Emeela m ihe dị mma na ihe ziri ezi;
ahapụkwala m nʼaka ndị na-emegbu m.
Kwee ohu gị nkwa na ị ga-elekọta ya;
ekwela ka ndị mpako kpagbuo m.
Anya na-egbu m mgbu ebe m na-ele anya nzọpụta gị
ebe m na-ele anya nkwa gị ziri ezi.
Biko mesoo ohu gị mmeso dịka ịhụnanya gị si dị
ma kuziekwara m ụkpụrụ gị niile.
Abụ m ohu gị, nye m nghọta,
ka m nwee ike mara ụkpụrụ gị niile.
O ONYENWE ANYị, oge eruola mgbe ị ga-arụ ọrụ,
nʼihi na a na-emebi iwu gị.
Nʼihi na ahụrụ m iwu gị niile nʼanya
karịa ọlaedo, e karịa ọlaedo a nụchara anụcha,
nʼihi na m na-ahụta ụkpụrụ gị niile ka ihe ziri ezi,
akpọrọ m ụzọ niile na-ezighị ezi asị.
Iwu gị niile dị ịtụnanya;
ya mere, ana m erubere ha isi.
Mkpughepụ na nkọwa nke okwu gị na-enye ìhè;
ọ na-eme ka ndị na-enweghị uche ghọta ihe.
Ana m asaghe ọnụ m na-ekupụ ume ike ike,
na-achọsi iwu gị niile ike.
Chee m ihu, meere m ebere,
dịka i si emere ndị niile hụrụ aha gị nʼanya ebere.
Mee ka nzọ ụkwụ m niile na-aga dịka okwu gị si dị;
ekwela ka mmehie chịa m.
Gbapụta m site nʼaka ndị na-emegbu m,
ka m nwee ike debe iwu gị.
Mee ka ihuọma gị dịkwasị nʼahụ ohu gị.
Kuziere m ụkpụrụ gị niile.
Anya mmiri akwa na-agba m nke ukwuu
nʼihi na ndị mmadụ adịghị erube isi nye iwu gị.
O ONYENWE ANYị, ị bụ onye ezi omume,
iwu gị niile zikwara ezi.
Ụkpụrụ gị niile ziri ezi;
ha kwesiri ntụkwasị obi.
Nʼihi na ndị iro m na-elefu okwu gị anya,
ịnụ ọkụ nʼobi m na-ada mba.
Nkwa gị niile bụ ihe enyochara nke ọma,
ohu gị na-ahụkwa ha nʼanya.
Ọ bụ ezie na m bụ onye dị ala, na onye a na-eleda anya,
ma adịghị m eleda ụkpụrụ gị niile anya.
Ezi omume gị na-adị ruo mgbe ebighị ebi.
Iwu gị niile bụkwa eziokwu.
Nsogbu na ihe mgbu adakwasịla m,
ma iwu gị niile bụ ihe na-amasị m.
Iwu gị niile bụ ezi omume ruo mgbe ebighị ebi;
nye m nghọta, ka m nwe ike dị ndụ.
Eji m obi m niile na-akpọ oku; zaa m o ONYENWE ANYị,
aga m erubekwa isi nye ụkpụrụ gị niile.
Ana m akpọku gị; zọpụta m
aga m erube isi nye ụkpụrụ gị niile.
Tupu chị na-abọ, ana m ebili, na-akwa akwa maka enyemaka;
olileanya m dị nʼokwu gị.
Ana m amụ anya abalị nʼelu ihe ndina m,
nʼihi ịtụgharị uche na nkwa gị niile.
Nụrụ olu m dịka ịhụnanya gị si dị;
chebe ndụ m, o ONYENWE ANYị, dịka iwu gị niile si dị.
Ndị na-atụpụta atụmatụ ọjọọ nọ nso
ma ha nọ iwu gị niile nʼebe dị anya.
Ma ị nọ nso, ONYENWE ANYị;
ihe niile i nyere nʼiwu bụ eziokwu.
Site na mgbe ochie ka m mụtara site nʼụkpụrụ gị,
na i mere ka ha guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi.