Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ABÙ ỌMA 37

37
Abù Ọma nke Devid.
1Emela ka iwe-gi di ọku n'ihi ndi nēme ihe ọjọ,
Ekwosola ndi nēme ajọ omume ekworo.
2N'ihi na dika ahihia ka agēbipu ha ngwa ngwa,
Dika akwukwọ ahihia ndu ka ha gākpọnwu.
3Tukwasi Jehova obi, me kwa ezi ihe;
Biri n'ala, nāzù kwa onwe-gi n'ikwesi-ntukwasi-obi.
4Ka ihe Jehova tọ kwa gi utọ;
Ọ gēnye kwa gi ihe nile obi-gi nāriọ.
5Kpọre uzọ-gi ru Jehova aru;
Tukwasi kwa Ya obi, Ya onwe-ya gēme kwa ya.
6Ọ gēme kwa ka ezi omume-gi puta dika ìhè,
Ikpé-gi kwa dika etiti-ehihie.
7Nọ dū n'iru Jehova, were kwa ntachi-obi nēchere Ya:
Emela ka iwe-gi di ọku n'ihi onye ọ nāgara nke-ọme n'uzọ ya,
N'ihi madu nke na-eme ajọ ihe-nzube di iche iche.
8Ra aka iwe iwe, rapu kwa ọnuma:
Emela ka iwe-gi di ọku, o nēdubà nání n'ime ihe ọjọ.
9N'ihi na agēbipu ndi nēme ihe ọjọ:
Ma ndi nēle anya Jehova, ndi ahu gēnweta ala.
10Ma ọ fọduru nwa mb͕e, onye nēmebi iwu agaghi-adi kwa:
I gēlekwasi kwa ọnọdu-ya anya, ma ọ gaghi-anọ.
11Ma ndi di ume-ala n'obi gēnweta ala;
Iba-uba nke udo gātọ kwa ha utọ.
12Onye nēmebi iwu nēzube ajọ ihe imegide onye ezi omume,
Ọ nātakwasi kwa ya ikekere-ezé.
13Onye-nwe-ayi nāchì ya ọchì:
N'ihi na Ọ huwo na ubọchi-ya nābia
14Ndi nēmebi iwu amiputawo mma-agha, zọ kwa uta-ha ukwu ikwe ya;
Ime ka onye ewedara n'ala na ob͕eye da,
Ib͕u ndi ziri ezi n'uzọ-ha:
15Mma-agha-ha gābà n'obi onwe-ha,
Agāb͕aji kwa uta-ha.
16Ihe ntà onye ezi omume nwere di nma
Kari ihe bara uba nke ọtutu ndi nēmebi iwu.
17N'ihi na agāb͕aji ogwe-aka nke ndi nēmebi iwu:
Ma Jehova nākwagide ndi ezi omume.
18Jehova mara ubọchi nile nke ndi zuru okè:
Ihe-nketa-ha gādiru kwa mb͕e ebighi-ebi.
19Ihere agaghi-eme ha na mb͕e ihe ọjọ:
Afọ gēju kwa ha n'ubọchi oké unwu.
20N'ihi na ndi nēmebi iwu gāla n'iyì,
Ndi-iro Jehova gādi ka ihe di oké ọnu-ahia nke umu-aturu:
Ha gēdè; n'anwuru-ọku ka ha gēdè.
21Onye nēmebi iwu nēbiri ihe, ma ọ dighi-akwughachi:
Ma onye ezi omume nēme amara, nēnye kwa enye.
22N'ihi na ndi Ọ nāgọzi gēnweta ala;
Ma agēbipu ndi Ọ nākọcha.
23Site n'aka Jehova ka emeworo ka nzọ-ukwu nile nke madu guzosie ike;
Uzọ-ya nātọ kwa Ya utọ.
24Mb͕e ọ gada, agaghi-atudasi ya:
N'ihi na Jehova nākwagide aka-ya.
25Nwata ka m'buworo, aghọwokwam okenye;
Ma ahughm onye ezi omume ka arapuru ya,
Ahughkwam nkpuru-ya ka ha nāriọ nri.
26Ogologo ubọchi nile ka ọ nēme amara, nēbinye kwa ihe;
Nkpuru-ya bu kwa ndi agọziri agọzi.
27Si n'ihe ọjọ wezuga onwe-gi, me ezi ihe;
Biri kwa rue mb͕e ebighi-ebi.
28N'ihi na Jehova nāhu ezi ikpé n'anya,
Ọ dighi-arapu kwa ndi-ebere-Ya;
Rue mb͕e ebighi-ebi ka anēdebe ha:
Ma agēbipu nkpuru ndi nēmebi iwu.
29Ndi ezi omume gēnweta ala,
Biri kwa n'elu ya rue mb͕e ebighi-ebi.
30Ọnu onye ezi omume nēkwu okwu amam-ihe, dika onye nātughari uche,
Ire-ya nēkwu kwa okwu ezi ikpé.
31Iwu Chineke-ya di n'obi-ya;
Nzọ-ukwu-ya nile agaghi-ab͕uchapu kwa.
32Onye nēmebi iwu nēche onye ezi omume nche,
Nāchọ kwa ime ka ọ nwua.
33Jehova agaghi-arapu ya n'aka-ya,
Ọ gaghi-ama kwa ya ikpe mb͕e anēkpe ya ikpe.
34Nēle anya Jehova, nēdebe kwa uzọ-Ya,
Ọ gēbuli kwa gi inweta ala:
Mb͕e anēbipu ndi nēmebi iwu, i gāhu.
35Ahuwom onye nēmebi iwu ka ọ nēme madu ka ha ma jijiji,
Ahuwokwam ya ka ọ nāwasa onwe-ya dika osisi di ndu n'ala mara ya.
36O we gabiga, ma, le, ọ nọgh:
M'we chọ ya, ma achọtaghi ya.
37Riba onye zuru okè ama, le kwa onye ziri ezi:
N'ihi na ọdi-n'iru diri onye-udo.
38Ma ndi-njehie, anēkpochapu ha n'otù:
Agēbipu ọdi-n'iru nke ndi nēmebi iwu.
39Ma nzọputa ndi ezi omume nēsi n'aka Jehova bia:
Ọ bu ebe-ha siri ike na mb͕e nkpà.
40Jehova nēye-kwa-ra ha aka, nēme ka ha b͕apu:
Ọ nēme ka ha si n'aka ndi nēmebi iwu b͕apu, Ọ nāzọputa kwa ha,
N'ihi na ha ab͕abàwo nime Ya.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

ABÙ ỌMA 37: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye

YouVersion na-eji kuki gasị iji hazie ahụmịhe gị. Site na iji webụsaịtị anyị eme ihe, ị na-anabata ojiji kuki anyị gasị dịka akọwara na Iwu Anyị Mebere Banyere Ihe Ndị Ahụ Gbasara Ndụ Ndị Mmadụ Nke Ha Na-Achọghị Ka Ọha Mara