ABÙ ỌMA 119:1-8
ABÙ ỌMA 119:1-8 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ndị a gọziri agọzi ka ha bụ, bụ ndị ụzọ ha na-enweghị ihe ịta ụta ọbụla, ndị na-ejegharị dịka iwu ONYENWE ANYị si dị. Ndị a gọziri agọzi ka ha bụ, bụ ndị na-edebe ụkpụrụ ya ma jirikwa obi ha niile na-achọsi ya ike. Ha adịghị eme ihe ọjọọ ọbụla; ha na-ejegharị nʼụzọ ya niile. I doola ụkpụrụ ndị a ga-erubekwara isi. Ọ ga-adị m mma ma ọ bụrụ na m anọgidesie ike na-erube isi nye iwu gị niile! Mgbe ahụ, ihere agaghị eme m mgbe m tulere uche nʼiwu gị niile. Aga m eji obi ziri ezi too gị dịka m na-amụ ihe banyere iwu gị ziri ezi. Aga m erubere iwu gị niile isi; biko ahapụkwala m.
ABÙ ỌMA 119:1-8 Bible Nso (IGBOB)
Ndi ihe nāgara nke-ọma ka ndi zuru okè n'uzọ Jehova bu, Ndi nējeghari n'iwu jehova. Ndi ihe nāgara nke-ọma ka ndi nēchebe ihe-àmà-Ya nile bu, Ndi nēwere obi-ha nile chọ Ya. E, ha emeghi ajọ omume; N'uzọ-Ya nile ka ha nēje ije. Gi onwe-gi ewerewo ihe-iriba-ama-Gi nye ayi n'iwu, Ka ayi we debesie ha ike. Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na edoziwo uzọm nile Idebe ukpuru-Gi nile! Mb͕e ahu ihere agaghi-emem, Mb͕e m'nēlegide anya n'ebe ihe nile I nyere n'iwu di. M'gēwere obi ziri ezi kele Gi, Mb͕e m'mutara ikpé nile nke ezí omume-Gi. Ukpuru-Gi nile ka m'gēdebe: Arapusilam arapu.