Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ABÙ ỌMA 119:121-152

ABÙ ỌMA 119:121-152 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Emeela m ihe dị mma na ihe ziri ezi; ahapụkwala m nʼaka ndị na-emegbu m. Kwee ohu gị nkwa na ị ga-elekọta ya; ekwela ka ndị mpako kpagbuo m. Anya na-egbu m mgbu ebe m na-ele anya nzọpụta gị ebe m na-ele anya nkwa gị ziri ezi. Biko mesoo ohu gị mmeso dịka ịhụnanya gị si dị ma kuziekwara m ụkpụrụ gị niile. Abụ m ohu gị, nye m nghọta, ka m nwee ike mara ụkpụrụ gị niile. O ONYENWE ANYị, oge eruola mgbe ị ga-arụ ọrụ, nʼihi na a na-emebi iwu gị. Nʼihi na ahụrụ m iwu gị niile nʼanya karịa ọlaedo, e karịa ọlaedo a nụchara anụcha, nʼihi na m na-ahụta ụkpụrụ gị niile ka ihe ziri ezi, akpọrọ m ụzọ niile na-ezighị ezi asị. Iwu gị niile dị ịtụnanya; ya mere, ana m erubere ha isi. Mkpughepụ na nkọwa nke okwu gị na-enye ìhè; ọ na-eme ka ndị na-enweghị uche ghọta ihe. Ana m asaghe ọnụ m na-ekupụ ume ike ike, na-achọsi iwu gị niile ike. Chee m ihu, meere m ebere, dịka i si emere ndị niile hụrụ aha gị nʼanya ebere. Mee ka nzọ ụkwụ m niile na-aga dịka okwu gị si dị; ekwela ka mmehie chịa m. Gbapụta m site nʼaka ndị na-emegbu m, ka m nwee ike debe iwu gị. Mee ka ihuọma gị dịkwasị nʼahụ ohu gị. Kuziere m ụkpụrụ gị niile. Anya mmiri akwa na-agba m nke ukwuu nʼihi na ndị mmadụ adịghị erube isi nye iwu gị. O ONYENWE ANYị, ị bụ onye ezi omume, iwu gị niile zikwara ezi. Ụkpụrụ gị niile ziri ezi; ha kwesiri ntụkwasị obi. Nʼihi na ndị iro m na-elefu okwu gị anya, ịnụ ọkụ nʼobi m na-ada mba. Nkwa gị niile bụ ihe enyochara nke ọma, ohu gị na-ahụkwa ha nʼanya. Ọ bụ ezie na m bụ onye dị ala, na onye a na-eleda anya, ma adịghị m eleda ụkpụrụ gị niile anya. Ezi omume gị na-adị ruo mgbe ebighị ebi. Iwu gị niile bụkwa eziokwu. Nsogbu na ihe mgbu adakwasịla m, ma iwu gị niile bụ ihe na-amasị m. Iwu gị niile bụ ezi omume ruo mgbe ebighị ebi; nye m nghọta, ka m nwe ike dị ndụ. Eji m obi m niile na-akpọ oku; zaa m o ONYENWE ANYị, aga m erubekwa isi nye ụkpụrụ gị niile. Ana m akpọku gị; zọpụta m aga m erube isi nye ụkpụrụ gị niile. Tupu chị na-abọ, ana m ebili, na-akwa akwa maka enyemaka; olileanya m dị nʼokwu gị. Ana m amụ anya abalị nʼelu ihe ndina m, nʼihi ịtụgharị uche na nkwa gị niile. Nụrụ olu m dịka ịhụnanya gị si dị; chebe ndụ m, o ONYENWE ANYị, dịka iwu gị niile si dị. Ndị na-atụpụta atụmatụ ọjọọ nọ nso ma ha nọ iwu gị niile nʼebe dị anya. Ma ị nọ nso, ONYENWE ANYị; ihe niile i nyere nʼiwu bụ eziokwu. Site na mgbe ochie ka m mụtara site nʼụkpụrụ gị, na i mere ka ha guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi.

