Tienụ mkpu ọṅụ nye ONYENWE ANYị, unu ndị ezi omume; nʼihi na ọ bụ ihe ziri ezi ka ndị obi ha ziri ezi too ya. Werenụ ụbọ akwara too ONYENWE ANYị; werenụ une nke nwere akwara iri kpọọrọ ya egwu. Bụkuonụ ya abụ ọhụrụ; were ǹka kpọọ ụbọ akwara ma tiekwa mkpu ọṅụ. Nʼihi na okwu ONYENWE ANYị niile ziri ezi bụrụkwa eziokwu; o kwesiri ntụkwasị obi nʼọrụ ya niile. ONYENWE ANYị na-ahụ ezi omume na ikpe ziri ezi nʼanya; ụwa niile jupụtara nʼịhụnanya ya nke na-enweghị ọgwụgwụ. Ọ bụ site nʼokwu ọnụ ONYENWE ANYị ka e ji kee eluigwe niile, jirikwa nkuume nke ọnụ ya mee anwụ, na ọnwa na kpakpando niile. Ọ bụ ya kekwara osimiri niile chịkọta ha nʼotu ebe, kpaa oke ebe ha ga-anọ dịka ụlọakụ dị ukwuu. Ka ụwa niile tụọ ONYENWE ANYị egwu; ka mmadụ niile bi nʼụwa sọpụrụ ya. Nʼihi na o kwuru okwu, okwu ahụ mezukwara; o nyere iwu, iwu ahụ guzokwara chịm. ONYENWE ANYị na-emebi atụmatụ mba niile; ọ na-emebi ebumnobi ụmụ mmadụ. Atụmatụ ONYENWE ANYị na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi, ebumnobi ya ruo ọgbọ niile.
Gụọ Abụ Ọma 33
Geere nke a ntị Abụ Ọma 33
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: Abụ Ọma 33:1-11
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị