ABÙ ỌMA 25:8-15
ABÙ ỌMA 25:8-15 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Onye dị mma na onye ezi omume ka ONYENWE ANYị bụ; ọ bụ ya mere ọ na-ezi ndị mmehie ụzọ ya. Ọ na-edu ndị dị umeala nʼobi nʼụzọ ziri ezi, na-ezikwa ha ụzọ nke ya. Ụzọ niile nke ONYENWE ANYị jupụtara nʼịhụnanya na ikwesi ntụkwasị obi, nye ndị niile na-edebe iwu ọgbụgba ndụ ya. Nʼihi aha gị, O ONYENWE ANYị, gbaghara m ajọ omume m nʼagbanyeghị na ha dị ukwuu. Olee mmadụ ahụ nke na-atụ egwu ONYENWE ANYị? O ga-ezi ya ihe nʼụzọ ahụ a họpụtaara ya. Ọ ga-ebi ogologo ụbọchị nke ndụ ya nʼime ịba ụba, ndị agbụrụ ha ga-eketa ala ahụ. ONYENWE ANYị na-eme ka ndị ahụ na-atụ egwu ya mara ọgbụgba ndụ ya na izu nzuzo ya. Anya m abụọ na-elegide ONYENWE ANYị mgbe niile; nʼihi na ọ bụ naanị ya ga-eme ka ụkwụ m abụọ site nʼọnya pụta.
ABÙ ỌMA 25:8-15 Bible Nso (IGBOB)
Onye di nma na onye ziri ezi ka Jehova bu: Nihi nka ka Ọ nēzi ndi-nmehie ihe n'uzọ. Ọ nēme ka ndi di ume-ala n'obi zọ ije n'ikpé: Ọ nēzi kwa ndi di ume-ala n'obi uzọ-Ya. Okporo-uzọ nile nke Jehova bu ebere na ezi-okwu N'ebe ndi nēchezi ọb͕ub͕a-ndu-Ya na ihe-àmà-Ya nile nọ. N'ihi aha-Gi, Jehova, B͕aghara ajọ omumem, n'ihi na o riri nne. Ònye ka ọ bu, bú nwoke nātu egwu Jehova? O gēzi ya ihe n'uzọ ọ nārọputa. Nkpuru-obi-ya gānọ ọnọdu-abali n'ọdi-nma, Nkpuru-ya gēnweta kwa ala. Ìzù nzuzo Jehova diri ndi nātu egwu Ya; Ya na ọb͕ub͕a-ndu-Ya, ime ka ha mara ihe. Anyam abua di n'ebe Jehova nọ mb͕e nile; N'ihi na Ya onwe-ya gēme ka ukwum abua si n'ub͕u puta.