Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Abụ Ọma 119:1-48

Abụ Ọma 119:1-48 BIU

Ndị a gọziri agọzi ka ha bụ, bụ ndị ụzọ ha na-enweghị ihe ịta ụta ọbụla, ndị na-ejegharị dịka iwu ONYENWE ANYị si dị. Ndị a gọziri agọzi ka ha bụ, bụ ndị na-edebe ụkpụrụ ya ma jirikwa obi ha niile na-achọsi ya ike. Ha adịghị eme ihe ọjọọ ọbụla; ha na-ejegharị nʼụzọ ya niile. I doola ụkpụrụ ndị a ga-erubekwara isi. Ọ ga-adị m mma ma ọ bụrụ na m anọgidesie ike na-erube isi nye iwu gị niile! Mgbe ahụ, ihere agaghị eme m mgbe m tulere uche nʼiwu gị niile. Aga m eji obi ziri ezi too gị dịka m na-amụ ihe banyere iwu gị ziri ezi. Aga m erubere iwu gị niile isi; biko ahapụkwala m. Olee ụzọ nwa okorobịa ga-esi bie ndụ dị nsọ? Ọ bụ site nʼibi ndụ dịka okwu gị si dị. Eji m obi m niile na-achọsi gị ike. Ekwela ka m kpafuo site nʼihe niile i nyere nʼiwu. Ezoola m okwu gị niile nʼobi m, igbochi m imehie imegide gị. Otuto dịrị gị, o ONYENWE ANYị; kuziere m iwu gị niile. Aga m eji egbugbere ọnụ m gụgharịa iwu niile nke si nʼọnụ gị. Ana m aṅụrị ọṅụ nʼịgbaso iwu gị niile dịka mmadụ si aṅụrị ọṅụ nʼime oke ịba ụba. Ana m atụgharị uche nʼụkpụrụ gị na-atulekwa uche nʼụzọ gị niile. Iwu gị na-amasị m; agaghị m elefu okwu gị anya. Meere ohu gị ihe ọma, ka m nwe ike dị ndụ; aga m erubere okwu gị isi. Kpughee anya m abụọ ka m hụ oke ihe ebube niile dị iche iche dị nʼime okwu gị. Abụ m onye ọbịa nʼelu ụwa; ezonarịla m iwu gị niile. Nʼoge niile, ihe banyere iwu gị niile na-agụ mkpụrụobi m agụụ. Ị na-abara ndị mpako mba, ha bụ ndị a bụrụ ọnụ na ndị na-anaghị agbaso iwu gị. Site nʼebe m nọ wepụ ịchị ọchị na nlelị, nʼihi na m na-edebe ụkpụrụ gị niile. Nʼagbanyeghị na ndịisi nọkọrọ na-ekwulu m, ohu gị ga-atụgharị uche nʼiwu gị. Ụkpụrụ gị niile bụ ihe na-amasị m; ha bụ ndị ndụmọdụ m. Mkpụrụobi m na-arapara nʼuzuzu; kpọghachite ndụ m dịka okwu gị si dị. Akọwaara m gị ụzọ m niile, ị zakwara m; ugbu a, kuziere m iwu gị. Mee ka m ghọta ozizi ụkpụrụ gị; ka m nwe ike tụgharịa uche nʼọrụ ebube gị niile. Iru ụjụ emeela ka mkpụrụobi m daa mba; gbaa m ume dịka okwu gị si dị. Chebe m pụọ nʼụzọ aghụghọ niile; site nʼiwu gị meere m amara. Ahọrọla m ụzọ ikwesi ntụkwasị obi; e kpebiela m idebe obi m nʼiwu gị niile. O ONYENWE ANYị, ana m ejigidesi iwu gị niile aka ike; ekwela ka ihere mee m. Aga m agbaso iwu gị niile nʼihi na i meela ka obi m nwere onwe ya. O ONYENWE ANYị, zi m ụzọ m ga-esi gbasoo iwu gị niile; mgbe ahụ, aga m edebe ha ruo nʼọgwụgwụ. Nye m nghọta, aga m edebe iwu gị ma jiri obi m niile rubere ya isi. Duo m nʼụzọ nke iwu gị niile, nʼihi na ọ bụ nʼime ha ka m na-achọta obi ụtọ. Mee ka obi m chee ihu nʼiwu gị niile ọ bụghị nye uru na-esite nʼọchịchọ nke onwe. Wepụ anya m site nʼihe na-abaghị uru; chebe ndụ m dịka okwu gị si dị. Mezuo nkwa i kwere ohu gị, ka a tụọ egwu gị. Wepụ nkọcha nke m na-atụ egwu ya, nʼihi na iwu gị niile ziri ezi. Ụkpụrụ gị na-agụsị m agụụ ike! Chebe ndụ m site nʼezi omume gị. O ONYENWE ANYị, ka ịhụnanya gị nke na-adịgide bịakwasị m, nzọpụta gị dịka nkwa i kwere si dị; mgbe ahụ, aga m azaghachi onye ahụ na-achị m ọchị, nʼihi na ana m atụkwasị obi m nʼokwu gị. Esitela nʼọnụ m napụ okwu nke eziokwu, nʼihi na olileanya m dị nʼiwu gị niile. Aga m anọgide na-erubere iwu gị isi ruo mgbe ebighị ebi. Aga m ejegharị nʼọnọdụ inwere onwe nʼihi na achọpụtala m ụkpụrụ gị niile. Aga m ekwupụta banyere ụkpụrụ gị nʼihu ndị eze ma ihere agaghị eme m, nʼihi na iwu gị na-amasị m nʼihi na ahụrụ m ha nʼanya. Ana m eweliri iwu gị niile aka elu, bụ ndị m hụrụ nʼanya, ana m atụgharịkwa uche nʼiwu gị niile.