ABÙ ỌMA 119:1-48
ABÙ ỌMA 119:1-48 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ndị a gọziri agọzi ka ha bụ, bụ ndị ụzọ ha na-enweghị ihe ịta ụta ọbụla, ndị na-ejegharị dịka iwu ONYENWE ANYị si dị. Ndị a gọziri agọzi ka ha bụ, bụ ndị na-edebe ụkpụrụ ya ma jirikwa obi ha niile na-achọsi ya ike. Ha adịghị eme ihe ọjọọ ọbụla; ha na-ejegharị nʼụzọ ya niile. I doola ụkpụrụ ndị a ga-erubekwara isi. Ọ ga-adị m mma ma ọ bụrụ na m anọgidesie ike na-erube isi nye iwu gị niile! Mgbe ahụ, ihere agaghị eme m mgbe m tulere uche nʼiwu gị niile. Aga m eji obi ziri ezi too gị dịka m na-amụ ihe banyere iwu gị ziri ezi. Aga m erubere iwu gị niile isi; biko ahapụkwala m. Olee ụzọ nwa okorobịa ga-esi bie ndụ dị nsọ? Ọ bụ site nʼibi ndụ dịka okwu gị si dị. Eji m obi m niile na-achọsi gị ike. Ekwela ka m kpafuo site nʼihe niile i nyere nʼiwu. Ezoola m okwu gị niile nʼobi m, igbochi m imehie imegide gị. Otuto dịrị gị, o ONYENWE ANYị; kuziere m iwu gị niile. Aga m eji egbugbere ọnụ m gụgharịa iwu niile nke si nʼọnụ gị. Ana m aṅụrị ọṅụ nʼịgbaso iwu gị niile dịka mmadụ si aṅụrị ọṅụ nʼime oke ịba ụba. Ana m atụgharị uche nʼụkpụrụ gị na-atulekwa uche nʼụzọ gị niile. Iwu gị na-amasị m; agaghị m elefu okwu gị anya. Meere ohu gị ihe ọma, ka m nwe ike dị ndụ; aga m erubere okwu gị isi. Kpughee anya m abụọ ka m hụ oke ihe ebube niile dị iche iche dị nʼime okwu gị. Abụ m onye ọbịa nʼelu ụwa; ezonarịla m iwu gị niile. Nʼoge niile, ihe banyere iwu gị niile na-agụ mkpụrụobi m agụụ. Ị na-abara ndị mpako mba, ha bụ ndị a bụrụ ọnụ na ndị na-anaghị agbaso iwu gị. Site nʼebe m nọ wepụ ịchị ọchị na nlelị, nʼihi na m na-edebe ụkpụrụ gị niile. Nʼagbanyeghị na ndịisi nọkọrọ na-ekwulu m, ohu gị ga-atụgharị uche nʼiwu gị. Ụkpụrụ gị niile bụ ihe na-amasị m; ha bụ ndị ndụmọdụ m. Mkpụrụobi m na-arapara nʼuzuzu; kpọghachite ndụ m dịka okwu gị si dị. Akọwaara m gị ụzọ m niile, ị zakwara m; ugbu a, kuziere m iwu gị. Mee ka m ghọta ozizi ụkpụrụ gị; ka m nwe ike tụgharịa uche nʼọrụ ebube gị niile. Iru ụjụ emeela ka mkpụrụobi m daa mba; gbaa m ume dịka okwu gị si dị. Chebe m pụọ nʼụzọ aghụghọ niile; site nʼiwu gị meere m amara. Ahọrọla m ụzọ ikwesi ntụkwasị obi; e kpebiela m idebe obi m nʼiwu gị niile. O ONYENWE ANYị, ana m ejigidesi iwu gị niile aka ike; ekwela ka ihere mee m. Aga m agbaso iwu gị niile nʼihi na i meela ka obi m nwere onwe ya. O ONYENWE ANYị, zi m ụzọ m ga-esi gbasoo iwu gị niile; mgbe ahụ, aga m edebe ha ruo nʼọgwụgwụ. Nye m nghọta, aga m edebe iwu gị ma jiri obi m niile rubere ya isi. Duo m nʼụzọ nke iwu gị niile, nʼihi na ọ bụ nʼime ha ka m na-achọta obi ụtọ. Mee ka obi m chee ihu nʼiwu gị niile ọ bụghị nye uru na-esite nʼọchịchọ nke onwe. Wepụ anya m site nʼihe na-abaghị uru; chebe ndụ m dịka okwu gị si dị. Mezuo nkwa i kwere ohu gị, ka a tụọ egwu gị. Wepụ nkọcha nke m na-atụ egwu ya, nʼihi na iwu gị niile ziri ezi. Ụkpụrụ gị na-agụsị m agụụ ike! Chebe ndụ m site nʼezi omume gị. O ONYENWE ANYị, ka ịhụnanya gị nke na-adịgide bịakwasị m, nzọpụta gị dịka nkwa i kwere si dị; mgbe ahụ, aga m azaghachi onye ahụ na-achị m ọchị, nʼihi na ana m atụkwasị obi m nʼokwu gị. Esitela nʼọnụ m napụ okwu nke eziokwu, nʼihi na olileanya m dị nʼiwu gị niile. Aga m anọgide na-erubere iwu gị isi ruo mgbe ebighị ebi. Aga m ejegharị nʼọnọdụ inwere onwe nʼihi na achọpụtala m ụkpụrụ gị niile. Aga m ekwupụta banyere ụkpụrụ gị nʼihu ndị eze ma ihere agaghị eme m, nʼihi na iwu gị na-amasị m nʼihi na ahụrụ m ha nʼanya. Ana m eweliri iwu gị niile aka elu, bụ ndị m hụrụ nʼanya, ana m atụgharịkwa uche nʼiwu gị niile.
ABÙ ỌMA 119:1-48 Bible Nso (IGBOB)
Ndi ihe nāgara nke-ọma ka ndi zuru okè n'uzọ Jehova bu, Ndi nējeghari n'iwu jehova. Ndi ihe nāgara nke-ọma ka ndi nēchebe ihe-àmà-Ya nile bu, Ndi nēwere obi-ha nile chọ Ya. E, ha emeghi ajọ omume; N'uzọ-Ya nile ka ha nēje ije. Gi onwe-gi ewerewo ihe-iriba-ama-Gi nye ayi n'iwu, Ka ayi we debesie ha ike. Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na edoziwo uzọm nile Idebe ukpuru-Gi nile! Mb͕e ahu ihere agaghi-emem, Mb͕e m'nēlegide anya n'ebe ihe nile I nyere n'iwu di. M'gēwere obi ziri ezi kele Gi, Mb͕e m'mutara ikpé nile nke ezí omume-Gi. Ukpuru-Gi nile ka m'gēdebe: Arapusilam arapu. Gini ka okorọbia gēji me ka uzọ-ya di ọcha? Ọ bu n'ilezi ya anya dika okwu-Gi si di. Obim nile ka m'wereworo chọ Gi: Ekwela ka m'si n'ihe nile I nyere n'iwu jehie. N'obim ka m'zobeworo okwu-ọnu-Gi, Ka m'we ghara imehie megide Gi. Onye agọziri agọzi ka I bu, Jehova: Zím ukpuru-Gi nile. Eb͕ub͕ere-ọnum ka m'wereworo kọ akukọ Ikpé nile nke ọnu-Gi. N'uzọ ihe-àmà-Gi nile ka obi nātọm utọ, Dika ọ gātọm utọ bayere àkù nile. N'ihe-iriba-ama-Gi nile ka m'gātughari uche, M'gēlegide kwa uzọ-Gi nile anya. Ihe ukpuru-Gi nile gātọm utọ nke-uku: M'gaghi-echezọ okwu-Gi. Meso