ABÙ ỌMA 25:1-7
ABÙ ỌMA 25:1-7 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ọ bụ na gị ONYENWE ANYị ka m tụkwasịrị obi m. O Chineke m, ọ bụ gị ka m tụkwasịrị obi m. Ekwela ka ihere mee m, ekwekwala ka ndị iro m merie m. Ihere agaghị eme onye ọbụla olileanya ya dị na gị, ma ihere ga-eme ha bụ ndị niile ịghọ aghụghọ jụrụ ahụ. O ONYENWE ANYị, zi m ụzọ gị niile, kuzikwaara m ụzọ gị niile. Duo m nʼeziokwu gị, kuzikwaara m ihe, nʼihi na ị bụ Chineke, onye Nzọpụta m, ụbọchị niile, olileanya m dị na gị. Cheta, ONYENWE ANYị, oke obi ebere na ịhụnanya gị, nʼihi na ha na-adị siterị na mgbe ochie. Echetala mmehie m mere nʼokorobịa m, ya na nnupu isi m niile. Kama site nʼịhụnanya gị cheta m, ONYENWE ANYị, nʼihi na onye dị mma ka ị bụ.
ABÙ ỌMA 25:1-7 Bible Nso (IGBOB)
Gi, Jehova, ka m'nēbuliri nkpuru-obim. Chinekem, na Gi ka m'tukwasiworo obi, Ekwela ka ihere mem; Ekwela ka obi ndi-irom tọ ha utọ n'arum. Ọzọ, ndi nile ndi nēle anya Gi, ihere agaghi-eme ha: Ihere gēme ndi nāghọ aghughọ n'efu. Jehova, me ka m'mara uzọ-gi nile; Zím okporo-uzọ-Gi nile. Mem ka m'zọ ije n'ezi-okwu-Gi, Gi zíkwam ihe; N'ihi na Gi onwe-gi bu Chineke nke nzọputam; Gi ka m'nēle anya Gi ogologo ubọchi nile. Cheta obi-ebere-Gi nile, Jehova, ha na ebere-Gi nile; N'ihi na site na mb͕e ebighi-ebi ka ha diworo. Echetala nmehie nile m'mehiere n'okorọbiam, ha na njehiem nile: Dika ebere-Gi si di Gi onwe-gi chetam, N'ihi idi-nma-Gi, Jehova.