ABÙ ỌMA 103:1-6
ABÙ ỌMA 103:1-6 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Mkpụrụobi m, too ONYENWE ANYị; ka ihe niile dị nʼime m too aha nsọ ya. Mkpụrụobi m, too ONYENWE ANYị; echefukwala mmeso ọma ya niile, ọ bụ ya na-agbaghara gị mmehie gị niile; na-agwọkwa gị ọrịa gị niile, onye na-agbapụta ndụ gị site nʼolulu werekwa ịhụnanya na ọmịiko kpukwasị gị dịka okpueze, onye na-eji ezi ihe na-emejupụta ọchịchọ gị niile, ka oge okorobịa gị bụrụ ihe a gbanwere dịka nke ugo. ONYENWE ANYị na-arụ ọrụ ezi omume, na-ekpe ikpe ziri ezi nye ndị a na-emegbu emegbu.
ABÙ ỌMA 103:1-6 Bible Nso (IGBOB)
Gọzie Jehova, nkpuru-obim; Ka ihe nile nke di nimem gọzi kwa aha nsọ Ya. Gọzie Jehova, nkpuru-obim, Echezọ-kwa-la nmeso ọma Ya O nēmeso gi: Bú Onye nāb͕aghara gi ajọ omume-gi nile; Onye nāgwọ ọria-gi nile; Onye nāb͕aputa ndu-gi n'aka nbibi; Onye nēkpube gi okpu-eze, bú ebere na obi-ebere di iche iche: Onye nēwere ezi ihe me ka afọ ju ọnu-gi; Idi-na-nwata-gi ewe me onwe-ya ka ọ di ọhu dika ugo. Jehova nēmere ndi nile anēmeb͕u Ezi omume nile na ihe nile O kpere n'ikpe.