Mkpụrụobi m, too ONYENWE ANYị; ka ihe niile dị nʼime m too aha nsọ ya. Mkpụrụobi m, too ONYENWE ANYị; echefukwala mmeso ọma ya niile, ọ bụ ya na-agbaghara gị mmehie gị niile; na-agwọkwa gị ọrịa gị niile, onye na-agbapụta ndụ gị site nʼolulu werekwa ịhụnanya na ọmịiko kpukwasị gị dịka okpueze, onye na-eji ezi ihe na-emejupụta ọchịchọ gị niile, ka oge okorobịa gị bụrụ ihe a gbanwere dịka nke ugo. ONYENWE ANYị na-arụ ọrụ ezi omume, na-ekpe ikpe ziri ezi nye ndị a na-emegbu emegbu.
Gụọ Abụ Ọma 103
Geere nke a ntị Abụ Ọma 103
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: Abụ Ọma 103:1-6
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị