Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Abụ Ọma 37:23-40

Abụ Ọma 37:23-40 BIU

Ọ bụrụ na ONYENWE ANYị nwere mmasị na ndụ mmadụ, ọ ga-eme ka nzọ ụkwụ ya guzosie ike; ọ bụrụ na ọ kpọbie ụkwụ, ọ gaghị ada, nʼihi na ONYENWE ANYị na-eji aka ya ejigide ya. Abụ m nwantakịrị na mbụ, ugbu a, abụ m agadi, ma ahụbeghị m ebe e chefuru ndị ezi omume, maọbụ ebe ụmụ ha na-arịọ nri. Mgbe niile, ha na-eme amara jiri obi ha na-agbazinye ndị mmadụ ihe, ụmụ ha ga-abụ ngọzị. Site nʼihe ọjọọ pụọ, mee ezi ihe, mgbe ahụ, i ga-ebi nʼala a ruo mgbe ebighị ebi. ONYENWE ANYị na-ahụ onye ezi omume na ikpe ziri ezi nʼanya. Ọ gaghị ahapụkwa ndị ya kwesiri ntụkwasị obi. A ga-echebe ha ruo mgbe ebighị ebi, ma ụmụ ndị ajọ omume ka a ga-egbuchapụ; ndị ezi omume ga-eketa ala ahụ dịka ihe nketa ha, ha ga-ebikwa nʼime ya ruo mgbe ebighị ebi. Okwu amamihe na-esi nʼọnụ onye ezi omume pụta, ire ya na-ekwukwa ihe ziri ezi. Iwu Chineke ya dị ya nʼobi; nzọ ukwu ha adịghị agbụchapụ. Ndị ajọ omume na-echere ndị ezi omume na nzuzo, na-achọ ịnapụ ha ndụ ha; ma ONYENWE ANYị agaghị ahapụ ha nʼaka ha, ọ gaghị ekwe ka a maa ha ikpe mgbe a na-ekpe ha ikpe. Chere ONYENWE ANYị, debekwa ụzọ ya. Ọ ga-ebuli gị elu ka i nweta ala ahụ dịka ihe nketa; mgbe a na-egbuchapụ ndị ajọ omume, ị ga-eji anya gị hụ ya. Ahụla m onye ajọ omume na nwoke na-eme ihe ike, ka ọ na-eto, na-awasa, dịka osisi dị ndụ nʼezi ala, ma ọ dịghị anya, ọ nwụrụ, nʼagbanyeghị na m chọgharịrị ya, ọ dịghị ebe ọbụla a hụrụ ya. Ma tụgharịa uche banyere ndị ezi omume, rịbaa ndị ụzọ ha ziri ezi ama; ọganihu dịịrị onye udo. Ma a ga-ala ndị mmehie niile nʼiyi; ọ dịghị olileanya dịịrị ndị ajọ omume. Nzọpụta nke ndị ezi omume si nʼaka ONYENWE ANYị bịa; ọ bụ ebe ha e wusiri ike nʼoge nsogbu. ONYENWE ANYị na-enyere ha aka, na-anapụtakwa ha ma na-azọpụtakwa ha site nʼaka ndị ajọ omume, nʼihi na ha mere ya ebe mgbaba ha.