Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Abụ Ọma 119:81-120

Abụ Ọma 119:81-120 BIU

Mkpụrụobi m na-ada mba site nʼọchịchọ ya maka nzọpụta gị, ma olileanya m dị nʼokwu gị. Anya na-egbu m mgbu ebe m na-ele anya nkwa gị; ana m asị, “Olee mgbe ị ga-akasị m obi?” Nʼagbanyeghị na adị m ka karama akpụkpọ nke dị nʼanwụrụ ọkụ, anaghị m echefu iwu gị niile. Ruo olee mgbe ka ohu gị ga-anọgide na-eche? Olee mgbe ka ị ga-ata ndị na-akpagbu m ahụhụ? Ndị mpako na-egwuru m olulu, bụ ihe nke na-adịghị ka iwu gị si dị. Iwu gị niile kwesiri ntụkwasị obi; nyere m aka, nʼihi na ndị mmadụ na-akpagbu m ma o nweghị ihe m mere ha. Ọ fọdụrụ ntakịrị ihe, ha gaara ala m nʼiyi, ma agbakụtaghị m ụkpụrụ gị azụ. Site nʼịhụnanya gị nke na-adịgide chebe ndụ m, ka m nwe ike rube isi nʼiwu nke ọnụ gị. O ONYENWE ANYị, okwu gị na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi; ọ na-eguzosi ike nʼeluigwe. Ikwesi ntụkwasị obi gị na-adịgide site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ; ọ bụ gị kere ụwa, ọ na-eguzosikwa ike. Ruo taa, iwu gị niile na-eguzosi ike, nʼihi na ihe niile na-ejere gị ozi. A sịkwarị na iwu gị anaghị amasị m, agaara m anwụ nʼime nsogbu m. Agaghị m echefu ụkpụrụ gị niile, nʼihi na ọ bụ ha ka i ji chebe ndụ m. Zọpụta m, nʼihi na abụ m nke gị; achọpụtala m ụkpụrụ gị niile. Ndị ajọ omume na-eche ịla m nʼiyi, ma aga m atụgharị uche nʼụkpụrụ gị. Ana m ahụ nsọtụ ihe niile zuruoke, ma iwu gị niile enweghị nsọtụ. O, otu m si hụ iwu gị nʼanya! Ana m atụgharị uche na ya ogologo ụbọchị niile. Iwu gị na-eme ka amamihe m karịa nke ndị iro m, ha na-anọnyere m oge niile. Enwere m nghọta karịa ndị na-ezi m ihe, nʼihi na ana m atụgharịa uche nʼiwu gị niile. Enwere m nghọta karịa ndị okenye nʼihi na ana m erubere ụkpụrụ gị niile isi. Ajụrụ m ajụ ije ije nʼụzọ ọjọọ ọbụla ka m nwee ike rubere okwu gị isi Ewezugaghị m onwe m nʼiwu gị niile, nʼihi na ọ bụ gị onwe gị ziri m ha. Lee ka okwu gị niile si atọ m ụtọ, ha dị ụtọ nʼọnụ m karịa mmanụ aṅụ! A na-enweta nghọta site nʼụkpụrụ gị niile; ya mere ana m akpọ ụzọ ọjọọ ọbụla asị. Okwu gị bụ oriọna dịrị ụkwụ m bụrụkwa ìhè nʼụzọ m. Aṅụọla m iyi, mee ka o guzosie ike, na aga m agbaso iwu ezi omume gị niile. Ataala m ahụhụ nke ukwuu; chebe ndụ m, o ONYENWE ANYị, dịka okwu gị si dị. O ONYENWE ANYị, nabata otuto afọ ofufu niile nke si nʼọnụ m, kuziekwara m iwu gị niile. Mkpụrụobi m na-adị m nʼọbụaka m oge niile, ma echezọghị m iwu gị. Ndị ajọ omume esielera m ọnya, ma esitebeghị m nʼụkpụrụ gị kpafuo. Iwu gị niile bụ ihe nketa m ruo mgbe ebighị ebi; ha bụ ihe na-enye obi m ọṅụ. Obi m ekpebiela idebe ụkpụrụ gị ruo na ngwụcha. Ana m akpọ ndị na-enwe obi abụọ asị, ma ahụrụ m iwu gị nʼanya. Ị bụ ebe mgbaba m na ọta m; olileanya m dị nʼokwu gị. Sitenụ nʼebe m nọ pụọ, unu ndị na-eme ihe ọjọọ, ka m nwee ike idebe iwu niile nke Chineke m! Gbaa m ume dịka nkwa gị si dị, aga m adịkwa ndụ; ekwekwala ka olileanya m daa. Kwagide m, aga m abụ onye a gbapụtara; aga m anọgide na-asọpụrụ iwu gị niile. Ị na-ajụ ndị niile na-adịghị edebe iwu gị, nzube aghụghọ ha niile bụ ihe na-enweghị isi. Ị na-ekpochapụ ndị ajọ omume dịka unyi a na-ekpofu ekpofu; nʼihi ya, ahụrụ m ụkpụrụ gị niile nʼanya. Anụ ahụ m na-ama jijiji nʼihi ịtụ egwu gị; ana m eguzo nʼoke egwu nʼihi iwu gị niile.