ABÙ ỌMA 25:1-15
ABÙ ỌMA 25:1-15 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ọ bụ na gị ONYENWE ANYị ka m tụkwasịrị obi m. O Chineke m, ọ bụ gị ka m tụkwasịrị obi m. Ekwela ka ihere mee m, ekwekwala ka ndị iro m merie m. Ihere agaghị eme onye ọbụla olileanya ya dị na gị, ma ihere ga-eme ha bụ ndị niile ịghọ aghụghọ jụrụ ahụ. O ONYENWE ANYị, zi m ụzọ gị niile, kuzikwaara m ụzọ gị niile. Duo m nʼeziokwu gị, kuzikwaara m ihe, nʼihi na ị bụ Chineke, onye Nzọpụta m, ụbọchị niile, olileanya m dị na gị. Cheta, ONYENWE ANYị, oke obi ebere na ịhụnanya gị, nʼihi na ha na-adị siterị na mgbe ochie. Echetala mmehie m mere nʼokorobịa m, ya na nnupu isi m niile. Kama site nʼịhụnanya gị cheta m, ONYENWE ANYị, nʼihi na onye dị mma ka ị bụ. Onye dị mma na onye ezi omume ka ONYENWE ANYị bụ; ọ bụ ya mere ọ na-ezi ndị mmehie ụzọ ya. Ọ na-edu ndị dị umeala nʼobi nʼụzọ ziri ezi, na-ezikwa ha ụzọ nke ya. Ụzọ niile nke ONYENWE ANYị jupụtara nʼịhụnanya na ikwesi ntụkwasị obi, nye ndị niile na-edebe iwu ọgbụgba ndụ ya. Nʼihi aha gị, O ONYENWE ANYị, gbaghara m ajọ omume m nʼagbanyeghị na ha dị ukwuu. Olee mmadụ ahụ nke na-atụ egwu ONYENWE ANYị? O ga-ezi ya ihe nʼụzọ ahụ a họpụtaara ya. Ọ ga-ebi ogologo ụbọchị nke ndụ ya nʼime ịba ụba, ndị agbụrụ ha ga-eketa ala ahụ. ONYENWE ANYị na-eme ka ndị ahụ na-atụ egwu ya mara ọgbụgba ndụ ya na izu nzuzo ya. Anya m abụọ na-elegide ONYENWE ANYị mgbe niile; nʼihi na ọ bụ naanị ya ga-eme ka ụkwụ m abụọ site nʼọnya pụta.
ABÙ ỌMA 25:1-15 Bible Nso (IGBOB)
Gi, Jehova, ka m'nēbuliri nkpuru-obim. Chinekem, na Gi ka m'tukwasiworo obi, Ekwela ka ihere mem; Ekwela ka obi ndi-irom tọ ha utọ n'arum. Ọzọ, ndi nile ndi nēle anya Gi, ihere agaghi-eme ha: Ihere gēme ndi nāghọ aghughọ n'efu. Jehova, me ka m'mara uzọ-gi nile; Zím okporo-uzọ-Gi nile. Mem ka m'zọ ije n'ezi-okwu-Gi, Gi zíkwam ihe; N'ihi na Gi onwe-gi bu Chineke nke nzọputam; Gi ka m'nēle anya Gi ogologo ubọchi nile. Cheta obi-ebere-Gi nile, Jehova, ha na ebere-Gi nile; N'ihi na site na mb͕e ebighi-ebi ka ha diworo. Echetala nmehie nile m'mehiere n'okorọbiam, ha na njehiem nile: Dika ebere-Gi si di Gi onwe-gi chetam, N'ihi idi-nma-Gi, Jehova. Onye di nma na onye ziri ezi ka Jehova bu: Nihi nka ka Ọ nēzi ndi-nmehie ihe n'uzọ. Ọ nēme ka ndi di ume-ala n'obi zọ ije n'ikpé: Ọ nēzi kwa ndi di ume-ala n'obi uzọ-Ya. Okporo-uzọ nile nke Jehova bu ebere na ezi-okwu N'ebe ndi nēchezi ọb͕ub͕a-ndu-Ya na ihe-àmà-Ya nile nọ. N'ihi aha-Gi, Jehova, B͕aghara ajọ omumem, n'ihi na o riri nne. Ònye ka ọ bu, bú nwoke nātu egwu Jehova? O gēzi ya ihe n'uzọ ọ nārọputa. Nkpuru-obi-ya gānọ ọnọdu-abali n'ọdi-nma, Nkpuru-ya gēnweta kwa ala. Ìzù nzuzo Jehova diri ndi nātu egwu Ya; Ya na ọb͕ub͕a-ndu-Ya, ime ka ha mara ihe. Anyam abua di n'ebe Jehova nọ mb͕e nile; N'ihi na Ya onwe-ya gēme ka ukwum abua si n'ub͕u puta.