ABÙ ỌMA 119:81-120
ABÙ ỌMA 119:81-120 Bible Nso (IGBOB)
Nkpuru-obim agwusiwo site n'ichọsi nzọputa-Gi ike: Ma okwu-Gi ka m'chereworo. Anyam abua adalawo n'isi site n'ichọsi okwu-Gi ike, Mb͕e m'nāsi, Òle mb͕e I gākasim obi? N'ihi na adiwom ka karama-akpukpọ di n'anwuru-ọku; Ma echezọghm ukpuru-Gi nile. Ùbọchi nke orù-Gi di ole? Òle mb͕e I gēme ndi nēsob͕um ihe I kpere n'ikpe? Ndi-nganga egwuworom olùlù di iche iche, Bú ndi nādighi ka iwu-Gi si di. Ihe nile I nyere n'iwu kwesiri ntukwasi-obi: N'uzọ okwu-ugha ka ha nēsob͕um; biko, yerem aka. Ọ fọduru nwantī ka ha me ka m'gwusia n'uwa; Ma mu onwem arapughi ihe-iriba-ama-Gi nile. Dika ebere-Gi si di, me ka m'di ndu, M'gēdebe kwa ihe-àmà nke ọnu-Gi. Jehova, rue mb͕e ebighi-ebi Ka emeworo ka okwu-Gi guzosie ike n'elu-igwe. Rue ọb͕ọ nile ka ikwesi-ntukwasi-obi-Gi di: I mewo ka uwa guzosie ike, o we guzo. Dika ikpé-Gi nile si di, ha nēguzo ta; N'ihi na ihe nile bu ndi-orù-Gi. Asi na iwu-Gi abughi ihe nātọm utọ nke-uku, Mb͕e ahu m'gālawori n'iyì nime nweda-n'alam. Rue mb͕e ebighi-ebi m'gaghi-echezọ ihe-iriba-ama-Gi nile: N'ihi na ha ka I jiworo me ka m'di ndu. Ọ bu Gi nwem, zọputam; N'ihi na ihe-iriba-ama-Gi nile ka m'chọworo. Ndi nēmebi iwu elewo anyam ime ka m'la n'iyì; Ma ihe-àmà-Gi nile ka m'gātukwasi uche. Ahuwom nsọtu diri izu-okè nile; Ma ihe, I nyere n'iwu sara mbara nke-uku. Le ka m'si hu iwu-Gi n'anya! Ogologo ubọchi nile ka nke ahu bu ihe m'natughari n'uche. Ihe nile I nyere n'iwu nēme ka m'mara ihe kari ndi-irom; N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka nke ahu dirim. Kari ndi nile nēzím ihe ka m'nwere uche; N'ihi na ihe-àmà-Gi nile bu ihe m'nātughari n'uche. Anamaghọta ihe kari ndi-okenye, N'ihi na ihe-iriba-ama-Gi nile ka m'chebeworo. Eb͕ochiwom ukwum abua ka ha ghara ibà n'uzọ ọjọ ọ bula, Ka m'we debe okwu-Gi. Esighm n'ikpé-Gi nile wezuga onwem; N'ihi na I zíwom ihe. Le ka okwu-ọnu-Gi si atọ okpo-ọnum utọ! Ha nātọ ọnum utọ kari manu-aṅu. M'nēsitei n'ihe-iriba-ama-Gi nile ghọta ihe: N'ihi nka ka m'kpọworo uzọ okwu-ugha ọ bula asì. Okwu-Gi bu oriọna diri ukwum, Ọ bu kwa ìhè diri okporo-uzọm. Aṅuwom iyi, me ka o guzosie ike, Na m'gēdebe ikpé nile nke ezi omume-Gi. Ewedawom n'ala nke-uku: Me ka m'di ndu, Jehova, dika okwu-Gi si di. Biko, ka onyinye-afọ-ofufo nile nke ọnum tọ Gi utọ, Jehova, Zíkwam ikpé-Gi nile. Nkpuru-obim di n'ọbu-akam mb͕e nile; Ma echezọghm iwu-Gi. Ndi nēmebi iwu esiworom ọnya; Ma esighm nihe-iriba-ama-Gi nile fugharia. Eketawom ihe-àmà-Gi nile rue mb͕e ebighi-ebi; N'ihi na ihe nātọ obim utọ ka ha bu. Ewezugawom obim ime ukpuru-Gi nile, Rue mb͕e ebighi-ebi, rue mb͕e ikpe-azu. Ndi nwere uche abua ka m'kpọworo asì: Ma iwu-Gi ka m'huworo n'anya. Ebe-nzuzom na ọtam ka I bu: Okwu-Gi ka m'chereworo. Sinu n'ebe m'nọ wezuga onwe-unu, unu ndi nēme ihe ọjọ; Ka m'we chebe ihe nile Chinekem nyere n'iwu. Kwagidem dika okwu-ọnu-Gi si di, ka m'we di ndu; Eme-kwa-la ka ihere olile-anyam mem. Kwaliem elu, ewe zọputam, M'gēle kwa ukpuru-Gi nile anya ọma mb͕e nile. I ledawo ndi nile si n'ukpuru nile Gi jehie anya, N'ihi na okwu-ugha ka aghughọ-ha bu. I nēme ka ndi nile nēmebi iwu n'uwa gwusia di ka ifuru: N'ihi ya ka m'huworo ihe-àmà-Gi nile n'anya. Aji anu-arum guzoro ọtọ site n'oké egwu-Gi; Ọ bu kwa ikpé-Gi nile ka m'nātu egwu ha.
