ezi omume, maọbụ ebe ụmụ ha na-arịọ nri. Mgbe niile, ha na-eme amara jiri obi ha na-agbazinye ndị mmadụ ihe, ụmụ ha ga-abụ ngọzị. Site nʼihe ọjọọ pụọ, mee ezi ihe, mgbe ahụ, i ga-ebi nʼala a ruo mgbe ebighị ebi. ONYENWE ANYị na-ahụ onye ezi omume na ikpe ziri ezi nʼanya. Ọ gaghị ahapụkwa ndị ya kwesiri ntụkwasị obi. A ga-echebe ha ruo mgbe ebighị ebi, ma ụmụ ndị ajọ omume ka a ga-egbuchapụ; ndị ezi omume ga-eketa ala ahụ dịka ihe nketa ha, ha ga-ebikwa nʼime ya ruo mgbe ebighị ebi. Okwu amamihe na-esi nʼọnụ onye ezi omume pụta, ire ya na-ekwukwa ihe ziri ezi. Iwu Chineke ya dị ya nʼobi; nzọ ukwu ha adịghị agbụchapụ. Ndị ajọ omume na-echere ndị ezi omume na nzuzo, na-achọ ịnapụ ha ndụ ha; ma ONYENWE ANYị agaghị ahapụ ha nʼaka ha, ọ gaghị ekwe ka a maa ha ikpe mgbe a na-ekpe ha ikpe. Chere ONYENWE ANYị, debekwa ụzọ ya. Ọ ga-ebuli gị elu ka i nweta ala ahụ dịka ihe nketa; mgbe a na-egbuchapụ ndị ajọ omume, ị ga-eji anya gị hụ ya. Ahụla m onye ajọ omume na nwoke na-eme ihe ike, ka ọ na-eto, na-awasa, dịka osisi dị ndụ nʼezi ala, ma ọ dịghị anya, ọ nwụrụ, nʼagbanyeghị na m chọgharịrị ya, ọ dịghị ebe ọbụla a hụrụ ya. Ma tụgharịa uche banyere ndị ezi omume, rịbaa ndị ụzọ ha ziri ezi ama; ọganihu dịịrị onye udo. Ma a ga-ala ndị mmehie niile nʼiyi; ọ dịghị olileanya dịịrị ndị ajọ omume. Nzọpụta nke ndị ezi omume si nʼaka ONYENWE ANYị bịa; ọ bụ ebe ha e wusiri ike nʼoge nsogbu. ONYENWE ANYị na-enyere ha aka, na-anapụtakwa ha ma na-azọpụtakwa ha site nʼaka ndị ajọ omume, nʼihi na ha mere ya ebe mgbaba ha.

ABÙ ỌMA 37:23-40 Bible Nso (IGBOB)

Site n'aka Jehova ka emeworo ka nzọ-ukwu nile nke madu guzosie ike; Uzọ-ya nātọ kwa Ya utọ. Mb͕e ọ gada, agaghi-atudasi ya: N'ihi na Jehova nākwagide aka-ya. Nwata ka m'buworo, aghọwokwam okenye; Ma ahughm onye ezi omume ka arapuru ya, Ahughkwam nkpuru-ya ka ha nāriọ nri. Ogologo ubọchi nile ka ọ nēme amara, nēbinye kwa ihe; Nkpuru-ya bu kwa ndi agọziri agọzi. Si n'ihe ọjọ wezuga onwe-gi, me ezi ihe; Biri kwa rue mb͕e ebighi-ebi. N'ihi na Jehova nāhu ezi ikpé n'anya, Ọ dighi-arapu kwa ndi-ebere-Ya; Rue mb͕e ebighi-ebi ka anēdebe ha: Ma agēbipu nkpuru ndi nēmebi iwu. Ndi ezi omume gēnweta ala, Biri kwa n'elu ya rue mb͕e ebighi-ebi. Ọnu onye ezi omume nēkwu okwu amam-ihe, dika onye nātughari uche, Ire-ya nēkwu kwa okwu ezi ikpé. Iwu Chineke-ya di n'obi-ya; Nzọ-ukwu-ya nile agaghi-ab͕uchapu kwa. Onye nēmebi iwu nēche onye ezi omume nche, Nāchọ kwa ime ka ọ nwua. Jehova agaghi-arapu ya n'aka-ya, Ọ gaghi-ama kwa ya ikpe mb͕e anēkpe ya ikpe. Nēle anya Jehova, nēdebe kwa uzọ-Ya, Ọ gēbuli kwa gi inweta ala: Mb͕e anēbipu ndi nēmebi iwu, i gāhu. Ahuwom onye nēmebi iwu ka ọ nēme madu ka ha ma jijiji, Ahuwokwam ya ka ọ nāwasa onwe-ya dika osisi di ndu n'ala mara ya. O we gabiga, ma, le, ọ nọgh: M'we chọ ya, ma achọtaghi ya. Riba onye zuru okè ama, le kwa onye ziri ezi: N'ihi na ọdi-n'iru diri onye-udo. Ma ndi-njehie, anēkpochapu ha n'otù: Agēbipu ọdi-n'iru nke ndi nēmebi iwu. Ma nzọputa ndi ezi omume nēsi n'aka Jehova bia: Ọ bu ebe-ha siri ike na mb͕e nkpà. Jehova nēye-kwa-ra ha aka, nēme ka ha b͕apu: Ọ nēme ka ha si n'aka ndi nēmebi iwu b͕apu, Ọ nāzọputa kwa ha, N'ihi na ha ab͕abàwo nime Ya.