orù-Gi nke-ọma, ka m'we di ndu; M'gēdebe kwa okwu-Gi. Kpughepu anyam abua, ka m'we legide Oké ihe di iche iche si n'iwu-Gi puta. Ọbìa ka m'bu n'uwa: Ezonarilam ihe nile I nyere n'iwu. Nkpuru-obim etiwawo n'ihi ọchichọ O ji chọsie ikpé-Gi nile ike mb͕e nile. I basiworo ndi-nganga ndi abuworo ọnu nba ike, Ndi nēsi n'ihe nile I nyere n'iwu jehie. Wepu ita-uta na nleda n'arum; N'ihi na echebewom ihe-àmà-Gi nile. Ọzọ, ndi-isi nọduru ala kwurita okwu imegidem: Ma orù-Gi nātughari uche n'ukpuru-Gi nile. Ọzọ, ihe-àmà-Gi nile bu ihe nātọm utọ nke-uku, Ha bu ndi nādum ọdu. Nkpuru-obim nārapara n'ájá: Dika okwu-Gi si di, me ka m'di ndu. Akọrọm akukọ uzọm nile, I we zam: Gi zím ukpuru-Gi nile. Me ka m'ghọta uzọ nke ihe-iriba-ama-Gi nile: M'gātughari kwa uche n'oké ọlu-Gi nile. Nkpuru-obim atupuwo dika miri site n'iru-újú: Dika okwu-Gi si di, me ka m'guzosie ike. Wezuga uzọ okwu-ugha n'ebe m'nọ: Were kwa amara nyem iwu-Gi. Uzọ nke ikwesi-ntukwasi-obi ka m'rọputaworo: Ikpé-Gi nile ka m'doworo n'irum. Araparawom n'aru ihe-àmà-Gi nile: Jehova, emela ka ihere mem. N'uzọ nke ihe nile I nyere n'iwu ka m'gāb͕a ọsọ, N'ihi na I gēme ka obim sa mbara. Jehova, zím uzọ ukpuru-Gi nile: M'gēchebe kwa ya rue mb͕e ikpe-azu. Me ka m'ghọta ihe, m'gēchebe kwa iwu-Gi; M'gēwere kwa obim nile debe ya. Me ka m'zọ ije n'okporo-uzọ nke ihe nile I nyere n'iwu; N'ihi na uzọ ahu nātọm utọ Wezuga obim iche ihe-àmà-Gi nile iru, Ewezuga-kwa-la ya iche urù nēzighi ezi iru. Me ka anyam abua si n'ile ihe-efu gabiga, Me ka m'di ndu n'uzọ-Gi nile. Me ka okwu-ọnu-Gi guzosiere orù-Gi ike, Bú nke diri egwu-Gi. Me ka ita-utam nke m'nātu ujọ ya gabiga; N'ihi na ikpé-Gi nile di nma. Le, achọsiwom ihe-iriba-ama-Gi nile ike: N'ezi omume-Gi me ka m'di ndu. Ọzọ, kwe ka ebere-Gi nile biakutem, Jehova, Bú nzọputa-Gi, dika okwu-ọnu-Gi si di. M'gāza kwa onye nātam uta okwu; N'ihi na atukwasiwom okwu-Gi obi. Anapusi-kwa-la okwu nke ezi-okwu n'ọnum; N'ihi na ikpé-Gi nile ka m'chereworo. M'gēdebe kwa iwu-Gi mb͕e nile Rue mb͕e nile ebighi-ebi. M'gējeghari kwa n'ebe sara mbara; N'ihi na ihe-iriba-ama-Gi nile ka m'chọworo. M'gēkwu kwa okwu bayere ihe-àmà-Gi nile n'iru ndi-eze, Ihere agaghi-emekwam. Ihe nke ihe nile I nyere n'iwu gātọkwam utọ nke-uku, Bú nke m'huworo n'anya. M'gāchili-kwa-ra ihe nile I nyere n'iwu ọbu-akam, bú ihe nke m'huworo n'anya; M'gātughari kwa uche n'ukpuru-Gi nile.