ABÙ ỌMA 119:81-120 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Mkpụrụobi m na-ada mba site nʼọchịchọ ya maka nzọpụta gị, ma olileanya m dị nʼokwu gị. Anya na-egbu m mgbu ebe m na-ele anya nkwa gị; ana m asị, “Olee mgbe ị ga-akasị m obi?” Nʼagbanyeghị na adị m ka karama akpụkpọ nke dị nʼanwụrụ ọkụ, anaghị m echefu iwu gị niile. Ruo olee mgbe ka ohu gị ga-anọgide na-eche? Olee mgbe ka ị ga-ata ndị na-akpagbu m ahụhụ? Ndị mpako na-egwuru m olulu, bụ ihe nke na-adịghị ka iwu gị si dị. Iwu gị niile kwesiri ntụkwasị obi; nyere m aka, nʼihi na ndị mmadụ na-akpagbu m ma o nweghị ihe m mere ha. Ọ fọdụrụ ntakịrị ihe, ha gaara ala m nʼiyi, ma agbakụtaghị m ụkpụrụ gị azụ. Site nʼịhụnanya gị nke na-adịgide chebe ndụ m, ka m nwe ike rube isi nʼiwu nke ọnụ gị. O ONYENWE ANYị, okwu gị na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi; ọ na-eguzosi ike nʼeluigwe. Ikwesi ntụkwasị obi gị na-adịgide site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ; ọ bụ gị kere ụwa, ọ na-eguzosikwa ike. Ruo taa, iwu gị niile na-eguzosi ike, nʼihi na ihe niile na-ejere gị ozi. A sịkwarị na iwu gị anaghị amasị m, agaara m anwụ nʼime nsogbu m. Agaghị m echefu ụkpụrụ gị niile, nʼihi na ọ bụ ha ka i ji chebe ndụ m. Zọpụta m, nʼihi na abụ m nke gị; achọpụtala m ụkpụrụ gị niile. Ndị ajọ omume na-eche ịla m nʼiyi, ma aga m atụgharị uche nʼụkpụrụ gị. Ana m ahụ nsọtụ ihe niile zuruoke, ma iwu gị niile enweghị nsọtụ. O, otu m si hụ iwu gị nʼanya! Ana m atụgharị uche na ya ogologo ụbọchị niile. Iwu gị na-eme ka amamihe m karịa nke ndị iro m, ha na-anọnyere m oge niile. Enwere m nghọta karịa ndị na-ezi m ihe, nʼihi na ana m atụgharịa uche nʼiwu gị niile. Enwere m nghọta karịa ndị okenye nʼihi na ana m erubere ụkpụrụ gị niile isi. Ajụrụ m ajụ ije ije nʼụzọ ọjọọ ọbụla ka m nwee ike rubere okwu gị isi Ewezugaghị m onwe m nʼiwu gị niile, nʼihi na ọ bụ gị onwe gị ziri m ha. Lee ka okwu gị niile si atọ m ụtọ, ha dị ụtọ nʼọnụ m karịa mmanụ aṅụ! A na-enweta nghọta site nʼụkpụrụ gị niile; ya mere ana m akpọ ụzọ ọjọọ ọbụla asị. Okwu gị bụ oriọna dịrị ụkwụ m bụrụkwa ìhè nʼụzọ m. Aṅụọla m iyi, mee ka o guzosie ike, na aga m agbaso iwu ezi omume gị niile. Ataala m ahụhụ nke ukwuu; chebe ndụ m, o ONYENWE ANYị, dịka okwu gị si dị. O ONYENWE ANYị, nabata otuto afọ ofufu niile nke si nʼọnụ m, kuziekwara m iwu gị niile. Mkpụrụobi m na-adị m nʼọbụaka m oge niile, ma echezọghị m iwu gị. Ndị ajọ omume esielera m ọnya, ma esitebeghị m nʼụkpụrụ gị kpafuo. Iwu gị niile bụ ihe nketa m ruo mgbe ebighị ebi; ha bụ ihe na-enye obi m ọṅụ. Obi m ekpebiela idebe ụkpụrụ gị ruo na ngwụcha. Ana m akpọ ndị na-enwe obi abụọ asị, ma ahụrụ m iwu gị nʼanya. Ị bụ ebe mgbaba m na ọta m; olileanya m dị nʼokwu gị. Sitenụ nʼebe m nọ pụọ, unu ndị na-eme ihe ọjọọ, ka m nwee ike idebe iwu niile nke Chineke m! Gbaa m ume dịka nkwa gị si dị, aga m adịkwa ndụ; ekwekwala ka olileanya m daa. Kwagide m, aga m abụ onye a gbapụtara; aga m anọgide na-asọpụrụ iwu gị niile. Ị na-ajụ ndị niile na-adịghị edebe iwu gị, nzube aghụghọ ha niile bụ ihe na-enweghị isi. Ị na-ekpochapụ ndị ajọ omume dịka unyi a na-ekpofu ekpofu; nʼihi ya, ahụrụ m ụkpụrụ gị niile nʼanya. Anụ ahụ m na-ama jijiji nʼihi ịtụ egwu gị; ana m eguzo nʼoke egwu nʼihi iwu gị niile.