ABÙ ỌMA 33:1-11
ABÙ ỌMA 33:1-11 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Tienụ mkpu ọṅụ nye ONYENWE ANYị, unu ndị ezi omume; nʼihi na ọ bụ ihe ziri ezi ka ndị obi ha ziri ezi too ya. Werenụ ụbọ akwara too ONYENWE ANYị; werenụ une nke nwere akwara iri kpọọrọ ya egwu. Bụkuonụ ya abụ ọhụrụ; were ǹka kpọọ ụbọ akwara ma tiekwa mkpu ọṅụ. Nʼihi na okwu ONYENWE ANYị niile ziri ezi bụrụkwa eziokwu; o kwesiri ntụkwasị obi nʼọrụ ya niile. ONYENWE ANYị na-ahụ ezi omume na ikpe ziri ezi nʼanya; ụwa niile jupụtara nʼịhụnanya ya nke na-enweghị ọgwụgwụ. Ọ bụ site nʼokwu ọnụ ONYENWE ANYị ka e ji kee eluigwe niile, jirikwa nkuume nke ọnụ ya mee anwụ, na ọnwa na kpakpando niile. Ọ bụ ya kekwara osimiri niile chịkọta ha nʼotu ebe, kpaa oke ebe ha ga-anọ dịka ụlọakụ dị ukwuu. Ka ụwa niile tụọ ONYENWE ANYị egwu; ka mmadụ niile bi nʼụwa sọpụrụ ya. Nʼihi na o kwuru okwu, okwu ahụ mezukwara; o nyere iwu, iwu ahụ guzokwara chịm. ONYENWE ANYị na-emebi atụmatụ mba niile; ọ na-emebi ebumnobi ụmụ mmadụ. Atụmatụ ONYENWE ANYị na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi, ebumnobi ya ruo ọgbọ niile.
ABÙ ỌMA 33:1-11 Bible Nso (IGBOB)
Tienu nkpu ọṅù nime Jehova, unu ndi ezi omume: N'ebe ndi ziri ezi nọ otuto mara nma. Werenu ubọ-akwara kele Jehova: Werenu une nke akwara iri bùkue Ya abù ọma. Bùkueune Ya abù ọhu; Werenu iti-nkpu me ka ọkpukpọ-ubọ di nma. N'ihi na okwu Jehova ziri ezi; Anālu kwa ọlu-Ya nile n'ikwesi-ntukwasi-obi. Ọ nāhu ezi omume na ezi ikpé n'anya: Uwa juputara n'ebere jehova. Okwu Jehova ka ejiri me elu-igwe; Eji-kwa-ra iku-ume nke ọnu-Ya me usu-ha nile. Ọ nāchikọta miri oké osimiri dika obo-ihe: Ọ nētiye ob͕u-miri n'ulo-àkù di iche iche. Ka uwa nile tua egwu Jehova: Ka ndi nile ndi bi n'elu-uwa dum madu bi tua ujọ Ya. N'ihi na Ya onwe-ya kwuru okwu, o we di; Ya onwe-ya nyere iwu, o we guzo. Jehova emebiwo ndum-ọdu mba nile: Ọ siwo èchìchè nile nke ndi di iche iche, É-è. Ndum-ọdu Jehova nēguzo rue mb͕e ebighi-ebi, Èchìchè nile nke obi-Ya rue ọb͕ọ nile.