ABÙ ỌMA 119:121-152 Bible Nso (IGBOB)

Emewom ikpe ekpere na ezi omume: Arapulam nye ndi nēmeb͕um. Buru onye-mbe nye orù-Gi na I gēmem nma: Ekwela ka ndi-nganga meb͕uem. Anyam abua adalawo n'isi n'ichọsi nzọputa-Gi ike, Na n'ichọsi okwu ezi omume-Gi ike. Meso orù-Gi dika ebere-Gi si di, Zíkwam ukpuru-Gi nile Orù-Gi ka m'bu, me ka m'ghọta ihe, Ka m'we mara ihe-àmà-Gi nile. Mb͕e eruworo Jehova ilu ọlu; Ha emebiwo iwu-Gi. N'ihi nka ka m'huworo ihe nile I nyere n'iwu n'anya Kari ọla-edo, e, kari ọla-edo anuchara anucha. N'ihi nka ka m'guworo ihe-iriba-ama-Gi nile, nke diri ihe nile, n'ihe ziri ezi; Uzọ okwu-ugha ọ bula ka m'kpọworo asì. Oké ọlu ka ihe-àmà-Gi nile bu: N'ihi nka ka nkpuru-obim chebeworo ha. Nkpughepu okwu-Gi nile nēnye ìhè; Ọ nēmeka ndi nēnweghi uche ghọta ihe. Asaghepurum ọnum, ku kwa ume ike ike; N'ihi na achọsirim ihe nile I nyere n'iwu ike. Chem iru, me-kwa-ram amara, Dika I si eme ndi nāhu aha-Gi n'anya. Me ka nzọ-ukwum nile guzosie ike n'okwu-ọnu-gi: Ekwe-kwa-la ka ajọ ihe ọ bula buru onye-isim. B͕aputam na nmeb͕u nke madu: M'gēdebe kwa ihe-iriba-ama-Gi nile. Me ka iru-Gi nye orù-Gi ìhè; Zíkwam ukpuru-Gi nile. Anya-miri nke di ka ọtutu miri-iyi nāb͕a anyam abua, N'ihi na ha edebeghi iwu-Gi. Onye ezi omume ka I bu Jehova, Ọzọ, ihe ziri ezi ka ikpé-Gi nile bu. I nyewo ihe-àmà-Gi nile iwu n'ezi omume Na ikwesi-ntukwasi-obi di uku. Ekworom ekpochapuwom, N'ihi na ndi nākpab͕um echezọwo okwu-Gi nile. Ihe anuchara anucha nke-uku ka okwu-ọnu-Gi bu; Orù-Gi ahuwo kwa ya n'anya. Onye ntà ka m'bu, na onye anēleda anya: Ma echezọghm ihe-iriba-ama-Gi nile. Ezi omume-Gi bu ezi omume nādiru mb͕e ebighi-ebi, Iwu-Gi bu kwa ezi-okwu Ahuhu na nkpà achọtawom: Ma ihe nile I nyere n'iwu bu ihe nātọm utọ nke-uku. Ihe-àmà-Gi nile bu ezi omume rue mb͕e ebighi-ebi: Me ka m'ghọta ihe, m'gādi kwa ndu. Ewerewom obim nile kpọ nkpu; zam, Jehova: Ukpuru-Gi nile ka m'gēchebe. Akpọkuwom I; zọputam, M'gēdebe kwa ihe-àmà-Gi nile. Eburum chi-ọbubọ uzọ, we tikue Gi: Okwu-Gi nile ka m'chere. Anyam abua buru nche-abali nile uzọ, Ka m'we tugharia uche n'okwu-ọnu-Gi. Nuru olum, dika ebere-Gi si di: Dika ikpé-Gi nile si di, Jehova, me ka m'di ndu. Ha abiaruwo nso bú ndi nāb͕aso nzube ọjọ; Ha nọ iwu-Gi n'ebe di anya. Gi onwe-gi nọ nso, Jehova; Ọzọ, ihe nile I nyere n'iwu bu ezi-okwu. Site na mb͕e ochie ka m'maworo site n'ihe-àmà-Gi nile, Na rue mb͕e ebighi-ebi ka I tọworo ntọ-ala-ha.