Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ABÙ ỌMA 33

33
1Tienu nkpu ọṅù nime Jehova, unu ndi ezi omume:
N'ebe ndi ziri ezi nọ otuto mara nma.
2Werenu ubọ-akwara kele Jehova:
Werenu une nke akwara iri bùkue Ya abù ọma.
3Bùkueune Ya abù ọhu;
Werenu iti-nkpu me ka ọkpukpọ-ubọ di nma.
4N'ihi na okwu Jehova ziri ezi;
Anālu kwa ọlu-Ya nile n'ikwesi-ntukwasi-obi.
5Ọ nāhu ezi omume na ezi ikpé n'anya:
Uwa juputara n'ebere jehova.
6Okwu Jehova ka ejiri me elu-igwe;
Eji-kwa-ra iku-ume nke ọnu-Ya me usu-ha nile.
7Ọ nāchikọta miri oké osimiri dika obo-ihe:
Ọ nētiye ob͕u-miri n'ulo-àkù di iche iche.
8Ka uwa nile tua egwu Jehova:
Ka ndi nile ndi bi n'elu-uwa dum madu bi tua ujọ Ya.
9N'ihi na Ya onwe-ya kwuru okwu, o we di;
Ya onwe-ya nyere iwu, o we guzo.
10Jehova emebiwo ndum-ọdu mba nile:
Ọ siwo èchìchè nile nke ndi di iche iche, É-è.
11Ndum-ọdu Jehova nēguzo rue mb͕e ebighi-ebi,
Èchìchè nile nke obi-Ya rue ọb͕ọ nile.
12Mba ihe nāgara nke-ọma ka ọ bu, bú mba ahu nke Jehova bu Chineke-ya;
Bú ndi ahu Ọ rọputara iburu Ya ihe-nketa.
13Jehova siri n'elu-igwe legide anya;
Ọ huwo umu madu nile;
14Ọ siwo n'ọnọdu ebe-obibi-Ya
Lekwasi ndi nile bi n'uwa anya;
15Bú Onye ahu Nke nākpu obi ha nile n'otù,
Nke nāghọta kwa ọlu nile nke ha nile.
16Ọ dighi eze anēji uba nke usu-ndi-agha-ya zọputa:
Adighi-eji kwa ike riri nne naputa dike.
17Nání ihe-nrafu ka inyinya bu iji zọputa madu:
Ọ dighi-eji kwa ike-ya riri nne me ka madu wepuga onwe-ya.
18Le, anya Jehova di n'aru ndi nātu egwu Ya,
Bú n'aru ndi nēchere ebere-Ya;
19Inaputa nkpuru-obi-ha n'ọnwu,
Na idebe ha ndu n'oké unwu.
20Nkpuru-obi-ayi echerewo Jehova:
Iye-aka-ayi na ọta-ayi ka Ọ bu.
21N'ihi na ọ bu nime Ya ka obi-ayi nāṅuri ọṅu,
N'ihi na ọ bu aha nsọ Ya ka ayi tukwasiworo obi.
22Jehova, ka ebere-Gi dikwasi ayi,
Dika ayi chereworo Gi.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

ABÙ ỌMA 33: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye