Ndị a gọziri agọzi ka ha bụ, bụ ndị ụzọ ha na-enweghị ihe ịta ụta ọbụla, ndị na-ejegharị dịka iwu ONYENWE ANYị si dị. Ndị a gọziri agọzi ka ha bụ, bụ ndị na-edebe ụkpụrụ ya ma jirikwa obi ha niile na-achọsi ya ike. Ha adịghị eme ihe ọjọọ ọbụla; ha na-ejegharị nʼụzọ ya niile. I doola ụkpụrụ ndị a ga-erubekwara isi. Ọ ga-adị m mma ma ọ bụrụ na m anọgidesie ike na-erube isi nye iwu gị niile! Mgbe ahụ, ihere agaghị eme m mgbe m tulere uche nʼiwu gị niile. Aga m eji obi ziri ezi too gị dịka m na-amụ ihe banyere iwu gị ziri ezi. Aga m erubere iwu gị niile isi; biko ahapụkwala m.
Gụọ Abụ Ọma 119
Geere nke a ntị Abụ Ọma 119
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: Abụ Ọma 119:1-8
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị